Liverpool vs Arsenal: E meela Arsenal ọnọ nso eru aka

Ndị Arsenal Image copyright Getty Images

N'agbanyeghị na egwuregwu nke taa dị ka ebe e butere nkata na-atụju ya goolu, e mechara gbapụ otu onye.

Makana asọmpi Iko Carabao bụ nke a na-agbapụ mmadụ, e mechara ruo na gbaa ka anyị laa, nke e ji penariti mee.

Hector Bellerin, Matteo Guendouzi, Gabriel Martinelli na Ainsley Maitland-Niles gbakpuchara nke ha, ebe Daniel Ceballos riri goolu kpọlara Arsenal.

Image copyright PA Media

James Milner, Adam Lallana, Rhian Brewster na Curtis Jones gbakpuchara nke ha, mere ka Liverpool nweta mmeri.

Nchịkọta goolu iri banyere na mpio ndị na-eche goolu n'ime nkeji 90 e ji agba bọolụ, dịka otu Arsenal na Liverpool kụkọtara isi n'ọgbọegwuregwu ndị Liverpool.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ceballos gbara penariti nke anọ mana ọ gbafuru ya

Shkodran Mustafi nke Arsenal bu ụzọ gbanye goolu n'azụ neetị na nkeji isii e ji bido bọọlụ, iji kotere ndị otu ha okwu.

Mana Lucas Torreira bịara zọpụta ha site n'inyere Arsenal goolu na nkeji 19.

Ka nke a mechara, goolu bịara malite izo ka mmiri mgbe Gabriel Martinelli tụkwasịrị goolu abụọ ọzọ na nkeji 26 na 36, mere ka Arsenal jiri 3-1 na-emeri.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Joe Willock nyerela Arsenal goolu nke ise

N'ime nkeji 43, James Milner nke Liverpool ji penariti dọkaa neetị, tupu Arsenal esi n'aka Ainsley Maitland-Niles mezuo ya anọ.

Alex Oxlade-Chamberlain gbabuuru Arsenal bọọlụ bịara gbaa ezigbo bọọlụ gafere ochee goolu sụkpuo na neetị na nkeji 58, mere ka Liverpool nwee goolu atọ.

Na-emeghị eme, Divock Origi tụkwasịkwara ya ọzọ iji mezuo ya goolu anọ na nkeji 62.

Image copyright Getty Images

Joseph Willock bịazịrị nye ndị Arsenal olileanya mmeri mgbe ọ gbakpuru goolu nke ise ha na nkeji 70.

Mana Origi mezuru ya ise na nkeji 90, mere ka Arsenal na Liverpool hara tupu e gbuchie bọọlụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionSports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa

Isiokwu Ndị Emetụtara