Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Nchịkọta

  1. Arsenal azụola Pierre-Emerick Aubameyang
  2. Chelsea a zụọla Olivier Giroud
  3. Riyad Mahrez anaghị aga Man City
  4. Lucas Moura abaala otu Tottenham
  5. Ozil ga-akụrụ otu egwu Arsenal ruo 2021
  6. Dortmund ekwetala ịnabata Michy Batshuayi nọ n'Chelsea
  7. Ije Success na Watford amịputaghị npkụru
  8. Tyler Roberts ebinyela aka na Leeds
  9. Leicester ọ ga-ejide Riyad Mahrez?
  10. Ohere orire na ọzụzụ ga-emechi n'ime abalị taa

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Oge niile edepụtara bụ UK

Sonye

  1. Oge ụna eruola 😎🤗🤩

    Anyị na-ekele unu ọfụma!

    Cheta na oge ahia fọkwara!

    Orire n'ọzụzụ nke a ga-eru ime abalị taa.

    Biko laghachị webụsait BBC.com/Igbo ka ịhụ ihe mere n'ahia taa.

    Ka ọ dị nụ ooo...

  2. Lucas Moura abaala otu Tottenham

    Lucas Moura na Tottenham ebinyeela aka n'akwụkwọ ruo afọ 2023.

    Lucas Moura
    Image caption: Onweghi asọmpị ọbụla Lucas Moura gba n'afọ ọhụrụ nke egwuregwu bọọlụ n'otu PSG
  3. Pogba nọrọ na njem

    Pogba n'apụu n'ụbọchị ipeazụ afịa egwuregwu bọọlụ.

    Mana egu atụụla gi ma ọburụ na ị bụ oge na ahụ Manchester United n'anya makana onye nke a bụ nwanne ya bụ Florentin.

    Ọ puola na Saint Etienne na mba France gawa Genclerbirligi na ala Turkey.

    View more on twitter
  4. Orire na ọzụzụ mere n'egwuregwu bọọlụ taa

    Ọ bụ ugbua kị na abata?

    Lee ihe mere na ahia egwuregwu bọọlụ ugbua

    Cheta kwa na ofọdụrụ elekere ise na nkeji ịrị atọ tupu ohere azumahia emechie

    • Arsenal azụọla Pierre-Emerick Aubumeyang n'aka Borussia Dortmund n'ego ruru nde pound ịrị ise na ịsị.
    • Dortmund ekwuola na ha azụọla Michy Batshuayi n'aka ndi Chelsea forward Michy Batshuayi.
    • Chelsea kwukwara na ha azụọla Olivier Giroud ruo onwa ịrị na asatọ n'ọnụ ego ruru nde pound ịrị n'asatọ.
    • Manchester City ewepula uche ha na Riyad Mahrez, maka ndi Foxes kwuru na ego isi ya eruola nde pounds iri itoolu na ise.
    • Arsenal azuọla Mesut Ozil.
  5. Ekele nke Giroud

    Chelsea a zụọla Olivier Giroud na ọnụ ego ruru nde pound ịrị na asatọ.

    Mbinye aka nke a ga-anọ ruo ọnwa ịrị na asatọ.

    Giroud di afọ ịrị na otu nyere goolu na otu Arsenal ruru otu narị na ise.

    View more on twitter
  6. Mahrez anaghị aga Man City

    Otu bọọlụ Manchester City eweghayọọla aka n'azụmazụ ha maka onye ọkụụ bọọlụ bụ Riyad Mahrez nke Leicester City.

    Riyad Mahrez gaara iri ha nde pound ịrị itoolu n'isi £95m nke pụtara ijeri naịra iri anọ na asaa.

    Manchester City ahụtaghị onwe ha dịka ndị kwere ọnụ ahịa mgbe ndị otu egwuregwu Leicester City nyere ha atụmatụ nke onye ọgbaa bọọlụ gara eso n'ime azụmazụ ahịa ahụ.

    Nkata ahụ mere ka Leicester mara iyi Mahrez - onye dị afọ iri abụ na isii.

    City e meela ka o doo anya na ha ekwetaghị ịkwụ ugwọ isi onye ọkụụ bọọlụ gafere £60m gafere ijeri naịra narị atọ na anọ.

    Riyad Mahrez
    Image caption: Riyad Mahrez enyeela goolu ruru asatọ oge Leicester meriri Watford
  7. Na Akpọtụ Ugbu AReece Oxford a baala Borussia Monchengladbach

    Reece Oxford alachịala mba Germany na mbinye aka otu Borussia Monchengladbach.

    Oxford dị afọ ịri na itoolu bidoro na Bundesliga tupu ọ laghachị West Ham.

    Reece Oxford
    Image caption: Reece Oxford ba ụlo akwụkwọ West Ham na afọ ịrị na atọ
  8. Ozil ọ bụ gị nwe aka a!!

    Akwukwọ nke Mesut Ozil binyere otu Arsenal ga-eme ya gbara bọọlụ rue afọ 2021!

    Cheta n'akwụkwọ Ozil buzi onye kachasị rie ụgwọ ọnwa n'otu egwuregwu bọọlụ Arsenal.

    Mesut Ozil
    Image caption: Mesut Ozil na enyeela ọtụtụ goolu na otu Arsenal
  9. Na Akpọtụ Ugbu ASuccess apụọla na Watford

    Ije Success na Watford amịputaghị npkụru.

    Success alachịala Malaga na asọmpi La Liga.

    E be ahụ ka ọ ga anọ na afọ nke a fọru afọ

    Isaac Success
    Image caption: Isaac Success bu onye Senegal
  10. Bata kwa na nkparịta ụka nke a

    Taa bụ ubọchị oma na ezinaulo ndi gunners...

    Chịkọta orire na ozụzu klọọbụ gị na-ato nke oma... eeeehhh!

    View more on twitter
  11. Aubameyang: Obi di m ụtọ na-ebe a

    Pierre-Emerick Aubmeyang na Arsene Wenger
    Image caption: Aubmeyang enyeela goolu ruru ịr abụo na otu n'asọmpi nke afọ egwuregwu bọọlụ ọhụrụ

    Pierre-Emerick Aubmeyang na ndị nta akukọ enweela nkparịta ụka nke mbu.

    Nke a na-eso nbata ya na otu Arsernal.

    Cheta na Arsenal zụru Aubmeyang n'aka ndị Borussia Dortmund n'ego ruru nde pound ịrị ise na isii.

    Aubmeyang kwuru na:

    Quote Message: Obi di m utọ na a nabatara m n'ime otu a. Mụ na Henrikh Mkhitaryan n'okwa na otu klọọbụ. Ka m sịri kwuo na mbụ, obi di m dị ụto.
    Quote Message: A bụ m onye na-enye goolu ngwa ngwa, dika Henry na nke obere. Mana ka m sị na-mbu,ọrụ dikwa n'ihu."
  12. Ha ga-azụ James Justin?

    Onye ga-azu oo...

    Luton Town ekwuola na aghaghị ahapụ James Justin ma ọbụru na otu ọbụla chorọ ya akwughi ego nke isi ya ruru otu nde pound.

    Justin na-achọ ị banyere otu ọbụla dị na-agba Premier League. Mana Luton chọrọ Lloyd Jones onye otu Liverpool.

    James Justin (nọ n'aka nrị)
    Image caption: James Justin nọ n'aka nrị na asọmpị EFL na Ọgọsụtụ afọ 2016
  13. Ọ ka akpọghachi Gazza?

    Le zịanu ihe ọchị!

    Paul Gascoigne ọ ga-ehicha akpụkpọụkwụ bọọlụ ya?

    Gazza na-akpa ọchị maka mmechị ọzụzụ na orire.

    View more on twitter
  14. Tyler Roberts ebinyela aka na Leeds

    Tyler Roberts esila West Bromwich Albion gafee Leeds

    Tyler Roberts
    Image caption: Tyler Roberts gara Walsall na mbinye

    Ndị Leeds egoola Tyler Roberts bụ onye na-agbaburu West Bromwich Albion bọọlụ, mana ebe a na-amabeghi ego ole ha kwụrụ, otu ndị mgbasa ozi a na-akpọ Yorkshire evening post kwuru na ọ ruru £2.5m (N1.2b)

    N'agbanyeghi na Roberts esoghị ndị Baggies gbaa otu egwuregwu, o binyere aka na akwụkwọ ga-eme ka ọ nọrọ na Elland Road ruo afọ anọ na ọkara.

    Nwokoorobịa afọ iri na itoolu a nyere goolu ise n'ime eguregwu iri na itoolu n'ọnwa a ebe ọ gara mbinye na Walsall nọ na League One.

    O nwere ike igba bọọlụ nke mbụ ya n'otu Leeds mgbe ha na Cardiff City ga-asọmpi n'ụbọchị Satude.

  15. Ozil gwunyesirike n'Arsenal, ọ naghị aga ebe ọbụla

    Ozil ebinyela aka n'akwụkwọ ịkwụsịke n'otu egwu Arsenal

    Mesut Ozil emechiela kepụkepụ na-ewu maka ọnọdụ ya n'Arsenal.

    Ọ binyere aka n'akwụkwọ ịnọkwu afọ atọ na okara.

    Ozil di afọ iri abụọ na itoolu. Akwụkwọ a o binyere aka na ya meziri ya onye kachasị rie ụgwọ ọnwa n'otu egwu bọọlụ Arsenal.

    Mesut Ozil
    Image caption: Mesut Ozil ga anọ afọ atọ ọzọ na Arsenal
  16. Ben Hall ejela Notts County

    Notts County a nabatala onye ógbaa bọọlụ Ben hall akpọrọ Brighton dị arọ iri abuọ na otu na mbinye.

    View more on twitter
  17. Na Akpọtụ Ugbu AAubameyang esila Dortmund baa Arsenal n'ọnụ ego Nde Naịra iri ise na isii

    Okwu agwụla

    Arsenal azụtala onye na-agba n'ihu a na-akpọ striker Pierre-Emerick Aubameyang site na Borussia Dortmund n'ọnụ ego nde naịra iri ise na isii.

    Pierre-Emerick Aubameyang
  18. Nnọ nụ o!

    Ọ bụ taa ka ọ na-eme. Anyị na-elepu anya ndị a ga-azụ na ndị a ga-ere taa

    Ozi na-erụ anyị na-akọwa na Batshuayi ahapụla Chelsea tinye ụkwụ na Dortmund nke Germany.

    Anyị na-ele anya maka ọtụtụ ndị okwe anyị ma ga-eyipụ efe anyị ji mara ha.

    Batshuayi n'Chelsea