Leicester City vs Arsenal: Leicester City ewerela egbe ndị Arsenal gbawaa ha isi

Ndị Arsenal Image copyright Getty Images

Ndị otu egwu bọọlụ Leicester City ji egbe ndị Arsenal wee gbawaa ha isi n'asọmpị 'English Premier League' nke taa.

Ọkpụ goolu abụọ chara acha ka ha ji wee dulaa ha mmụọ.

Jamie Vardy gosiri na ike agwụbeghị ya chaa mgbe o nyere goolu nke mbụ na nkeji 68.

James Maddison gbakpukwara goolu nke abụọ na nkeji 75.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Wilfred Ndidi na Mesut Ozil

Arsenal enwetaghị onwe ha chaa chaa na ya bụ Asọmpi.

Nwaafọ Igbo bụ Wilfred Ndidi ekweghị Mesut Ozil megharịa ahụ

Mmeri a mere ka Leicester gbagorokwa na ndị nke abụọ na tebulu EPL.

Arsenal n'onwe ha bụ ndị nke isii.

Akara iri na atọ ka Liverpool ji agafe Arsenal ugbua.

N'asọmpi ndị ọzọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Tammy Abraham nyetaara Chelsea goolu.

N'egwuregwu ndị ọzọ, Chelsea pịawara Crystal Palace azụ mgbe ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie ha.

Nwaafọ Naịjịrịa bụ Tammy Abraham na Christian Pulisic bụ ndị nyeere ha goolu.

Everton bụ ebe nwaafọ Igbo bụ Alex Iwobi nọ, meriri ndị Southampton 2-1.

Newcastle merikwara Bournemouth 2-1, ebe Tottenham na Sheffield United nyere onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe dị iche n'etiti akpụ Ghana na nke Nigeria