Ifeanyi Chiejine: Ihe asaa i kwesiri ịma maka ada Igbo lara mmụọ

Chiejine Image copyright Twitter/NFF

Akụkọ si n'ọnụ otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Nigerian Football Federation (NFF) pụta, kwuru na Ifeanyichukwu Chiejine nwụrụ ka ọ rịachara obere ọrịa.

Chiejine, onye gbabuuru otu Super Falcons bọọlụ, nwụrụ n'abalị 21 nke ọnwa Ọgọstụ 2019, ka ọ gbachara afọ 36.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Chiejine gbara n'asọmpi Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị atọ, Olimpiks abụọ ma butekwa Iko Mba Afrịka anọ

Ndị NFF ndị depụtara nke a n'elu Twitter, kwupụtara mwute ha iji kwanyere ya ugwu n'ọnwụ.

Ihe i kwesịrị ịma maka Ifeanyi:

  • A mụrụ Ifeanyichukwu Stephanie Chiejine n'ụbọchị 17 nke ọnwa Mee 1983, n'Asaba dị na Delta steeti
  • Ọ bụ onye kacha pee mpe n'afọ mgbe o so Super Falcons nke Naịjirịa gaa asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 1999; ọ dị afọ 16 na otu ọnwa mgbe ahụ
  • Ọ gbaara Naịjirịa bọọlụ n'Olimpiks nke afọ 2000 na 2008
  • O so Super Falcons bulie Iko Mba Afrịka ugboro anọ
  • Ọ gbaara Super Falcons site n'afọ 1999 ruo 2008, ma nye goolu 18 n'ime ugboro 68 ọ gbaara Naịjirịa
  • Ọ gbabuuru ndị Flying Babes FC, FCT Queens nke Abuja nakwa Pelican Stars nke Kalaba.
  • Ọ gbara bọọlụ na mba Rọshịa, Amerịka, Fịnlandị na Kazakhstan, ebe o si na-akpata ego

Ihe ndị mmadụ kwuru maka ọnwụ ya:

Rachael Ayegba bụ onye otu ya oge ọ na-agba bọolụ, gwara BBC Sport na "Ọnwụ ya na-ewute anyị nke ukwu.

"O kwutere okwu ọrịa ya ebe ụfọdụ n'ime anyị nọ, mana ọ gwaghị anyị ihe na-arịa ya."

"Chiejine nwukere ka kpakpando oge ọ na-agba bọọlụ, mana ọ nwụrụ etu ahụ. Anyị kwesịrị ịgba mbọ tinye anya ebe ndị na-agba bọọlụ ugbua na ndị nke gbauru agba, nọ."

Otu ụmụnwaanyị FIFA gosikwara mwute ha.

@oluwashina dere maka ihe niile o mere n'ụwa egwuregwu:

@mreds kwuru etu ọnwụ ya si gbawaa ya obi

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCoach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ