Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Adline Okere, Chiagozie Nwonwu, Uche Akolisa na Chimamaka Ihenacho

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Imeela!!

    Daalụ maka etu ụnụ si sonyere anyị kamgbe ụbọchị iri na ise nke Jenụwarị 2020,dịka anyị wetere ụnụ ncheta etu agha Biafra si bie. Ka emesia, ya gaziere ụnụ oo.

  2. 'Kaduna Nzeogwu na-ebugharị ogbunigwe n'akpa ya mgbe ọ dị ndụ'

    Gere ihe ndị dị omimi nwanne Kaduna Nzeogwu kwuru maka ya n'ihe nkiri a.

    Video content

    Video caption: Biafra at 50": Kaduna Nzeogwu na-ebugharị ogbunigwe n'akpa ya mgbe ọ dị ndụ"
  3. Ndị ama ama ka na-ekwu maka agha Biafra

    Lekwa ihe ndị ama ama kwuru maka agha Biafra.

    Video content

    Video caption: Igbo Celebs: Ha achọrọ Biafra ka ọ bụ ha achọghị Biafra?
  4. Ụmụaka Biafra: Ihe ndị etobeghi ntoroọbịa hụru oge agha

    Gụo ihe ndi bu umuaka oge agha Biafra kwuru naka ya ebe a.

    Ụmụaka
  5. Etu m siri zọọ ndụ n'ụbọchị 'Asaba massacre' Obi Ilomechina Amuwa

    Obi Ilomechina Amuwa nke Asaba jiri anya mmiri cheta ndị niile egburu n'Asaba Massacre nke

    Jenụwary 15, 1970 mere ya afọ iri ise agha Biafra biri.

    Mana ọ bụkwa ụbọchị Okotba 7, n'afọ 1967 ka a kpọtara ndị ọgaranya n'Asaba, wee gbuo ha n'igwe.

    Obi Ilomechina Amuwa gwara BBC Igbo ihe anya ya hụrụ n'ụbọchị ahụ na etu o siri zọọ ndụ ya n'ụbọchị ahụ.

    https://www.bbc.com/igbo/afirika-51132551

    Asaba Massacre bụ mgbe e gburu ọtụtụ mmadụ n'ihi agha Biafra
  6. Ụmụnwaanyị hụrụ Biafra ekwuola ihe ha gabigara n'oge agha Biafra

    Ọtutụ ku nwa aka, ma ndị dị ime kọwara etu ụwa dị mgbe ahụ.

    Ha ncha na-asị na ha achọghị iji anya ahụ agha ọzọ.

    https://www.bbc.com/igbo/afirika-51127960

    Ihe ụmụnwaanyị gabigara n'oge agha Biafra
    Image caption: Ihe ụmụnwaanyị gabigara n'oge agha Biafra
  7. Ihe ndị mere Igbo ejighị Odumegwu Ojukwu, enyi Biafra egwu egwu

    Emeka Odumegwu Ojukwu

    Ndị ma ya kwuru na Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ onye tụnyere ọkwa ya, oge ya nakwa ego nna ya maka ọdịmma Igbo bido n' oge agha Biafra rue n'ọnwụ ya.

    Emeka bụ nwa a mụrụ n'obi ọgaranya n'abalị anọ nke ọnwa Novemba afọ 1933 n'Ugwu Awusa n'ebe a kpọrọ Zungeru dị na Niger steeti.

    Nna ya, Louis Odumegwu Ojukwu, onye Umudim, Nnewi, Anambara steeti bụ nnukwu ọgaranya ka ibe ya n'Afrịka.

    https://www.bbc.com/igbo/afirika-51065330

  8. Lee eserese na-egosi mpaghara ala Biafra na Naịjirịa

    Eserese Biafra
  9. 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra'

    Ikechukwu Kalu

    Broadcast Journalist BBC News Igbo

    Lee ihe ndị ji anya ha hụ agha Biafra nwere ikwu maka ihe ha gabigara.

    Video content

    Video caption: Biafra at 50: 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra'
  10. Lee aha ndị nwụrụ n'ihe a kpọrọ 'Asaba Massacre' n'afọ 1967

    Chris Okereke

    BBC Igbo

    Ị nụrụ maka mmadụ karịrị nari asaa a gbagburu n'Asaba n'afọ 1967?

    Ndịagha Naịjirịa kpọpụtara ndị mmadụ n'obodo ahụ, sị ndị nwaanyị kwụrụ n'akụkụ nakwa ndị nke nwoke.

    Ha ji mgbọ egbe wụkasịa ndị nke nwoke ahụ (akụkọ kwuru na ụmụaka dịcha ihe dị ka afọ 12 so na ndị a gbagburu).

    Ndị nwụrụ n'Asaba
    Image caption: Foto a na-egosi aha ndị niile nwụrụ n'Asaba Massacre'
  11. Lee ụfọdụ ndị ọcha so ndị Igbo lụọ agha Biafra

    Rolf Steiner

    Steiner bụ onye mba Jamini, so ndị Igbo lụọ agha Biafra n'afọ 1967 ruo 1970.

    N'oge agha a, o mechara si n'ọkwa Kọmpany Kọmanda rigoruo n'ọkwa Lt. Col.

    Ọ lụrụ agha a na-anaghị ego ọbụla, dịka Chinua Achebe si dee n'akwụkwọ ya bụ 'There was a Country'.

    Rolf Steiner
    Image caption: Rolf Steiner sobu na ndị agha ndị mba Frans a kpọrọ 'French Foreign Legion', tupu ọ bịa sonye ndị agha Biafra

    Taffy Williams:

    Williams bụ onye mba Wales sokwa lụọ agha Biafra.

    O mechara bụrụ 'Major' na ndịagha Biafra.

    Ọ bụ onye ọcha ikpeazụ lụrụ Biafra agha hapụrụ ha mgbe agha biri.

    Taffy Williams
    Image caption: Hugh 'Taffy' Williams natara ọzụzụ ya dịka onye agha na mba Saụt Afrịka.

    Jan Zumbach:

    Zumbach bụ onye mba Swizaland so lụọ agha Biafra.

    Ọ rụrụ dịka onye na-efe ụgbọelu.

    O so na ndị bidoro ngalaba a ma dịka Biafra Air Force mgbe ahụ.

    Jan Zumbach
    Image caption: Jan Zumbach bụ onye agha mba Poland tupu ọ bịa sonye ndịagha Biafra ka agha Mbaụwa nke abụọ kwụsịrị.

    Carl Gustaf von Rosen:

    Von Rosen bụ onye mba Swidin rụrụ dịka onye na-efe ụgbọelu.

    Carl Gustaf von Rosen:
    Image caption: Carl Gustaf von Rosen bụ onye tụnyere Ojukwu alo maka ihe a kpọrọ 'MiniCOIN',
  12. Taa bụ ụbọchị 15 nke ọnwa Jenụwarị ka agha Biafra biri n'afọ 1970

    Ojukwu
    Image caption: O meela afọ iri ise agha Biafra biri na mgbe Yakubu Gowon kwuru na "o nweghi onye meriri, e nweghi onye e meriri".
  13. Asi m kwuo, Agha Biafra ebibeghị- Onweka Onwenu

    Onyeka Onwenu/Facebook

    Ihe pụtara n'ọgbakọ Nzuko Ụmụnna mere maka ncheta Agha Biafra ka na-ewu.

    Otiegwu a ma ama bụ Onyeka Onwenu kwuru na iwe ihe mere ndị Igbo oge Biara ka na-enwe ya.

    O kwuru na ụta Agha Biafra adịghịrị ndị Igbo n'ihi na ọ bụ isi onwe ha ka ha na-azọ were gawa ọgụ.

    Ọ gara n'ihu taa Naijiria ụta maka agwa ha gbasara ndị Igbo ma tawa ndị Igbo ụta maka ihe Igbo na-agabiga.

    “Iwe Naijiria na-ewe m, Iwe Ndi Igbo na-ewe mana maka na onye a jụrụ anaghị ajụ.”

  14. Etu okporoko si bata Naịjirịa

    Okporokpo dị n'ofe Egusi

    Agha Biafra wetara nnukwu ihe mgbu, agụụ na ọnwụ nye ọtụtụ ndị Igbo. Mana ọ bụghịkwa naanị ihe ọghọm ka ya bụ agha wetara.

    Okporoko

    Otu ihe bara uru mmadụ nwere ike ikwu n'ọgụ Biafra wetara bụ azụ okporoko.

    Gụọ ya n'uju ebe a: https://www.bbc.com/igbo/afirika-51102881

  15. O meela afọ 50 a lụrụ agha Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme

    O bidoro site n'iweghara ọchịchị n'ike nke ụfọdụ ndị agha nke Chukwuma Nzeogwu mere ebe e gburu ụfọdụ ndị ọchịchị.

    Iweghara ọchịchị n'ike ọzọ mere ka ọnwa isii gachara nke Muritala Muhammed nọ n'isi ya ebe e gburu ọtụtụ ndị Igbo n'Ugwu Naịjirịa.

    Ha gbara ọsọ laa n'ala Igbo, ebe ha nọọ kwubie na ị gara onwe ha kara ha mma.

    Mana Goomentị Naịjirịa busoro ha agha dịka ha jụrụ inye ha nnwereonwe ha chọrọ.

    Mana ndị hụrụ agha ahụ na-ekwu ọzọ emela.

    Video content

    Video caption: Biafra 50 years after: O meela afọ 50 a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme
  16. Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji

    Video content

    This content only works in the UK.

  17. Lee etu esi kwanyere ndị nwụrụ n'agha Biafra ugwu ikpeazụ

    Video content

    Video caption: Etu e si kwanyere ndị nwụrụ n'agha Biafra uwgu nkeji abụọ

    Igwe mmadụ pụtara n'emume "Never Again" nke e kpokọbara na Legọs mere ya bụ ncheta.

    Ha gbachiri nkiti n'ime nkeji abụọ iji mee ncheta ma kwanyere ndị a uwgu.

  18. 'Biafra na-enye anyị ohere ihe nwereike ịbụ' - Ọkaikpe Nkemdilim Izuako

    Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu etinyela ọnụ na nweta Biafra.

    Otu n'ime ha bụ Ọkaikpe Nkemdilim Izuako.

    Lee okwu ya n'uju ebe a.

    Video content

    Video caption: 'Biafra na-enye anyị ohere ihe nwereike ịbụ' - Ọkaikpe Nkemdilim Izuako