Golden Eaglets na nnụnụ ndị ọzọ feterela Naịjirịa ntụrụugo na bọọlụ

  • Chimamaka Ihenacho
  • Broadcast Journalist, Igbo
Ndị egwu Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

N'ihi na egwuregwu bọọlụ so n'otu ihe na-ejikọ ndị agbụrụ Naịjirịa niile, ọ pụtara na njikọ ahụ na-akacha mma mgbe ihe nrite so ya.

A bịa n'ihe gbasara egwuregwu, ndị Naịjiria anaghị eji ya achị, nke bụ na e nwere ike too gị ka dike taa, mana echi ị bụrụ 'onye chi ọjọọ' nye ha, ọkachasị ma a hụta na ị metara ihe e ji gbapụ Naịjirịa n'asọmpi.

Mana n'ime ihe niile, enweghị ihe na-atọ ndị Naịjirịa ụtọ dịka mmeri, ọkachasị mgbe ọ bụ na mba.

Ngwa lee ka ịhụ etu BBC Igbo si chịkọta otu egwuregwu bọolụ Naịjirịa ndị kacharala bulie iko asọmpi, ole ha nweterela na mgbe ha nwetara ha.

Ndị Golden Eaglets

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Otu Golden Eaglets bụ mba kacharala bulie Iko Mbaụwa nke ndị U-17

A bịa na Naịjirịa, ndị a ma dịka "Golden Eaglets" bụ ndị ọgbabọọlụ na-akarịghị afọ 17, bụ ndị kacharala metụ iko asọmpi bọọlụ aka.

Ha ebuliela iko ugboro asatọ (8); gụnyere iko mbaụwa ise (5), iko mba Afrịka abụọ (2) nakwa otu iko UEFA-CAF Meridian (1) bụ nke ha buliri n'afọ 1997.

Ha buliri nke mbaụwa n'afọ 1985, 1993, 2007, 2013 na 2015.

Ha buliri nke mpaghara Afrịka n'afọ 2001 na 2007.

Ndị Dream Team

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Naịjirịa nwetara nturuugo ọlaedo n'egwuregwu n'afọ 1996

Ndị "Dream Team" bụ ndị na-akarịghị afọ 23 (a na-enye ohere ịkpọ mmadụ atọ karịrị afọ 23), ma bụrụkwa otu Naịjirịa na-akpọ aga asọmpi Olimpiks.

Dream Team ritere ọlaedo n'afọ 1996, ọlaọcha n'afọ 2008, ma rite ọlanchara n'afọ 2016.

Nke a mere ka Naịjirịa bụrụ mba mbụ si mpaghara Afrịka nweterela ọla atọ a na-enye n'asọmpi bọọlụ nke Olimpiks.

Ha mabutekwara iko mpaghara Afrịka n'afọ 2015.

Ndị Super Falcons

Ebe foto si, Twitter/@NGSuper_Falcons

Nkọwa foto,

Super Falcons egosila mpaghara Afrịka ugboro ugboro na ha bụ dike n'egwuregwu bọọlụ

Ndị Super Falcons so na ndị kacha etinye ọchị n'ọnụ ndị Naịjirịa ma a bịa n'egwuregwu.

Ha amaburula Iko mpaghara Afrịka ugboro itoolu (9) kemgbe ha malitere isonye n'asọmpi a.

Ha buliri Iko Mpaghara Afrịka n'afọ 1991, 1995 mgbe ọ ka bụ asọmpi egwuregwu ụmụnwaanyị Afrịka nke CAF (CAF African Women's Championship).

Mgbe a malitere ịkpọ ya Africa Women Cup Of Nations (AWCON) ha buliri iko a n'afọ 1998, 2000, 2002, 2004, 2006, 2010, 2014, 2016 nakwa 2018.

Ha ebulikwaala iko WAFU Zone B n'afọ 2019.

Ha enwetakwala ọlaedo n'asọmpi All Afrịca Games ugboro abụọ, 2003 na 2007.

Ndị Super Eagles

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ikpeazụ Naịjirịa buliri iko mba Afrịka bụ n'afọ 2013

A bịa n'egwuregwu na Naịjirịa, ọ na-adị ka ọ bụ nke ndị Super Eagles na-akacha amasị ndị Naịjirịa itinye anya ma na-esokwa.

Ya bụ nke na-akacha ewu, makana ọ bụ ha bụ nke onye ọbụla ga-esonyenwu n'agbanyeghị afọ ole ọbụla ị dị; nke bụ na ị ga-enwe ohere ịhụ ndị ị na-akwado n'egwuregwu nke klọb.

Super Eagles ebuola Iko mpaghara Afrịka ugboro atọ; n'afọ 1980, 1994 nakwa 2013.

Ha ebulikwaala Iko nke a na-akpọ "WAFU Nations Cup" bụ maka mba ndị si mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka n'afọ 2010.

Ndị Flying Eagles

Ebe foto si, Getty Images

Flying Eagles bụ ndị nke na-akarịghị afọ 20 na-agbara Naịjirịa bọọlụ.

Ha ebuliele iko mba Afrịka ugboro asaa; n'afọ 1980, 1985, 1989, 2005, 2011 nakwa 2015.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ