Nigeria vs Madagascar: NFF ji anyị ụgwọ mana ọgaghị egbochi anyị ịnwa ike anyi - Ahmed Musa

Gernot Rohr na Ahmed Musa
Nkenke aha onyonyo Gernot Rohr na Ahmed Musa

Osote onyendu ndị otu bọọlụ Super Eagles bụ Ahmed Musa ekwuola na nlekọta egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ NFF ka ji ha ụgwọ asọmpị ha gbagoro agba.

Musa kwuru nke a taa na mkparịta ụka ha na ndị ntaakụkọ n'Alezandria, Ijipt.

Ndị Super Eagles ga-ezute mba Madagaska n'ụbọchị ụka bụ abalị iri atọ nke ọnwa Juun 2019.

Ha ji otu ọkpụ goolu merie mba Burundi nakwa Guinea mgbe ha zutere n'izu gara aga.

Image copyright Lars Baron - FIFA
Nkenke aha onyonyo Ahmed Musa

Musa kwuru na "ọjọgburu onwe ya na ndị nlekọta egwuregwu bọọlụ na Afrika ka na-eji ndị ọgba bọọlụ ụgwọ.

"O kwesịrị ka gọọmentị mba Afrika niile tinye aka iji kwụsị ụdị ihe ihere a.

"Mana nke a agaghị egbochi anyị ịnwa ike anyị iji buo Iko Mba Afrika nke afọ a."

Ndị Super Eagles chọbụrụ ịgba abụbụ ọrụ tupu asọmpị nke ha na Guinea n'ihi ụgwọ NFF ji ha, mana ha mechara kwụsị dịka onyendu ha bụ Mikel Obi rịọchara ha arịrịọ.

Musa gakwara n'ihu kwuo na ihe mere o ji dịka ndị Super Eagles a na-agba ọnyụpa bụ maka oke ekpomọkụ dị na Ijipt ugbua.

N'okwu nke ya, onye nlekọta ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr`sị na olileanya dị na ndị otu ya ga-eme ọfụma na asọmpi Afcon 2019.

Okwukwara na a ga-ahụ mgbanwe na ndị ga-eso n'egwu mgbe ha ga-ezute Madagaska echi.

Nkenke aha onyonyo Onye nlekọta otu egwu bọọlụ Madagaska bụ Nicolas Dupis na ọgba bọọlụ Ibrahim Amada

Onye nlekọta otu egwu bọọlụ ndị Madagaska bụ Nicholas Dupuis kwuru na ndị otu ya nwekwara ike ime ihe ga-atụ ndị mmadụ n'anya mgbe ha ga-ezutere Naijiria echi na-agbanyeghi na ndị mmadụ na-elelị ha anya.

Naijiria agafeelari n'agba nke abụọ nke asọmpi Afcon, mana ọdịkwa mkpa na ha ga-emeri echi iji tozuo oke dịka ndị mbụ na 'Group B'

Asọmpi Naijiria na Madagaska ga-ebiri ọkụ n'elekere ise nke mgbede echi.

BBC Igbo nọ chịm na mba Ijipt iwetara ụnụ etu ihe niile si aga.

Lee ka Eagles si akwado:

Akụkọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye ọja Gerald Eze