Wolves vs Chelsea: Chelsea emechiela nkịta ọhịa na-alụ Man Utd ọnụ n'ike

Abraham onye otu Chelsea nyere goolu atọ Image copyright Getty Images

Ụbọchị taa abụghị ụbochị ọma nye ndị Wolves dịka ndị Chelsea jiri goolu saa ha ahụ.

Ụmụ Naijiria abụọ bụ Tammy Abraham na Fikayo Tomori gbachara aka ahịa ka goolu nọ na-arị ibe ya elu n'egwuregwu a.

Tomori tikpuru goolu na nkeji 31 ebe Abraham nyere goolu atọ ya na nkeji 34, 41 na 55 tupu ọ gbakpuo nke o ji gbaara ndị Wolves aka ahịa na nkeji 69.

Patrick Cutrone tụkwasịrị ọzọ iji nye ndị Wolves olileanya na nkeji 84, tupu Mason Mount abịa kụchie akpati ndị Wolves na nkeji 90 na ụma e ji egbuchi bọọlụ.

Ndị Chelsea gosiri ndị Wolves na ha enweghị nsọpụrụ, dịka ha ji goolu niile a (goolu ise a satara naanị abụọ) gaa leta Wolves n'ụbọchị ncheta afọ 130 e ji rụọ ọgbọegwuregwu ha bụ Molineux.

N'agbanyeghị na ndị Chelsea emeriela naanị otu asọmpi n'ime anọ ha gbarala, ha eleghị anya n'azụ were jiri goolu zuo ndị Wolves ahụ.

Ajụjụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ na "ọ bụ ụmụaka abụọ a bụ Tammy Abraham na Mason Mount nọchiri anya Didier Drogba na Frank Lampard?"

Image copyright Getty Images

Nke a bụ maka na ụmụokorobia a na-arụkọ ka ndị zoro ezo na-ere ala nna ha.

Tammy Abraham zara aha ya dịka "nna ụwa niile", ka o nyekọrọ goolu atọ n'ime otu egwuregwu nke Bekee kpọrọ "Hattrick".

Kama o tikpukwara otu goolu na neetị ndị nke ya, mana ọ dị ka ndị nkwado Chelsea ga-agbaghara ya maka nke a.

Abraham abụrụla onye kacha bụrụ nwata nyere goolu atọ n'otu asọmpi na Premiership.

Chelsea gosiri na nkata ha na-ehi ehi n'agbanyeghị na ha nyere goolu ise, ebe ndị Wolves gakwara n'ihu jisiike sata goolu abụọ.

N'aka nke ọzọ, ka ndị otu egwu bọọlụ Manchester United gbara nke ha, ha jiri otu ọkpụ goolu were merie ndị nke Leicester City bụ ebe.

Mana ka ọ dị ugbua, anyi amarala mbe na-abọ nke bụ oke.

Akụkọ ga-amasi gị

Isiokwu Ndị Emetụtara