Real Madrid vs Barcelona: Real Madrid tara Barcelona ka atụ ụtụtụ

Ochee goolu ndị Barcelona na-ele ka bọọlụ si aga ịdọri neetị ya

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto,

Ochee goolu ndị Barcelona na-ele ka bọọlụ si aga ịdọri neetị ya

Real Madrid ji ọkpụ goolu abụọ a na-asaghị asa chaa chaa wee gwọọ Barcelona ịba ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Santiago Bernabeu.

Goolu abụọ ahụ si n'aka Vinicius Junior na nkeji 71 na nke Mariano Diaz nyere na nkeji 90+2 zuru ịgbawa ndị Barcelona chere na ha ga-enweta mmeri gaara eme ya nke ise ha na-emeri ha n'ime nzukọ isii ikpeazụ ha.

Mmeri a Real meriri n'El Clasico a mere ka ha wụfere n'elu tebulu La Liga, ma bụrụ ndị mbụ na tebulu ahụ, dịka ha ji otu pọịntị aga Barcelona na-eso ha n'azụ.

Ndị mmadụ gara na Twitter na-ekwu etu egwuregwu a si gaa, ma kwuo na Lionel Messi bụ onye egwu aha ya na-ada ụda si fuo.

Ebe foto si, EPA

Ha kwuru etu Marcelo si kechie ya n'ime akpa ma ghara inye ya ohere ime ihe e ji mara ya.

Lee ụfọdụ ihe ha kwuru:

Ọzọ bụ na ha kwuru etu ọbịbịa Cristiano Ronaldo bịara ile bọọlụ n'ọgbọegwuregwu ahụ so gbaa ndị Real Madrid ume mere ha ji kara obi gwọọ Barcelona ara.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị:

Aha onyonyo,

Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa