Wolves vs Man United: Di na nwunye a ekpeela udo n’alụmdinanwunye ha

Ndị Man Utd gbakọrọ Image copyright AFP

Mbọ niile otu Manchester United gbara ịhụ na ha gbara Wolverhampton alụkwaghịm biri na 'onye lawa onye lawa'.

Man Utd bu ụzọ jaa eze dịka Anthony Martial dọriri neetị na nkeji 27.

Mana Ruben Neves nke Wolves sị ha "taa kpuchie ọnụ" ka ọ sara goolu ha na nkeji 55.

Goolu ahụ bu ọbara mgbalielu nke ya bịa dịka ogbuopi kwụsịrị bọọlụ ka e were ihe onyonyo Video assistant referee (VAR) nyochaa ma ọ gara ọfụma.

Man Utd nwetara ohere ifere di ha aka na nkeji 67 oge ha nwetara penariti ka Conor Coady gbaturu ya.

Mana Paul Pogba riwara ha obi ka Rui Patricio kwapụrụ bọọlụ.

Image copyright PA Media
Nkenke aha onyonyo Nke a mere ya penariti nke anọ Paul Pogba na-eri na Premier League kemgbe afọ bọọlụ gara aga malitere

Raul Jimenez so "kwụọ ụgwọisi" Man Utd n'afọ gara aga, nwakwara ike ya ọkachasị n'ọkara nke abụọ, mana isi ya apụtaghị.

Mbọ niile Man Utd gbara iji gbapụta onwe ha ma zaa aha nna ha enweghi isi, n'agbanyeghi na ha gbara ọfụma n'ụzọ gaara enwetara ha mmeri.

N'otu aka ahụ, nwebata Wolves webatara Adama Traore n'ọkara nke abụọ nyerela ha aka ime ka egwu dagharịa, nke butere goolu ha mechara nye.

Man Utd ga-ezute Crystal Palace ụbọchị satọde bụ 24 nke ọnwa Ọgọstụ, ebe Wolves ga-ezute Burnley ụbọchị Sọnde bụ 25.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCoach Supremo: Onye chọpụtara Jay Jay Okocha na ndị ọzọ