Robert Mugabe: Olee etu a ga-esi eke akụ Mugabe hapụrụ tupu ọ nwụọ?

Robert Mugabe na Grace nwunye ya Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Mugabe ji afọ iri anọ na otu wee tọ nwunye ya bụ Grace

Akụkọ si mba Zimbabwe na-ekwu na aka chịburu mba ahụ bụ Robert Mugabe hapụrụ ihe ruru nde dọla iri n'ụlọakụ tupu ọ nwụọ.

Mugabe nwụrụ n'ọnwa Septemba afọ 2019 mana o keghị ekpe tupu ọ laa mmụọ.

Ụlọọrụ ntaakụkọ dị na Harare, isi obodo Zimbabwe kwuru na okwu gbasara etu a ga-esi kee akụnụba Mugabe apụọla n'ụlọ ikpe.

Nwa ya nwanyị bụ Bona Chikowore degaara ụlọikpe ukwu obodo ahụ akwụkwọ iji kọwaara ha ihe ndị nna ya nwere.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRobert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya

Ha gụnyere nde dọla iri ($10m), ụlọ anọ nke dị na Harare nakwa n'obodo ya, ala ubi abụọ na ụgbọala iri.

Mugabe nwere otu nwunye (Grace) na ụmụ anọ bụ ndị ga-eketa akụnụba ya dịka iwu Zimbabwe si dị.

Ya bu odogwu Afrịka chịrị Zimbabwe bido afọ 1980 ruo afọ 2017.

Anwuchiela nwoke kpọrọ ụlọọrụ ugboro 24,000 n'Japan

Nkenke aha onyonyo Okamoto sị na o bu ọnodụ ya tinyere ya n'ụdịrị agwa a

Otu nwoke na Japan bụ Akitoshi OKamoto abanyela n'aka ndị uweojii maka iji oku ekwenti tinye otu ụloọrụ bụ KDDI na gbagharịa.

Okamoto kpọro ha ụgboro pukku iri abụọ na anọ iji gosipụta iwe ya maka na ekwe ntị ya enweghịzị ike ikpọ oku.

Nkea mere ka ojiri ekwenti ọha kpọwa ndị ụlọọrụ a na-enye ya ikike ikpo ọku ekwenti igosipụta iwe ya.

Ufodu ụlo mgbasa ozi n'akowa na nwoke kporo ya bụ ụlọrụ karịa ugboro pukku iri abụo na anọ.

Okamoto sị na o chọro ka ndị ụloorụ KDDI bia rịo ya mgbaghara maka ị dau iwu na nkwekọrịta azụmahia ha banyere n'ime ya.

Ndị ụloorụ KDDI kwuru na ha anaghị akpọpụ ndị ahị ha ụloikpe mana nke Okamoto tinyere ya aja na garri n'ihi na ha enweghị ike iza ndị ahia ha ndi ọzọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤfọdụ oge, ndị mmadụ na-aga ahịa maka na ndị na-ere n'intanetị na-etinye ego karịa

Ụlọikpe Japan nwere ike ima Okamoto ikpe ma ha kpee ya ikpe maka ida iwu ha kpọrọ " Obstruction of Business" n'okwu bekkee.

Kama Okamoto gwara ndị uweojii na o bụ ọnodụ ya tinyere ya na udiri agwa a.

Ndị DSS

Image copyright Ola Onemola
Nkenke aha onyonyo Ndị DSS Naịjirịa

Ndi uweojii nzuzo Naijirịa a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ ekwupụtala na ha achọpụta atụmatụ nzuzo ụfodụ ndi mmadị choro iji weta ọgbaaghara n'ime izuụka ndị na-abịa.

Ha kọwara na ha di njikere iru ọrụ nchekwa ha ma rịọ ndị mmadụ ka ha hapụ itu ụjọ.

Akwadoro m mgbachi oke ala - Gọvanọ Dave Umahi

Governor Dave Umahi nke Ebonyi steeti ekwuola na ya dọnyere goomenti ukwu maka mgbachị oke ala ha gbachịri.

O kwuru na nke a ga-akwụsi ndị omekome ibubata ọtapịapịa sị na ọ bụ osikapa.

Gịnị mere Ronaldo abịaghị mmemme Ballon d'Or?

Image copyright AFP/Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ronaldo ritere ntuurugo abụọ na emume ọkaibe bọọlụ na mba Itali ụnyaahụ

Na nturuugo ọkaibe nke egwuregwu bọọlụ bụ Ballon d'Or nke onye egwu Barcelona bụ Lionel Messi buuru, atụrụ anya na ndị niile aha ha pụtara na ya bụ nturuugo ga-abịa.

N'ime aha mmadụ iri atọ na asatọ pụtara na ya bụ emume, Cristiano Ronaldo abịaghị.

Ronaldo ritere ọkwa onye nke atọ na mmemme ahụ mana ọtụghị ọkpa ya ebe ahụ.

Gịnị mere?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nke a bụ nke ugboro isii Lionel Messi na-eturu ugo Ballon d'Or

Ronaldo akọwabeghị ihe mere na ọ gaghị, mana ihe ndị a bụ ihe anyị na-eche mere ya.

  • Nke mbụ bụ na ọbụ n'otu abalị ahụ ka emekwara emume ọkaibe n'egwu bọọlụ nke mba Itali nke Ronaldo na onwe ya ritere uturuugo abụọ.
  • Kepukepu a nụbụrụ tupu ya bụ ememe na-egosi na Messi ji ọgụ iri isii na anọ e mere ya bụ ịmaaka.
  • Nke ọzọ bụ na Ronaldo nwere ike iche na ya agaghị enwete nturuugo Ballon d'Or nke afọ dịka o sighi nweta nke FIFA.

Nke a bụ ugboro isii Messi na-eturu ya bụ ugo ebe Ronaldo nwetagoro ya ugboro ise.

Ha abụọ na-achụ onwe ha n'azụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Messi bụkwa ọkaibe na bọọlụ nke otu FIFA mere na Septemba

Chetakwa na Ronaldo agaghịkwa emeume nturuugo ọkaibe nke Fifa e mere n'ọnaa Septemba 2019.

Messi bụkwa onye meriri na nke ahụ.

'Fuel' agaghị akọ n'oge ekeresimesi a

Nkenke aha onyonyo N'oge gara aga, a na-enwekarị ụkọ mmanụ ụgbọala ma ekeresimesi rutewe nso

Gọọmentị etiti ekwuola ka ụjọ ghara ịtụ ndị mmadụ maka ụkọ mmanụ ụgbọala n'oge ekeresimesi.

Ọbụ onyeisi ụlọọrụ Nigeria National Petroleum Corporation (NNPC) Mele Kyari, kwuru nke a n'ọgbakọ e nwere n'Aso Rock ụbọchị Monde.

Kyari kọwara na ha nwere mmanụ ụgbọala ga-ezuru onye ọbụla ganye na emechaa emume ekeresimesi nakwa afọ ọhụrụ.

N'otu aka ahụ kwa, Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Babatunde Fashola, kwuru na a malitela ọrụ n'okporo ụzọ dịgasị icheiche iji mee ka njem ekeresimesi dịrị ndị mmadụ mfe.

Onye uweojii agbagbuola 'driver' n'Akure

Image copyright Getty/AFP

Akụkọ si Akure, Ondo State bịa kwuru na otu onyeuweojii gbagburu onye ọkwọ ụgbọala n'Akure, Ondo Steeti n'ụbọchị Monde.

Dịka akụkọ a si kwuo, ọbụ ebe ha na agbagha maka Naịra iri ise ka ya bụ ihe mere.

Mgbe ndị ntaakụkọ kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndịuweojii na steeti ahụ bụ Femi Joseph, o kwetara na ya bụ ihe mere eme n'ezie.

Mana ọ kwuru na ihe ahụ dị mwute nke ukwuu n'ihi na ọbụghị otu a ka ndị uweojii niile si eme.

Mahadum Daura

Rotimi Amaechi, Mịnịsta na-ahụ maka njem, ekwuola na onweghị ihe ọjọọ dị na ịrụ Mahadum na Daura.

Ndị mmadụ na-atamu na e kwesịghị ka arụọ Mahadum ụgbọ oloko na Daura bụ obodo onyeisiala Muhammadu Buhari.

Mana Amaechi zaghachiri ha na Daura adịghị na Chad nke ọ na-adị na Mali.

Ọ bụ n'ụbọchị Monde ka e hibere ntọala ya bụ Mahadum bụ nke ndị mba Chaịna na-arụ na Naịjirịa.

Ndị uweojii na ndị IPOB

Image copyright Getty Images

Ndi uweojii na ndị otu IPOB takọrọ isi na be Ifeanyi Ejiofor n'Oraifite, Anambara Steeti.

Mmadụ anọ nwụrụ na ya bụ ọgbaaghara.

Ejiofor bụ ọkaiwu Mazi Nnamdi Kanu, mana ndị uweojii sị na gara be ya n'ihi ebubo mmebi ihe na ntọrị mmadụ e boro ya.

N'ofesi

Ndị uweojii obodo Essex dị na mba Briten anwụchiela otu onye a na-ebo ebubo na o ji ụgbọala kụgbuo otu nwata akwụkwọ akwụkwọ wee gbaa ọsọ.

Mmadụ atọ ọzọ merụrụ ahụ n'ihe mberede ahụ nke mere n'ehihie ụbọchị Monde.

Chebirinu m na 2020 - Mane

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Sadio Mane gbara onye nke anọ na Ballon d'Or nke afọ a.

Ọgba bọọlụ mba Senegal bụ Sadio Mane ekwuola sị gbaa chere ya maka nturuugo nke Balon d'Or afọ 2020.

Mane aganwughị mmemme Balon d'Or nke afọ a n'ihi asọmpi Liverpool na Everton ụbọchị Wenezde.

N'ihe onyonyoo o zigaara ndị nhazi emume ahụ, Mane kwuru na ya ga-agbalị ịhụ na ya ritere nzere ahụ n'afọ na-abịa abịa.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara