Manchester United vs Liverpool: Man Utd ahụla Liverpool teta n'ụra ọnwụ

Ndị bọọlụ Image copyright Reuters

Liverpool tiwara ndị ji ha hibe isi maka imeri Manchester United obi taa, ka ha gazịrị bụrụ ndị na-asa goolu.

Ọtụtụ ndị gụnyere ma ndị na-akwado Man Utd, chere na ha ga-eji goolu gbajuo ndị Man Utd afọ maka etu ahụ si ama ha ririri na bọọlụ kemgbe izu ole na ole gara aga.

Mana ha bịara "teta n'ụra" n'azụ ụlọ ha na Old Trafford, wee sị ndị Liverpool "ọ bụghị taa!" ka egwuregwu mechara bie n'otu goolu otu goolu.

Adam Lallana nke Liverpool ji ibu kara aka gbakaa neetị David De Gea na nkeji 85 na-erughi nkeji ise e webatara ya na bọọlụ, iji sata otu goolu Man Utd nyere ha n'ọkara nke mbụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Lallana batara n'ọkara nke abụọ gbaa aka ahịa na-emeghị eme

Marcus Rashford bu ụzọ bie Alisson "stamp" ka ọ gbakara neetị ya na nkeji 36 e ji bido bọọlụ.

Maka etu goolu a si gaa, e mechara were ihe nkiri Video Assistant Refree (VAR) ji nyochaa ya, iji mara ma ọ dabara.

Ka ọ dị ugbua, Man Utd esila n'ogogo 14 rigoro nke 13 na tebulu, ebe Liverpool ka nọkwa bụrụ ndị a na-emeribeghi kemgbe Premier League nke afọ a bidoro.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu:

@Kheeng_jay na-ama ndị Man Utd njakịrị sị na ha si ebe ha zoro maka ụjọ mmeri na-arịpụta.

@UgwunnaEjikem sị na ọ dị ka ike adịghị ndị Liverpool ịzọ ọkwa mbụ na Premier League nke afọ a, maka etu ha si atufu pọịntị.

@ivanmerlo21 tinyere ihe na-egosi etu obi si dị ndị Man Utd pọlịna pọlịna oge Rashford nyere goolu ya.

@AJno9 kwuru na ọ bụ ogbuopi ka e kwesịrị inye "ọkacha gbaa n'egwuregwu a".

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionSports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa