Transfer Rumours: Barcelona chọrọ iji Griezman gbanwere Neymar

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Messi ekwuola ugboro ugboro na ọ ga-amasị ya ma Neymar lọghachite na Barcelona

Otu egwuregwu Barcelona ka nwere olileanya ịzụta nwafọ Brazil bụ Neymar site n'aka ndị Paris St-Germain.

Dịka Sky Sports si kwuo, ọ ga-amasị Barcelona iji Antoine Griezmann gbanwere Neymar.

Cheta na Neymar gbabuuru Barcelona bọọlụ tupu ọ hapụ ha gawa PSG n'afọ 2017 n'ọnụ ego ruru nde yuro 222.

Ọ bụ eziokwu na Neymar mere ọfụma oge ọ nọ na Barcelona mana ụfọdụ ndị mmadụ kwenyere na Lionel Messi enyeghi ya ezigbo ohere ka ọ chakee, nke kpatara o ji pụọ.

Barcelona gbalịrị ịzụtaghachi Neymar n'afọ gara aga, mana PSG ekweghị ere ya.

Haaland awụọla Manchester United n'ala

Erling Haaland Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Erling Haaland

Erling Braut Haaland na-agbara Borussia Dortmund bọọlụ awụọla Manchester United n'ala dịka ha chọrọ ịzụrụ ya.

Ọnụ na-ekwuru Haaland bụ Bernie Mandic kwuru na Haaland kwenyere na ọ ga-aka mee nke ọma na Dortmund karịa ịga ebe ọzọ.

Pogba nwere olileanya ịga Real Madrid

Paul Pogba Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Paul Pogba

Nwafọ mba France bụ Paul Pogba ka nwere ọnụnụ ọkụ n'obi ịhapụ Manchester United gawa Real Madrid.

Pogba chọrọ ka ya na nwanna ya Zinedine Zidane, bụ onye nchịkọta Real Madrid rụkọọ.

Oke mmerụ ahụ ekwebeghi Pogba zuru ike na Manchester United kamgbe o si Juventus gafee ebe ahụ n'afọ 2016.

Ndị Chaịna ebunyela Ighalo ite ego ka ọ lọghachi

Ighalo Jude Image copyright @Ighalojude/Twitter

Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Odion Ighalo nọzị n'etiti ịhọọ mmiri maọbụ amụma.

Ọ bụ n'ihi na otu bọọlụ Shanghai Shenhua na mba Chaịna ewelitela ụgwọ izuụka ya rue £400,000.

N'aka nke ọzọ, ọ ka ji otu ụkwụ nọrọ n'otu Man Utd ebe ọ gara dịka onye ọgba bọọlụ e bitere ebite

Ighalo sonyere Shanghai Shenhua n'ọnwa Febụwarị afọ 2019, ebe Man Utd si hụ ya were biri ya mbimbi.

Ighalo na-enwe olileanya na Man Utd ga-azụrụ zi ya dịka onye bọọlụ nke ha zuru oke mana otu Man U ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ya.

Ya mere ndị mmadụ na-ajụ "Gịnị ka Ighalo ga-eme?"

Ighalo n'onwe ya ekwuputebeghi ihe ọbụla maka nke mana ka anyị na-ele anya.

Barcelona nwere ike ire Griezman

Antoine Griezmann Image copyright Getty Images

Ihe abụọ chere otu Barcelona n'ihu ugbua nke gụnyere - ibelata mmefu ego nakwa ikwalite otu bọọlụ ha.

Nke a mere ha ji tinye Antoine Griezmann n'ahịa na "Transfer season" ọzọ na-abịa n'ihi na o meghi ka ha si tụọ anya mgbe ha ji ego yuro nde narị n'ọma abụọ zụta ya n'aka Athletico Madrid.

Mana ha na-akwado ire ya sọọsọ yuro otu nde narị iji nwetakwa ego ha mefuru n'isi ya.

Kepu kepu na-ekwu kwa na otu ndị welitere isi dịka Man United, Chelsea, Arsenal na PSG na-enyo Griezmann enyo maka ịzụta ya.

Ka a na-atụ anya mara nke ga-eme n'ahịa "Transfer" ga-emepe n'oge na-adịghị anya.

Ihe nwereike ime ka Pogba gaa Real Madrid maọbụ Juventus

Image copyright paulpogba/Instagram

Akụkọ ndị akwụkwọ mgbasa ozi SUN dere na-akọwa na ha nwereike irepụ Paul Pogba n'ọnụ £100M.

Nke a na abịa dịka ndị otu bọọlụ Real Madrid na Juventus na-achụsị ya bụ nwa okorobia ike.

N'akụko ọzọ ndị otu Manchester united na-ajụ ese ịzụta Philippe Coutinho gbara afọ iri abụọ na asaa n'aka ndi otu Barcelona. (Mundo Deportivo)

Image copyright phil.coutinho/Instagram
Nkenke aha onyonyo Philippe Coutinho na-agbara ndị mba Brazịl bọọlụ

Ndị akwụkwọ mgbasa ozi Goal na-ekwu na ndị otu Athletico Madrid na-akwado ịdọtị nkwekọrịta afọ ọrụ ha na Thomas Patey nwere ka ọ rụo afọ 2025.

Ha ga-ebuli kwa ego isi ya rụo €100M.

Image copyright thomaspartey5/Instagram
Nkenke aha onyonyo Partey bụ nwaafọ Ghana

Nke a na-abịa dịka ndị Arsenal na otu Manchester United na-achọ ịzuta ya.

Kepukepu na-ekwu kwa na David Alaba onye na-agbara ndị otu Bayern Munich na-atụli ma ọ ga-esi otu ya pụo dịka ndị otu Real Madrid na Barcelona na-achọ ịzụta ya (Sport Bild-in German)

Image copyright da_27/Instagram
Nkenke aha onyonyo Alaba na-gbara ndị mba Austria bọọlụ

Ndị otu egwu bọọlụ Arsenal eweela iwe dịka ha sịrị na ndị otu Barcelona na-arafụ Pierre-Emerick Aubameyang n'ọrụ ya.

Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na Aubameyang chọrọ ị ga otu Barcelona (Star).

Image copyright aubameyang97/Instagram

Kama Aubameyang sị na obi dị ya ụtọ n'Arsenal.

Akụkọ na-ekwu kwa na onye nkụzi ndị Arsenal bụ Mikel Arteta chọrọ irepụ Henrikh Mkhitaryan sị mba Armenia dịka ndị otu Roma na-agbalị ka ha zụta ya azụta na abụghị mgbazị(Express)

Image copyright micki_taryan/Instagram
Nkenke aha onyonyo Henrikh Mkhitaryan nọ na mgbazị n'otu Roma

Onye nwe otu egwu bọolụ Chelsea bụ Roman Abramovich na-anụ ụda Coronavirus dịka ọ sepụrụ oher pawụnd abụọ na ọma.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Abramovich gbara afọ iri ise na atọ bụ onye nwe otu Chelsea

Kama Abrahimovich ka bụ kwa ide dịka akụ ya ka karịkwara ijeri pawụnd iri (Star).

Ndị otu Aston Villa na-achụ Dion Sanderson ọsọ ụkwụ eru ala.

Ha chọrọ ka ọ bụrụ onye otu ha kama Sanderson ka na-agbara ndị otu Cardiff City na mgbazị (Football Insider)

Kepukepu na-ekwu kwa na anya ndị Manchester United nọ n'isi Samuel Umtiti.

Image copyright samumtiti/Instagram
Nkenke aha onyonyo Umtiti na-agbara ndị mba Fransị bọọlụ

Umtiti na-agbara ndị otu Barcelona na ndị mba France( Sport na Spanish).

Akụkọ ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGọvano Sanwo-Olu ejirila nde naira 250 tie ndị ọkụ gaasị metụtara aka n'obi