Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Nchịkọta

  1. BBC na-eme nrụrịtaụka na steeti dị iche iche na Naịjirịa
  2. BBC Igbo emela na Imo, nke Abia bụ taa ebe nke Ebonyi na-abịa n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Febụwarị 2019
  3. Ndi ga-abịa: Alex Otti, Blessing Nwagba, Emeka Uwakolam, Joseph Nkoro na Okezie Ikpeazu

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Chiagozie Nwonwu

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Post update

    Chris Okereke bụ onye nchịkọta

    BBC Debate
  2. Blessing okwuchi nwagba - SDP

    Blessing Okwuchi Nwagba bụ ọkammụta n’ihe banyere mmekọ mmadụ na mmadu bụ nke Bekee kpọrọ “Sociologist”

    Ọ gara akwụkwọ na Mahadum Pọt Hakọt nakwa Legọs.

    O na-azọ ọkwa n’okpuru SDP

    Blessing okwuchi nwagba
  3. Chukwuemeka Uwakolam - Accord Party

    Emeka Uwakolam bụ ọkaikpe.

    Ọrụbụru ọrụ dịka osote onyeisi ndị ntoroọbịa PDP, nakwa onye ndụmọdu pụrụiche na ulọ omeiwu Naịjirịa.

    Ọ na-azọ ọchịchị n’okpuru pati Accord.

    Chukwuemeka Uwakolam
  4. Alex Otti –APGA

    Alex Otti bụ onye okachamara n’ihe metutara akụnaụba obodo, bụ nke Bekee kpọrọ “Economist”.

    Ọ bụbụ onyeisi ụlọakụ Diamond Bank Plc.

    Otti zọbụru ọchịchị n’okpuru APGA n’afọ 2014.Ọ ka na-azọkwa ọchịchị n’okpuru APGA.

    Otti
  5. Joseph Nkoro - YPP

    Nkọrọ bụ onye ojiegoachọego. Ọ gara akwụkwọ na mahadum Pọt Hakọt nakwa Nnamdị Azikiwe nke Awka.

    Ọ bụ ya bụ onye “not too young to run” so azọ ya bụ oche.

    Ọ na-azo ọchịchị n’okpuru pati YPP

    Nkoro
  6. Post update

    Dịka ọkwu ugbua, anyị nọzị nsọ. Lee obele ihe maka ndị anyị ga-ege ntị taa:

  7. Adịghị amaba ebe amaba o

    Ndị nchekwa zụrụ ka eme.

    Ha na-enyocha mmadụ ọfụma tụpụ ibanye.

    Ndrụrịta ụka BBC
  8. Ndị mmadụ na-edenye aha iji banye

    Ndị mmadụ na-edenye aha
    Ndị  na-edenye aha
  9. Anyị akwadola!

    Ndị otu anyị akwadola. Anyi na-echezi ndị mmadụ

    Nrụrịtaụka BBC
    Nrụrịtaụka BBC
  10. Ndị ga-etinye ọnụ n'okwu

    Ndị kwere nkwa na ha ga-abịa taa bụ Alex Otti nke APGA, Blessing Nwagba nke SDP, Emeka Uwakolam nke Accord na Joseph Nkoro nke YPP.

  11. Unu asala chị

    Anyị na-asị unu nnọọ n'akụkọ metụtara nrụrịta ụka BBC na-eme.

    Taa anyị nọ Abịa steeti, ebe ndị chọrọ ịbụrụ aka ga-achị steeti ahụ ga-agwa ndị Abịa ihe ha ji bịa.

    Ngwa ka anyị malite!

    Ndị nrụrịta ụka Abịa