June 12 : Ihe asaa ọchịchị onyekwuoucheya gbanwere na Naijiria n'afọ 21

  • Uche Akolisa
  • BBC Igbo, Lagos
Obasanjo,Yar'Adua,Jonathan na Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Taa bụ abalị iri na abụọ nke Juun afọ 2020 bụ ncheta emume ọchịchị onyekwuoucheya (Democracy Day).

Tupu abali isii nke ọnwa Juun afọ 2018 bụ oge e megharịrị ya, a na-emebu emume a n'abalị 29 nke ọnwa Mee bụ ụbọchị ndịagha were ọchịchị nyefe n'aka ndị nkịta n'afọ 1999.

Mana Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari higharịrị ya rue abali 12 nke ọnwa Juun, iji kwanyere Moshood Abiola, bụ onye nwụrụ n'ọgụ inwenta ọkwa sitere na mmeri o nwere na ntuliaka onyeisiala e mere n'a Juun 12, afọ 1993. na mmeri o meriri na ntuliakagha

O meela afọ iri abụọ na otu ọchịchị Naijiria banyere n'aka ndị nkịtị na-enweghị mgbubi ọbụla; afọ asatọ nke Olusegun Obasanjo, afọ abụọ nke Musa yar'Adua, afọ isii nke Goodluck Jonathan na afọ ise nke Buhari.

Ajụjụ ụfọdụ ụmụ Naijiria kpụ n'ọnụ bụ ole ihe ọchịchị isi n'aka ndị uwe kakị banye na aka ndị uwe agbada wetara na Naijiria ka ọchịchị onyekwuoucheya bụ ịkwọ aka tiere ọkụkọ akị?

Lee ihe ise gbara ọkpụrụ o wetara dịka ndị okwu ọchịchị na mwulite obodo dọrọ anya sị kọwaa:

1. Ohere ikwu uche gị

Aha onyonyo,

Democracy day: 'Buhari jide aka a o ji rụọ na ngwụcha, ọchịchị ya ga-abụ ihe lara n'iyi'

Mgbanwe dị ọkpụrụkpụ bụ na ndị mmadụ na-eso ekwu onye ga-achị ha site na ntuliaka, ọ bụghịzị onye ndịagha tụrụ aka ha enye ya ọkwa ọchịchị.

Larry Ọgụego bụ onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye sị, "Otu ihe anyị ritere bụ na ndị mmadụ nkịtị nwere ike pụta soro na-ekwu ihe na-eme n'obodo."

2. Ịkwanye ugwu nye ikike dịrị onye

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Egbuola ọtụtụ ndị otu uka Krist na mpaghara ugwu hausa

Kemgbe a banyere n'ọchịchị onyekwuoucheya, a na-agbaso Iwu Naijiria were na-eme ihe.

Onye ihe e mere ya adịghị mma, ọ gaa n'ụlọikpe ịnata ikpemkwụmọtọ mana ọ dịghị otu a n'oge ọchịchị ndịagha.

"O nyela anyị ikike gbasara oke ruru anyị. Ọnụ na-eruzi anyị n'okwu."

3. Alaka atọ ọchịchị na-arụ ọrụ

Ebe foto si, @HouseNGR/Twitter

Ndị omeiwu(legislature) na-arụ ọrụ, ndị ụlọikpe(judiciary) na-arụ ọrụ ha, ndị ọchịchị(executive) na-arụkwa nke ha.

Ihe nke pụtara bụ na o nweghị alaka ọchịchị na-ebi okwu n'ihe ọbụla.

Aha onyonyo,

Ikike diri onye,mmepe obodo na ihe ndị ọzọ mere ọchịchị ndị nkịtị ji ka nke ndị isiabaokpu mma'

Tupu ugbua, naanị ndịagha na-ekwu ihe a na-eme. Ha na-ekpe, na-ebi.

Oguego kwuru na "ndị mmadụ na-eme iwu na-arụ ọrụ ihe gbasara mmadụ."

4. Mwulite akụnaụba obodo

Ebe foto si, Getty Images

Ọkacharamara n'ihe gbasara mwulite akụnaụba bụ Boniface Chizea sị na ọchịchị onyekwuuche ya wetara mwulike akụnaụba na Naijiria ọkachasị n'afọ asatọ mbụ nke olusegun Obasanjo.

Iji maa atụ, dịka ụọakụ mbaụwa bụ IMF si kwuo, akụ Naijiria na-emepụta nke a kpọrọ 'GDP n'aha ịchafụ gbaliri site na $55.65 ọ bụ n'afọ 2003 rue ijeri dọla $114.36 n'afọ 2006.

Chizea sị na ego Naijiria ji echekwa onwe ya na mba ọzọ gbalitere rue nde dọla 40.

Mana ọ tụrụ arịrị na ya bụ ego agbadala ugbua rue ihe dịka ijeri dọla 30 n'oge ọchịchị Buhari.

Ọ bụ n'oge a ka e rere ọtụtụ ụlọọrụ gọọmenti (privatisation)resị ndị nkịtị nke wetara nnukwu ọganiru n'akụnaụba.

E rere ụlọọrụ Nitel ma nye ndị nọrọ onwe ha ikike ibido ọrụ ekwentị nke mere e ji nweta ụlọọrụ MTN,GLO, Airtel na Etisalat.

Atụmatụ nke mere ka ekwenti kwusi ịbụ njirimara ọgaranya mabụrụ ihe rutere ma nnukwu mmadụ ma ogbenye aka.

5. Mmepe obodo

Nkọwa foto,

Ọrụ Akwa Naịja nke abụọ ka nọ n'isi mbido

Mgbanwe ọzọ dị mkpa nke ọchịchị onyekwuouche ya wetara na Naijiria bụ mmepe obodo; okporoụzọ, ụlọọgwụ na ụlọakwụkwọ.

A gbapere ọtụtụ ụlọakwụkwọ site na praimarị, sekọndarị rue mahadum.

Mahadum sitere na 118 n' afọ 1990 rue 170 ugbua ( nke gụnyere mahadum gọọmenti etiti, nke steeti nakwa nke ndị nọrọ onwe ha) dịka gọọmenti nyere ikike na ndị nọrọ onwe ha mepe mahadum.

6. Mwepụ mmachi obodo ndị mepere eme machiri Naijiria

Ọtụtụ mba dịka US,UK na mba ndị ọzọ di n'Yorop gbakọtara Naijiria azụ n'ihi ọchịchị aka ike n'oge ọchịchị ndị agha mana nke a gbanwere ngwangwa ọchịchị bara n'aka ndị nkịtị.

Ọmụmaatụ: N'afọ 1995, oge ọchịchị Sani Abacha, gọọmenti gburu Ken Saro-Wiwa na mmadụ asatọ ndị ọzọ (Ogoni 9) maka ogbugbu e gburu ndị ichie MOSOP asatọ bụ ndịna-akwado gọọmenti, otu 'Commonwealth' mapụrụ Naijiria afọ abụọ.

A machikwara ndị nọ ọchịchị na ndị ezinaụlọ ha ibanye ụfọdụ mba ofesi.

Mana e wepụrụ mmachi ndịa niile ka ọchịchị laghachiri n'aka ndị nkịtị.

7. Ndị ma ihe a na-akọ nọ n'ọkwa kwesịrị ha

Ebe foto si, Okonjo-Iwela,Ezekwesili,Soludo,El-Rufai

E tinyere ndị ma nke a na-akọ n'ọkwa kwesịrị ha, ọkachasị n'oge ọchịchị Obasanjo.

Nke a nwetara ezigbo mmepe na mwulite akụnaụba dịka ha si n'amamihe na nka ọrụ ka kwalite akụnaụba Naijiria.

Ndị dịka Ngozi Okonjo-Iweala, Charles Soludo, Oby Ezekwesili, Nasir El Rufai, Akinwunmi Adesina, Dora Akunyili bụ ọchịchị onyekwoucheya tụpụtara ha.

Mana ọ dịghịchakwaghị otu a ugbua.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: