Samuel Chukwueze: Gịnị ka ị ma maka onye a na-ekwu na ọ bụ 'ọkacha agba na Super Eagles ugbua'?

Samuel Chukwueze na-agbara Naịjirịa bọọlụ Image copyright Getty Images

A bịa n'ime otu Super Eagles na-achịpụ ya n'asọmpi Iko Mba Afrịka a na-agba n'Ijipt ugbua, Samuel Chimerenka Chukwueze so na ndị a kpụ n'ọnụ.

Nwaamadị a gbara afọ iri abụọ, so na ndị ọgba bọọlụ batara ọhụrụ ụkwụ na-aghọ ezi nkọ n'ịgba bọọlụ.

Super Eagles nke Naịjirịa nke Chukwueze so anọchite anya ha, abụghị ndị ikpeazụ dịka ha so ndị ogbo ha n'Afrịka n'ịnọchiteanya mba ha.

Onye bụ Samuel Chimerenka Chukwueze?

Image copyright Getty Images

Chukwueze bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Super Eagles nakwa otu egwuregwu Villarreal nke mba Spen bọọlụ.

A mụrụ Chukwueze n'ụbọchị iri abụọ na abụọ, afọ 1999, n'obodo Amaokwe, Ugba, Ibeku dị n'Ụmụahịa, Abịa Steeti .

Ọ tọrọ mmadụ abụọ (bụ ụmụnne ya), nwoke na nwaanyị.

Agụmakwụkwọ ya

Chukwueze gụrụ akwụkwọ na 'Government College' nakwa 'Evangel Sekọndịrị' dịcha n'Ụmụahịa.

Njem ịgba bọọlụ ya

Chukwueze malitere ịgba bọọlụ mgbe ọ dị naanị afọ asatọ. O ji Austin J.J Okocha bụ "ọgba ncha" mere onye nlekwasị anya ya.

O bu ụzọ gbaara otu egwuregwu "Future Hope" bọọlụ, mechaa gbaara ndị "New Generation Academy".

Dịka ọ na-agbagote n'afọ, Chukwueze banyere otu "Diamond Football Academy" tupu o soro ndị otu egwu Naịjirịa 'Golden Eaglets' nọ n'okpuru afọ 17.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Maka etu o si mee nke ọma n'asọmpi Iko Mbaụwa ndị nọ n'okpuru afọ 17 a gbara n'afọ 2015, otu egwuregwu Villarreal bịara zụrụ ya.

N'afọ 2018, Chukwueze malitere njem iso ndị Super Eagles nke Naịjirịa agba bọọlụ n'asọmpi enyi na enyi ha na ndị Yuganda.

N'ọnwa Mee afọ 2019, a kpọrọ ya oku iso gbaa asọmpi Iko Mba Afrịka nke na-aga n'ihu ugbua.

Etu o si agba bọọlụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Chukwueze bụ ọgba bọọlụ na-agba n'ebe etiti bụ 'Midfielder' na bekee.

Ụkwụ na-aghọ ya ezigbo nkọ n'ịgba bọọlụ.

Ọ bụ onye ama ama n'ịkpa oke ọkpụkpa na bọọlụ, nke mere ọtụtụ ndị ji atụnyere ya na Arjen Robben nke mba 'Netherland'.

Ihe nrite

Chukwueze so ndị 'Golden Eaglets' mabute Iko Mbaụwa ndị nọ n'okpuru afọ 17 a gbara n'afọ 2015, bụ ebe ọ bụ onye atọ na ndị kachasị nye goolu n'asọmpi ahụ.

N'afọ 2016, ọ turuugo dịka "ọgba bọọlụ kachasị gbapụta ihe" n'otu egwuregwu 'Diamond Football Academy'.

Ọ bụ ya ritere nturuugo "onye ọgba bọọlụ kachasị baa uru" n'asọmpi Iko MCL n'afọ 2016.

Samuel Chimerenka Chukwueze so na ndị a na-atụ anya ga-amụke ka kpakpando n'asọmpi AFCON nke afọ a.

Goolu o nyere n'asọmpị ndị Saụt Afịrịka na Naịjirịa mere ya onye atọchasịrị n'ime ndị nyere goolu n'Afcon nke 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a