Liverpool vs Arsenal: A gwọọla Arsenal ka abacha e tinyere ose Nsukka

Nicolas Pepe Image copyright Getty Images

Mmeri a Liverpool ji ọkpụ goolu atọ asatara otu meriri Arsenal bụ nke a na-akpo 'O tiri nwata ihe n'ihu nne ya'.

Liverpoola malitere iti Arsenal mmọnwụ na nkeji 41, mgbe Joel Matip nyeere ha goolu.

Dịka nke a gachara, Mohamed Salah ji penariti deba aha ya n'ime akwụkwọ ndị nyere goolu na 49, iji mee ya nke abụọ ndị Liverpool.

N'ime ọkara nke mbụ asọmpi a, a ga-asị na Arsenal enweteghi onwe ha, dịka Liverpool kechiri ha tọgbọọ.

Na nkeji 58 dị n'ime ọkara abụọ, Mohamed Salah gosiri Arsenal na "onye a na-akpọ aha, nwere nke ọ na-eme" site n'inye goolu ọzọ.

Arsenal nwara ike ma nyeta otu goolu nkasị obi na nkeji 85 nke si n'aka Lucas Torreira nke mere ya ọkpụ goolu atọ asatara otu.

Agbanyeghi na e meriri Arsenal, n'ikpeazụ Nicolas Pepe woro Virgil van Dijk mpio nke mere ya mbụ n'ime asọmpi 50 ọ gbarala na Premier League.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: