Chineme Martins: Ihe i kwesịrị ịma maka Chineme onye nwụrụ mgbe ọ na-agba bọọlụ

Chineme Martins

Ebe foto si, ThenffTwitter

Nkọwa foto,

Chineme Martins banyere Nasarawa United na 2015

Ndị ọrụ Nigeria Football Federation (NFF) na ndị League Management Company (LMC) na-eru uju maka ọnwụ onye otu egwubọọlọ ndị Nasarawa United bụ Chineme Martins bụ onye gbabiiri nwụọ ka ha na ndị otu Kastina United na asọkarịta mpị na Sunde.

Onyeisi ọrụ ndị LMC kasiri ndị be ha obi ma kwukwa na ha na-ama imi n'ala ịmata ihe butere ọnwụ ya bụ nwaamadị.

N'aka ọzọ, NFF sị na ọnwụ ya bụ nwaamadị wutere ha ebe ọ dị ukwuu.

Akụkọ kọrọ na Martins dara n'ala na nkeji iri anọ na atọ (43) na ya bụ asọmpi.

Ndị ọrụ ahụike ndị otu egwubọọlụ abụọ ahụ gbara mbọ ịzọ ya ndụ tupu ha ebụga ya ụlọọgwụ bụ ebe ha kwuru na ọ hapụla.

Ndị otu egwubọolụ ya bụ Nasarawa United mechere jiri ọkpụ goolu atọ (3) merie ya bụ egwuregwu bụ nke Chinedum Ohanachom nyechara.

Onye bụ Chineme Martins?

  • Chineme Martins bụ nwafọ Abia steeti gbara afọ iri abụọ na abụọ (22).
  • O si Ifeanyi Uba FC were bata Nasarawa United n'afọ 2015/2016.
  • Martins so ndị otu Nasarawa United ruo agba ngwucha nke asọmpi iko Aiteco Federation na 2016.
  • Ọ na-agbara ha difensi

Akụkọ ga-amasị gị