Community Shield: Man City ejirila Liverpool gbaa aka ahịa ụtụtụ

Ndị otu Man City na-aṅụrị Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Man City amabutela iko mbụ nke afọ egwuregwu bọọlụ 2019/2020.

Otu egwuregwu bọọlụ Manchester City egosila ihe ha jiri bụrụ ọkaibe dịka ha buliri iko "Community Shield" n'ụbọchị Sọnde.

"Community Shield" bụ asọmpi na-amalite afọ "premier League" ọhụrụ na mba England.

Raheem Sterling bidoro ebe ọ kwụsịrị n'afọ gara aga mgbe ọ gbakpuru otu goolu na nkeji iri na abụọ.

Mana Joel Matip sara goolu ahụ na nkeji iri asaa na asaa nke mere ka egwu baa na penariti.

Ochee goolu ndị Man City bụ Claudio Bravo chere penariti nke Georginio Wijnaldum gbara ebe Gabriel Jesus gbakpuru penariti nke nyere Man City mmeri.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Anya niile nọ n'ebe Mohammed Sala nọ mana ike niile ọ kpara enweghị nke mịtara mkpuru.

Cheta na ọbụ Man City tuuru ugo na asọmpi "Premier League nke afọ gara aga, ebe Liverpool mabutere iko "Uefa Champions League".

Afọ ọhụrụ nke egwuregwu bọọlụ nke mba England ga-ebido n'izuuka na-abịa abịa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCoach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ