Mikel Arteta: Anyị chere na ọbịbịa Mikel ga-ewetarala Arsenal ihe ọma

Mikel Arteta

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Mikel Arteta

Kelechi Anyikude amaama ka onye Igbo bi Ingland na-akwado Asernal sị na ọbịbịa Mikel Arteta bụrụ Arsenal ihe ọma maka ihe ọhụrụ ọ ga-ewetere Arsenal.

Mikel Arteta abụrụla onye nkuzi ndị otu egwu bọọlụ Arsenal taa bụ Fraidee, abalị iri abụọ nke ọnwa Disemba afọ a.

Ọtụtụ na-ekwu na Arteta nwere ike ịbụ onye nzọpụta Arsenal na-atụ anya ya.

Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ tupu ọ laa ezumike nka.

Ọ ga-esonye na nzọụkwụ Ole Gunnar Solksjaer na Frank Lampard bụ ndị gbabuuru Manchester United na Chelsea bọọlụ ma bụrụzie ndị nkuzi ha ugbua.

Mana nke a abụghị naanị ihe gbara ọkpụrụkpụ maka nwa amadị a.

Ihe iri dịmkpa gbasara Mikel Arteta

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Mikel Arteta ga-anọchị anya Unai Emery bụ onye Arsenal chụrụ achụ

  • Arteta bụ ezigbo enyi Xabi Alonso. Ha abụọ malitere ịgba bọọlụ n'otu mgbe n'otu egwuregwu bọọlụ a kpọrọ Antiguoko
  • Mgbe ọ gbara afọ iri na ise Arteta bara Barcelona ebe ọ gbaara otu 'C' na 'B' ha bido na 1999 ruo 2002
  • O mechara gaa mba Fransị sonyere otu PSG nwa mgbe nta, tupu ọ gawa otu egwu Rangers nke mba Skọtland
  • David Moyes gotere Arteta ka o sonyere ndị Everton n'afọ 2005; ebe ahụ ka o si gaa Arsenal na 2011
  • Arteta gbaara ndị Everton na Arsenal bọọlụ na EPL ihe ruru ugboro narị abụọ na iri asato na anọ (284) ma nye goolu iri anọ na atọ (43)
  • N'afọ bọọlụ 2005/06, Arteta kụpụrụ Cristiano Ronaldo wee turu ugo 'Sky Sports' na-enye onye kacha agba etiti n'asọmpi EPL
  • N'Arsenal, Arteta buru iko FA abụọ na Efere 'Community Shield' abụọ
  • Na-agbanyeghị ike niile ọ kpara, Arteta agbaghịrị ndị otu egwu bọọlụ obodo ya bụ Spen; naanị na ogoogo U-16, U-17, U-18 na U-21 ka ọ gbaara ha
  • N'afọ 2016 ka Arteta malitere ọrụ dịka osote onye nkuzi ndị Manchester City n'okpuru Pep Guardiola
  • Arteta na asụ asụsụ Spanish, Basque, Catalan na English. Ọ na-asụkwa ntakịrị French, Italian na Portugese

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

Ihe omimi dị na-iru isi dada