Chelsea vs Tottenham: Lampard akuzierela Mourinho na 20 bụ ọgụ

Mourinho na Lampard Image copyright Getty Images

Frank Lampard na-achịkọta Chelsea kuzirila Jose Mourinho na "Twenty bụ ọgụ" dịka Chelsea wefere obi azụ wee nyụọ Tottenham anya mgbe ha zutere taa.

Nkuzi a bịara dịka Chelsea ji goolu abụọ a satara otu jide azụ ụlọ ha ma merie Tottenham.

Tupu egwuregwu a ebido, ndị mmadụ chere na a ga-agwọ Chelsea ara dịka ndị Man Utd si gwọọ ha n'abalị Tusde, mana ha chị ọkụ bata, wee gosi Tottenham nkarị.

Goolu abụọ Olivier Giroud na Marcos Alonso nyere, zuru inye ha pọịntị atọ ha ji jaa eze ma kute ume ndụ.

Lampard gbanwere mmadụ anọ o jibu gbaa egwuregwu nke Manchester United, mere ka o nweta mmeri a mezuru ya ugboro abụọ ọ na-emeri Mourinho.

Giroud kwuru na mmeri a gbara ha ume dịka obi dara ndị Chelsea mba maka etu ha si agbabu, ebe ọ bụ mbụ ọ na-eso Chelsea ebido boolu n'ime ọnwa atọ.

Ka ọ dị ugbua, Chelsea ka nọkwa n'ogogo anọ, mana ha nwere pọịntị 44 nke ha ji anọ n'ime ya na-aga Tottenham na-eso ha n'azụ.