Rape: Gịnị ka e kwesịrị ime nwoke wakporo nwaanyị?

Rape: Gịnị ka e kwesịrị ime nwoke wakporo nwaanyị?

Ọtụtụ ndị mmadụ etinyela ọnụ n'okwu banyere mwakpo ụmụnwaanyị na-arị ibe ya elu ugbua.

BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụọnụ iji mara uche n'okwu, ma lee ihe ha kwuru.

Otu nwaanyị sị na e kwesiri ịpị nwoke ọbụla wakporo nwaanyị n'ihi na nke a akarịala.

Ebe otu nwoke sị na ọ bụ ụmụ anụmanụ bi n'ọhịa na-akpa ụdị agwa a na ọ bụ ihe onye isi zuru oke na-eme.

Nwagbọghọbịa sị na ụjọ na-atụzi ha ugbua ịpụ n'ezi n'oge abalị, na onweghizi onye na-aga ụka abalị ugbua.

Nke a na-abịa n'ime izuụka abụọ a wakpochara ma gbuo nwata akwụkwọ Mahadum Benin bụ Uwavera n'ime ụlọụka.

Kirie ihe ha kwuru ebe a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: