Arsenal vs Chelsea: Chelsea agbajiela Arsenal aka napụ ha nri n'ọnụ

Chelsea na Arsenal Image copyright Getty Images

Chelsea ekweghi Arsenal zọọ ha mpịtị mpị ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Emirates.

Goolu Tammy Abraham nyere na nkeji 87 na nke Jorginho nyere na nkeji 83 zuru iji tinye Arsenal n'ọnọdụ akwa arịrị na be ha.

N'agbanyeghi na Pierre-Emerick Aubameyang nyerela Arsenal goolu na nkeji 13 e ji bido bọọlụ, o zughi ịkpọ ndị Chelsea ntu n'obi.

Ka a batara ọkara nke Abụọ, ndị Chelsea gara n'ihu ka ebule e tinyere mma n'olu, wee jiri ajụ ọnwụ gbanye Arsenal goolu abụọ iji wee naghara ha pọịntị atọ.

Ha ji mmeri a wee sị Mikel Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ ma bụrụ onye nchịkọta ọhụrụ ha 'nnọọ'.

Ka ọ dị ugbua, Chelsea ji pọịntị 35 ka nọ n'ogogo anọ na tebulu Premier League, ebe Arsenal ji pọịntị 24 nọ n'ogogo 12.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionSports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa