Mụta etu BBC si agba mbọ ịkwalite ntụkwasịobi na ịkwụwa aka ọtọ n'akụkọ ya

Ndị na-ege ntị na UK nakwa mba ụwa na-ahụta BBC dịka ndị na-eweta akụkọ a na-atụkwasị obi. Websaịt anyị, dịka TV na Redio anyị, na-enye akụkọ bụ ezi ya, na-eleghi anya n'ihu, kwụrụ n'onwe ya ma dịkwa mma.

Ụkpụrụ edemede anyị kwuru: "Ntụkwasị obi ndị na-ege anyị ntị nwere n'akụkọ anyị niile kọwapụtara ihe anyị na-eme". Anyị kwụụrụ onwe anyị, anyị anaghị ele mmadụ anya n'ihu, na-ekwu eziokwu. Anyị na-agba mbọ inweta ụkpụrụ ziri ezi, na-eleghi mmadụ anya n'ihu ma ghara iduhie ndị na-ege anyị ntị.

"Mbọ anyị na-agba na-eleghi mmadụ anya n'ihu bụ isi sekpụ ntị ntụkwasị obi ahụ. N'akụkọ anyị niile, anyị ga-agbaso ihe niile na-eleghị mmadụ anya n'ihu nke ga-egosipụta echiche dị icheiche. Anyị ga-eleba atụmatụ ọbụla anya nke ọma n'obi ọcha."

Anyị maara na ịchọpụta akụkọ bụ eziokwu n'ịntanet na-agbagwoju anya. Anyị makwaara na ndị na-ege anyị ntị na-achọ ịghọtakwu etu BBC sị ebipụta akụkọ.

N'ihi nke a, BBC News na-agbasi mbọ ike ịkọwara gị ụdị akụkọ ị na-agụ maọbụ ị na-ele na websaịt anyị, onye na ebe akụkọ ahụ sị bịa, nakwa etu e si dee ya n'ụdị ọ dị. Site n'ime nke a, anyị ga-enyere gị aka ikpebi n'onwe gị ihe mere a ga-eji tụkwasị BBC obi.

Anyị na-eme ihe ngosi akụkọ ntụkwasi obi n'ụdị kọmpụta ga-achịkọtanwu nke a kpọrọ "machine-readable" na Bekee, nke pụtara na ha ga-apụta n'igwe nchọpụta nakwa ọba soshal midia, iji nyere ha aka ịchọpụta ebe akụkọ bụ ezi ya si pụta.

OMUME KACHASỊ MMA

BBC dị na mbụ nwee ntuziaka ha ji ede akụkọ ha niile nakwa ụkpụrụ atụrụ anya n'aka ndị ntaakụkọ anyị. Iji mee ka ọ dị mfe ịhụ etu ntuziaka BBC dị n'ime ụlọ ntaakụkọ anyị, anyị depụtara ngalaba ndị dị mkpa n'ibe akwụkwọ a.

Nkwupụta Ebumnobi: Ebumnobi BBC bụ ime ihe maka ọdịmma ọha, ijere ndị na-ege anyị ntị ozi site n'iwepụta akụkọ kwụ ọtọ na eleghị anya n'ihu, na ọba ozi anyị niile na-ezi ozi, kuzie ihe ma nye obi ụtọ. Gụọ ya n'uju ebe a Mkpebi BBC .

Usoro onwunwe, inweta ego na nkwado ego: Anyị kwụụrụ onwe anyị na enweghị mmekọ maọbụ enyemaka ọbụla ga-emegide ntuziaka akụkọ anyị. Ndị na-ege anyị kwesiri inwe obisike na ndọrọndọrọ ọchịchị, azụmaahịa nakwa ọchịchọ mmadụ anaghị emetụta mkpebi anyị ga. Chọpụta maka nkwado ego BBC News, na UK nakwa mba ụwa niile, ni'ime Mkpebi BBC n'ihe gbasara nkwụrụonwe BBC.

Ụbọchị Mbido: E bidoro BBC n'abalị 18 nke ọnwa Ọktoba afọ 1922. Gụọ maka Akụkọ Mbido BBC.

Ụkpụrụ omume kwụ ọtọ: Ntuziaka etu BBC si akụkọ gosipụtara uru na omume a na-atụ anya n' akụkọ niile e depụtara ga-agbaso.

Ihe ndị ọzọ yiri ibe ya:

Iwu Ndịiche: Mụta kwuo maka nkwa BBC kwere na ndịịche n'ime Mkpebi BBC.

Akụkọ Ndịiche na ndị ọrụ: Chọpụta etu BBC News si arụ ọrụ iwulite ndịiche n'ime Ozi banyere nhatanha na BBC.

Mgbazi: BBC na-agba mbọ inweta akụkọ ziri ezi. A ga-ahụ iwu banyere mgbazi na ngalaba ndị a n'ime Ntuziala Edemede.

Akụkọ anyị na-ewepụta na-abụ nke e tinyere anya na mmiri were chọpụta, site n' akaebe doro anya, nke e nyochara ma wepụta n'ụzọ nakwa asụsụ doro anya. Anyị kwesiri ikwu eziokwu n'ihe anyị amaghị ma ị gbara akụkọ asịrị. Anyị ga-ekwupụta onye mere ebubo, akaebe na ihe ndị ọzọ na-enwenyeghị ihe maọbụ onye ga-ekwu na ọ bụ otu o siri mee.

Anyị nwere obi ịnabata njeghie mgbe e mere ha ma na-akwado ịdị njikere ịmụta ihe n'ime ha.

Ọ bụrụ na-edeziri akụkọ e bipụtarala na mbụ, a na-agbakwunye ozi na ngwụcha akụkọ ahụ iji gwaa onye na-agụ ya na e deziri ya. Ọ bụrụ na e nwere obere ndehie n'akụkọ dịka na mkpụrụ edemede, agaghị agbakwụnye ozi n'azụ akụkọ ahụ.

Nnanị ma na e bipụta akụkọ ka ọ nọrọ ruo nwa mgbe nta, a na-ahụta akụkọ ọbụla e bipụtara dịka akụkọ a ga-agụ mgbe ọbụla a chọrọ n'ịntanet, ma a gaghị ewepu ya.

Kama e nwere ike iwepụ ya ma ọ bụrụ ihe gbasara iwu, nchekwa nkeonwe maọbụ ihe megidere ụkpụrụ usoro ide akụkọ nke a na-apụghị imezi ma ọ bụghị ma e wepụrụ ya.

Njikọ ndị ọzọ:

Nnyocha/Ụkpụrụ nchọpụta eziokwu:Usoro nyocha na nchọpụta nke bụ eziokwu n'akụkọ nke BBC dị n'ime Editorial Guidelines on Accuracy.

Ebe akụkọ si a na-akpọghị aha: A kọwara iwu na ntuziaka BBC banyere ebe akụkọ si a na-akpọghị aha n'ime Editorial Guidelines.

Njikọ ndị ọzọ:

Nzaghachi a na-etinye n'ọrụ: Usoro e ji eme mkpesa na BBC dị n'ime BBC Complaints Framework.

Ndị ndu: Zute ndị isi na-ahụ maka ngalaba akụkọ: BBC News Board.

ODEAKỤKỌ ỌKACHAMARA

Akụkọ BBC News si n'aka ha na-ebu aha odeakụkọ dere ya, dịka nke ndị ntaakụkọ nwere isiokwu nlekwasị anya e ji mara ha.

Akụkọ ndị agbakọtara aka dee, ndị nke e nwetara n' ọtụtụ ebe ndị ọzọ gụnyere ụlọọrụ ntaakụkọ ndị ọzọ, ngalaba BBC Newsgathering na BBC broadcast output, maọbụ nke ọtụtụ ndị ọrụ gbakọrọ aka bipụta n'ụbọchị, anaghị ebu aha.

ỤDỊ ỌRỤ

BBC News na-egosi ndịiche dị n'akụkọ mere eme na echiche mmadụ. Anyị na-eji aha kọmpụta na-achịkọnwu isii agụkọ ụdị ọrụ anyị na-arụ.

  • Akụkọ- Ide akụkọ bụ eziokwu, nke a hụrụ n'anya na nke onye odeakụkọ nyochara, maọbụ akụkọ sị n'aka onye ihe doro anya nke e nyochara.
  • Nkọwapụta- Akụkọ si n'ọnụ onye ọkachamara, ma ọ bụ onye ntaakụkọ BBC ka ọ bụ onye ọzọ, iji kọwapụta ihe na-eme n'obodo.
  • Ịjụ ndị na-ege ntị - Akụkọ e dere site na inweta ozi n'aka ndị na-ege.
  • Nkuzi- Nke a bụ edemede na-akọwa n'uju ihe butere ihe mere maọbụ ihe nzuzo dị n'ime akụkọ.
  • Echiche onye- BBC News n'onwe ya anaghị ele mmadụ anya n'ihu maọbụ echiche mmadụ mana oge ụfọdụ anyị na-ebipụta akụkọ banyere echiche onye ọkachamara.
  • Nnyochagharị- Edemede banyere nnyocha emume, ọrụ nka dgz, nke bu echiche onye mere ya.

EBE AKỤKỌ SI NA EBE MGBAKWASA ỤKWỤ

Edemede anyị banyere isiokwu ọbụla kwesiri isi ebe dị mma, nwee ihe akaebe, e nyochara nke ọma ma wepụta ya n'asụsụ doro anya. Anyị na-agba mbọ ikwu eziokwu ma nwee obi ọcha banyere ihe anyị na-amaghị ma gbanarị akụkọ asị.

Ọ bụrụ na BBC News nwetere site n'otu ebe, anyị na-agba mbọ itinye aha onye ebe o si, ebe o kwere omume. Anyị na-agwa gị ebe akụkọ a si, ka i were aka gị chọpụta ihe omimi dị n'akụkọ anyị.

Oge ọ dị mkpa, anyị na-egosi gị akara websaịt ọzọ nwere ozi mgbakwụnye n'akwụkọ iji nwete akụkọ tinyere nke ederede.

USORO

Maka akụkọ ndị miri emi, dịka ndị akụkọ nnyocha maọbụ nke akara (data), anyị ga-enyere gị aka ịghọta etu anyi si rụọ ọrụ site n'igosi gị akara zoro ezo, echiche nakwa usoro ndị ọzọ anyị ji - ọmụmatụ, usoro anyị ji mee nnyocha ; ọnụọgụgụ mmadụ e ji mee ya; ndị na ụdị nnochite a nọchitere n a ndị sonyere mee ya; etu e si nweta ọnụọgụgụ;ebe nakwa oge.