John Obi Mikel esuola ya kpọm! 'A laala m o'

John Mikel Obi Image copyright AFP/Getty Images

Ọgbabọọlụ a ma ama bụ John Mikel Nchekwube Obi edepụtala hooha na ya achịsala ọwa n'egwu bọọlụ Naijiria.

O buru ụzọ kwupụtara nke a na Tọọzde (18/7/2019) n'igwe okwu Instagram ya kerele otu egwu bọọlụ Naijiria maka inye ya ohere igosi nka ya na mba ụwa.

"Dịka m gbarala afọ iri atọ na-abụọ, oge eruola ila ezumike ịgbara otu egwu bọọlụ ala anyị ma nye ndị na-eto eto ndị kpara ike were nwetara ọla nchara n'asompi Afcon 2019 ohere iwere oche."

O kelekwara ụmụ Naijiria maka nkwado ha nyere ya.

John Mikel Obi, onye ndu otu Super Eagles nke Naịjirịa gwaburu BBC na Africa Cup Of Nations (AFCON) a bụ nke ikpeazụ ya.

O kwukwara na o nwereike ịbụ oge ikpeazụ ọ ga-agbara Naịjirịa bọọlụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mikel Obi malitere ịgba bọọlụ mgbe ọ dị afọ iri na abụọ na Pepsi Academy

"Afọ iri na atọ ezuola m, enwetela m nturuugo dị iche iche, oge eruola mgbe ndị ọzọ ga-eji gaa n'ihu" ka o kwuru.

Dịka ọ na-awụsa ọwa na Naịjiria, lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya.

Mikel Obi na ọrụ ya dịka ọgbaa bọọlụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mikel agbarala Naịjirịa bọọlụ afọ 13

Mikel Obi bụ onye Anambara steeti a mụrụ na Jọs malitere ịgba bọọlụ mgbe ọ dị afọ 12 na Pepsi Academy.

E mechara họrọ ya na Plateau United tupu o bido ịgbara Naịjirịa bọọlụ, site n'ịga asọmpi Fédération Internationale de Football Association (FIFA) nke U-17 na Fịnland.

Klọb mbụ ọ gbaara bọọlụ bụ Lyn Oslo dị na mba Norway; Manchester United na Chelsea mechara zọọ ya ụzọ oge ha chọrọ igo ya, nke gburu oge site na 2005 ruo 2006, mgbe Chelsea mezuru iwu ma zụrụ ya.

Ebe ndị ọzọ ọ gbara gụnyere Tianjin TEDA, Middlesborough na Trabzonspor (bụ ebe ọ nọ ugbua).

Obi bidoro ịgbara Super Eagles bọọlụ kemgbe afọ 2006.

Nturugo ndị oritere

  • Site n'ịgbara Naịjirịa n'asọmpi Iko Mbaụwa ndị ntoroọbịa nke 2005, o so rite nturugo ọlaọcha ma nwetakwa bọolụ ọlaọcha (nke onye abụọ kacha nye goolu n'asọmpi na-erite).
  • O nwetara nturuugo dịka "Ọkacha agba bọọlụ na-eto eto n'Afrịka" nke afọ 2005 na 2006.
  • O so Naịjirịa bulie Iko Mba Afrịka n'afọ 2013, ma sorokwa n'otu Confederation of African Football bụ Caf họpụtara bụ ndị kacha gbaa ọfụma n'asọmpi ahụ.
  • O nyere goolu mbụ ya n'Olimpiks nke afọ 2016 ma soro Naịjiria nwetakwa ọlanchara.

Ka ọ na-agbara Chelsea bọolụ, Obi ritere ọtụtụ nturuugo ma bulie ọtụtụ iko.

Ezinaụlọ Mikel Obi

Olga Diyachenko bụ aha enyi nwaanyị Mikel, mụrụ ụmụejima nwaanyị n'afọ 2015.

Dịka ọ dị ugbua a na-anụ kepu kepu na ha na-akwado ịlụ onwe ha.

Nwaada Diyachenko bụ onye mba Rọshịa.

Ihe ọzọ mere Mikel Obi

Image copyright Getty Images

N'afọ 2018, mgbe otu Super Eagles nọ na Rọshịa, akụkọ pụtara na a tọghapụla nna Mikel.

Mikel wee zite ozi na ha atọhapụla ya:

Ndị ntọ tọrọburu ya n'ụlọ ya na Jos ebe ọ na-elekọta ụlọọrụ ụgbọ njem ya.

Ndị ntọ ahụ nara ihe ruru nde dọla iri abụọ na anọ mana ndị uweojii gbapụtara ya.

Nna ya bụ Michael Obi ebe aha nne ya bụ Irosu Obi.

Cheta na a tọrọla Nna Mikel mbụ n'afọ 2011 mgbe ọ na-agbara Chelsea bọọlụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: