Europa League fixtures: Chi Pepe azọọla ndị Arsenal na ndagwurugwu ọnwụ

Nicolas Pepe Image copyright AFP

Nicolas Pepe bụ onye ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ọjọo maka ihe ọ gbara na Premier League oge Arsenal zutere Sheffield United na ngwụcha izu a, abụrụla onye zọrọ ha.

Goolu abụọ o nyere na nkeji 80 na 90, mere ka ọnwụ niile ndị Vitoria de Guimaraes na-eshi dị ka ebe e ji mmiri oyi wụnyụọ ọkụ.

Marcus Edwards nke Vitoria de Guimaraes bu ụzọ sekpuwe Arsenal ala ka ha gbanyere goolu na nkeji asatọ e ji malite egwuregwu a n'ọgbọegwuregwu Emirates.

Tupu Gabriel Martinelli asatara ndị Arsenal nke ha na nkeji 32 iji wepụ ha ihere n'ihu.

Mana na-emeghị eme, Bruno Duarte gbakanyekwara goolu ọzọ na nkeji 36, iji gosi Arsenal na ha abụghịkwa mmọnwụ a na-akwa aka.

Image copyright Getty Images

Ọtụtụ ndị che na nke Arsenal na-eme agwụla oge e ruwere nkeji 80 mana ha asatabeghi goolu, mana Pepe e webatara n'ime nkeji 75 bịara zaa aha nna ya ma gbaa aka ahịa n'ime nkeji ahụ.

Ka ọ dị ugbua, Arsenal ga-ezutekwa Vitoria n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba, mana ọ ga-abụ na be ha nke ugbua.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara