Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Nchịkọta

  1. Ihe na-eme n' Anambara
  2. Ihe mere n' Imo
  3. Ihe na-eme n'Ebonyị
  4. Ka ụbọchị dị na Benue

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Uche Akolisa

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Ndi be anyị, ebe ka anyị na-apịachị nke taa.

    Chebiri anyị echi.

    Igbo biri kwa o! Ka ọ bọọnụ!

  2. Lekwa ihe ị ga-eme ma ịhụ ihe ekwesịghị

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyị Steeti bụ Loveth Ọdah kwuru na ka dị 'kajaad' n'ihe gbasara ntuliaka a na-abịa.

    Ọ nyere ndụmọdụ ka ndị mmadụ kpọọ ekwenti ha ma ha hụ ihe na-aga etu ekwesịghị.

    Gee ihe o kwuru n'uju:

    Video content

    Video caption: BBC Nigeria 2019: Etu ndị uweojii n'Ebonyi steeti si akwado maka ntuliaka
  3. Ndị Plateau na-eche ka chi Febụwarị 16 foo

    Ntuliaka ga-eme n'abalị 16 nke ọnwa Febụwarị na-anọ ndị Plateau steeti ọkụ n'ọbi.

    Akụkọ onye ntaakụkọ BBC nọ na Plateau wetara kwụrụ n'ụfọdụ agaala njem ọtụtụ kilomịta rute ebe ha kwesịrị ịnọ mee ntuliaka, chere eche.

    Abụbakar Shettima
    Image caption: Abụbakar Shettima, onye dị afọ iri isii n na otu ewerela ọnọdụ n'ebe o kwesịrị ịtụ vootu
  4. Ihe onyeisiala Buhari gwara ụmụ Naijiria n'abali a

    Onyeisiala Muhammadu Buhari gwara ụmụ Naijiria n'abali a n' igwe ụlọọrụ ntaakụkọ NTA.

    Ọ nọrọ ebe ahụ gụpụtara ihe ndị ọchịchị ya megara n' ọrụ mmepe obodo, ;okporoụzọ, okporoụgbọ oloko, nchekwa obodo na ibu agha megide mbụ.

    O kwuru ka onye ọbụla buru ọganihu ọrụ ndị a n'obi dịka ntuliaka na-abịa.

    Buhari dụrụ ndị ntoroọbịa ọdụ ka ha ekwela ka ndị ndọrọndọọ ọchịchị jiri ha gbaa okwe na ntuliaka a.

    Mana aka chịbụrụ Ekiti bụ Ayo Fayose kwuru n'ozi Buhari ziri bụ ozi onyeisala na-apụ apụ.

    Muhammadu Buhari
    Image caption: Onyeisiala Muhammadu Buhari gwara ndị ntorobịa ha ekwela ka ndị ndọrọndọọ ọchịchị jiri ha gbaa okwe na ntuliaka a.
    View more on twitter
  5. Aka aja aja, ọnụ mmanụ mmanụ

    Ọ bụghị naanị ọrụ,ọrụ, ogbu opi na-eficha imi.

    Dịka ndị na-arụ ọrụ metụtara ntuliaka na-arụ ọrụ ha, arụkata, atụọ ndụ mmadụ. E nwere ndị na-ere ihe ọrịrị na ọṅụṅụ na nso ụfọdụ ụlọrọrụ ndị Inec nọ ne be di iche iche

    Nwaanyị abacha
    Image caption: Ndi mmadu na-enweta onwe na nke nwaanyị abacha nọ nsọ ụlọọrụ Inec n'Ọka, Anambara steeti
    Nwaanyị abacha n'ụlọọrụ Inec n'Owere, isiobodo Imo steeti
    Image caption: Nwaanyị abacha n'ụlọọrụ Inec n'Owere, isiobodo Imo steeti
    Nwaanyị na-ere nrị na nsọ ụlọọrụ Inec na Benue steeti
    Image caption: Nwaanyị a na-ere nrị na nsọ ụlọọrụ Inec na Kano a kpọrọ, 'Mama Amina' kemgbe afọ 1983(afọ 36 gara aga sị na ya na-aka ere ahịa oge ntuliaka
  6. Na Taraba, ndị uweojii sị na 'ọdeshi'

    Ndị uweojii n'isi ụlọọrụ
    Image caption: Onyeisi ndị uweojii na -anara mgbucha n'isi ụlọọrụ ha dị na Jalingo
    Ndị uweojii n'isi ụlọọrụ
    Image caption: Ndị uweojii n'isi ụlọọrụ ha na Jalingo

    Na Taraba steeti ndị ọrụ ntuliaka ga-eme nabalị abụọ na-abia metụtara, ọkachasị ndị uweojii, adịla njikere.

    Ndị uweojii mere mmegharị ahụ iji mee ka ọbara ha dị ọkụ.

    Inec ,ngalaba nke Taraba kwuru na ha ebughachila akwụkwọ ntuliaka 'PVC' ndị nwe ha abịaghị were dị puku iri anọ na atọ, narị isii na irri abụọ na isii n'isis ụlọrụ ha dị n'Abuja maka ibuga ya ụlọakụ etiti ga-nye na-e mewa ntuliaka ọzọ.

    Ọnụ na-ekwuru Inec na steeti ahụ bụ Fabian Yame kwụkwara na n'ime mmadụ dị 1,777,105 tinyere aha ha maka inweta akwụkwọ ntuliaka, naanị mmadụ dị 1,733,479 werela nke ha.

    Ọnụ na-ekwuru Inec na Taraba steeti ahụ bụ Fabian Yame
    Image caption: Ọnụ na-ekwuru Inec na Taraba steeti ahụ bụ Fabian Yame kwuru na ha ebuhala PVC ndị eweghị n'isis ụlọọrụ n'Abuja
  7. Ndị Benue wa ajị n'ume

    Nkwado ntuiliaka na Benue kpụ ọkụ n'ọnụ, jiri mma n'aka.

    Ndị uweojii,ndị na-agbanyụ ọkụ, Inec na ndị ọrụ metutara ntuliaka sị n'ụche ha dị ya.

    Ndị uweojii dịka ha na-akwado maka ntuliaka
    Image caption: Ndị uweojii dịka ha na-akwado maka ntuliaka
    Ụlọọrụ ndị na-agbanyụ ọkụ
    Image caption: Ụlọọrụ ndị na-agbanyụ ọkụ sị na ha na-eke nchụcha maka adịghị a ma ama.
    Isi ụlọọrụ Inec na Makọdị, Benue steeti
    Onye ọrụ Inec na-ahazị akọrọngwa ntuliaka
    Image caption: Onye ọrụ Inec na-ahazị akọrọngwa ntuliaka na Makọdị, Isiobodo Benue
  8. Ndị Kano anaghị achịkwa

    Ndị Kano steeti ejighịkwa ntuliaka ga-eme abalị abụọ na-abịa eme ihe ọchị.

    Ụfọdụ gara n'ọnọdụ ebe a ga-eme ntuliaka ileta ma aha ha adịkwa n'akwụkwọ ntuliaaka.

    Ndị ọrụ Inec na-ejikerekwa n'ike n'ike dịka akọrọngwa a ga-eji mee ntuliaka ruterela ụlọọrụ ha.

    Ndị ga-atụ vootu na-ele ma aha ha adịkwa n'akwụkwọ na Kano steeti
    Image caption: Ndị ga-atụ vootu na-ele ma aha ha adịkwa n'akwụkwọ na Kano steeti
    Ndị ga-atụ vootu na-ele ma aha ha adịkwa n'akwụkwọ na Kano steeti
    Image caption: Ndị ga-atụ vootu na-ele ma aha ha adịkwa n'akwụkwọ na Kano steeti
    Akọrọngwa a ga-eji tụọ vootu na Kano
    Image caption: Akọrọngwa a ga-eji tụọ vootu na Kano
  9. Ndị uweojii Ebọnyị sị na ha kwụ gidigbaa

    Ebe niile Ebonyị steeti na-ede jiji abalị abụọ tupu ntuliaka ọkwa onyeisiala dịka ndị ọrụ ha metụtara ntụliaka na-ejikere maka Febụwarị 16

    Inec na ndi oru nchekwa dị iche iche nwere ogbako n'ulooru ha taa bụ Tọọzde n'Abakiliki.

    Ogbako ahụ nyere ọhere irutuaka n'ebe nakwa uzo ogbaghara nwere ike idaputa na ntuliaka nke nozi n'imi n'anya.

    Ha dorọwara aka na nti ka ndi mmadu ghara ino ebe a turu vootu na-aru uka maobu gbaa ama ihe ga-eme ka a mara onye ha kwunyeere.

    Ụgbọala ngwongworo buu akọrọngwa ntuliaka
    Image caption: Ụgbọala ngwongworo bubatara akọrọngwa ntuliaka n'ogige Inec dị n'Abakaliki
    Ndị ọrụ na-ahụ ka o si aga na ntuliaka
    Image caption: Ndị ọrụ na-ahụ ka o si aga na ntuliaka
    Akọrọngwa e ji eme ntuliaka
    Image caption: Akọrọngwa e ji eme ntuliaka e busara n'ụlọọrụ Inec n'Abakaliki
    Inec na ndị ọrụ nchekwa
    Image caption: Ọgbakọ Inec na ndị ọrụ nchekwa dị iche iche nwere n'Abakaliki
  10. Imo na-aghọrọ ọkụ

    Ndị ọrụ ịhụ ka o si aga
    Image caption: Ndị ọrụ ịhụ ka o si aga ebe ha na-ewere akọrọngwa ha ga-eji rụọ ọrụ n'Inec Owere
    Ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ
    Image caption: Ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ n'Owere

    Ndị ọrụ ha metụtara ntuliaka dịka ndị ọrụ ịhụ ka o si aga, ndị uweojii na ntị ọrụ nchekwa, ndị ntakụkọ awuchiela n' Owere, isiobodo Imo Steeti.

    Akọrọngwa dị bụ ahụghị ogiri ma e teghị ofe na ntuliaka nke a kpọrọ 'sensitive materials' na bekee ka bụkwa ihe ahụbeghị anya n'Imo. N'ụlọakụ etiti,'Central Bank of Nigeria' ngalaba nke Owere, ndị ntaakụkọ nakwa ndị na-anọchite anya otu pati dị iche iche ahụbeghị ihe ntụliaka a anya.

    Otu onye na-arụ ọrụ n' Inec sị ka anyi gharị itinye aha gwara BBC Igbo na ihe ji nkịta ọnwụ esighi ha n'aka.

    O kwuru na ndị isi ha nọ n'ime ụlọọrụ CBN ahụ n' ihe gara nke ọma.

    Akọrọngwa a ga-eji mee ntuliaka
    Image caption: Akọrọngwa a ga-eji mee ntuliaka
  11. Inec Anambara si na ha kwụ chịm

    Ụlọọrụ Inec Oka, Anambara steeti gbara ọkụ
    Image caption: Ụlọọrụ Inec Oka, Anambara steeti gbara ọkụ ụbọchị Tuuzde

    N'agbanyeghi oku ogbugba nke gbapiara akarangwaoru ndi ulooru Inec n' Oka ụbọchị Tuzde,onyeisi ulooru Inec nke Anambara steeti bụ Nwachukwu Orji kwuru na egwu adighi, na ihe niile ga-aga ka e si choo ya.

    Orji kọwara na Inec Anambara enwetazugo ufodu akarangwaoru ndi ahu oku gbapiara site na ihe kariri Steeti asaa n'ala Naijiria.

    O duru ndi niile tozuru itu vootu na Steeti Anambara ka ha jikere maka nke n'ihi na agha akara aka anaghị eri ngwọrọ.

    Nwachukwu Orji
    Image caption: Nwachukwu Orji, onyeisi, Inec,Anambara steeti
  12. Nigeria Elections 2019: Ka o si aga na nkwado ntuliaka

    A gbara ogige ndị uweojii ọkụ n'Anambara

    Njikere maka ntuliaka a ga-eme ụbọchị Satọde, Febụwari 16, afọ bụ okwu akpụ n'ọnụ.

    Anyị ge-ebido site na iwetara gị akụkọ ihe mere n'ụtụtụ taa n'Anambra steeti ebe ọkụ gbara ogige ndị uweojii.

    Kọmishọna ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed, gwara BBC na ụlọọrụ ndị uweojii ahụ dị n'Ajali,n'okpuruọchịchị Orumba- Nọrth, gbara ọkụ n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Tọọzde.

    O kwukwara na o nweghi onye uweojii nwụrụ na ya bụ ọkụ nke ndị omekome kpanyere

    Haruna kwuru na-eme nyocha gbasara ya.

    Ụlọọrụ ndị uweojii na Ajali nke ọkụ gbara...
    Image caption: Ụlọọrụ ndị uweojii na Ajali nke ọkụ gbara...