Liverpool vs Chelsea: Liverpool amaburula iko 'Uefa Super 2019'

Liverpool Image copyright Getty Images

Iko Uefa Super Cup mere Chelsea ọ nọ nso erughi aka dịka Liverpool ji penariri ọkpụ goolu ise asatara anọ merie ha.

Asọmpi a bụ ezigbo ọgụ na mgba dị n'etiti dike Ịngland abụọ dịka onweghi onye ọ dịrị mfe.

Mgbe egwu a biri ọkụ, Liverpool n'atufughi oge malitere ịkwanye Chelsea ọkụ n'ike mana Chelsea kwechiiri.

N'ihe dịka nkeji 15, Chelsea bịara dịka ndị a gbapere ụzọ mgbe ha malitere na-acha Liverpool ọkụ dị egwu.

Image copyright Getty Images

Oke ịcha ọkụ a mịtaara Chelsea mkpụrụ nke mere Olivier Giroud ji nye goolu na nkeji 36 iji gbapee ọnụụzọ goolu.

Chelsea nyekwara goolu ọzọ site n'aka Christain Pulisic mana nwaanyị ogbu bọọlụ bụ Stephanie Frappart (France) gụpụrụ ya, kwuo na ọ bụ 'offside'.

Image copyright Getty Images

N'ime nkeji 48, mgba ọkara abụọ malitere Sadio Mane nyeere Liverpool goolu ha, iji mee ya otu ọkpụ otu ọkpụ.

Otu egwuregwu abụọ ndị a kwechiri sị na o nweghi onye ka enye ibe ya goolu n'ọtụtụ oge n'ime asọmpi ha.

Chelsea nyetakwara goolu ọzọ na nkeji 83 mana ndị ogbu bọọlụ sị na ọ bụ 'offside' nke mere ha ji gụpụ ya.

Otu abụọ ndị a fooro ntụtụ taa rue mgbe nkeji 90 gachara, ma banye mgbakwụnye oge (Extra time).

Image copyright Getty Images

N'ime mgbakwụnye oge ahụ na nkeji 95, Sadio Mane nyeere Liverpool goolu, ebe Jorginho ji penariti nye nke ndị Chelsea na nkeji 101.

N'ikpeazụ, onweghi onye meriri ibe ya na mgbakwụnye oge n'asọmpi a dịka ha nyere oner ha ọkpụ abụọ abụọ.

Mana Liverpool ji penariti ọkpụ goolu ise asatara anọ merie Chelsea ma buru iko 'Uefa Super Cup 2019'

Akụkọ ga-amasị gị: