Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Uche Akolisa

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Ndewonu!

    Ọ bụ ebe ka anyị ga-achịsa ọwa.

    Ụbọchị nta, a chụọ n'owere nchị.

    Ka ọ dị echi!

  2. Buhari awuchiela Katsina maka ntuliaka echi

    Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari azọchiela na steeti ya bụ Katsina maka ntuliaka ụbọchị Satọde.

    View more on twitter
  3. Oru mechiri mana ahịa zụrụ n'Abia

    Ụlọọrụ mechichara emechi dịka gọọmenti nyere Fraide maka ezumike.

    Mana ahịa zụụ dịka ọtụ mmadụ gara ịzụ ihe ga-ga-eri ụbọchị ntuliaka na kwa ngwụcha izuụka.

    Ụfọdụ nọkwa na njem ị ga-ebe ha ga-anọ mee ntuliaka.

    Ọtụtụ ndị na-aere ahịa ha na onye ntakụkọ BBC Igbo nere mkparịtaụka kwuru na ha ga-aga me ntulika.

    Ụlọọụ Tọgbọ Chakoo
    BBC
    Image caption: Ọdụgbọala
    Abia Tower
    Image caption: 'Abia Tower' dị na Okporoụzọ si Umuahia gawa Bende
    Ahịa na-ekwo
  4. Gaa tụọ vootu gị, egwu atụla gị- Buhari

    Muhammadu Buhari

    Onyeisiala Muhammadu Buhari gbara ụmụ Naijiria ume ka ha pụta n’igwe tụnyere onye nakwa otu pati masiri ha akwụkwọ na ntuliaka ọkwa onyeisiala ga-eme ụbọchị Satode.

    Buhari kwere nkwa na ndị ọrụ nchekwa ga-anọ ihu inye onye ọbụla nchekwa zuru oke.

    View more on youtube
  5. Ọ dị oke mkpa na Igbo niile tụrụ vootu echi - Nnia Nwodo

    Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo kpọrọ oku ka Ndigbo pụta n'igwe mee ntuliaka echi.

    N'okwu ya, onye ọ bụla gbara nkịtị na ntuliaka a, abụghịzị mmadụ.

    Ọ kọwara na ọ nweghị ihe ka mkpa ka ọnọdụ Ndigbo na Naijiria, ịhi n ịtụ vootu ga-enye Ndigbo ohere ịhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara.

    Gee ihe o kwuru n'ụju:

    Video content

    Video caption: Nnia Nwodo: O nweghị ọchịchị megburu Igbo ka ugbua
  6. Inec Enugwu ekesasịala akọrọngwa vootu.

    Ndị ọrụ Inec
    Onye ọrụ Inec ka ọ na-ahazị akọrọngwa

    Ụlọọrụ Enugwu Sentralụ ebe Inec jiri mere ọnọdụ ikesa ngwaọrụ maka vootu echi dịka ebe a na-azụ ahịa n'ihi na ọtụtụ ụgbọala na ndịọrụ Inec nọ ebe ahụ na- eburu ngwaọrụ.

    BBC hụkwara ka a na atinye ihe dịka ballot papers, ink, polling booth, nakwa ihe ndị ọzọ na ụgbala dịka ward obụla ma ọbụ polling unit siri di.

    Onye ọrụ Inec ka ọ na-ahazị akọrọngwa

    Onyeisi Inec na ya bụ Enugwu-Sentral jụrụ ikwu okwu na ihe onyonyo mana ọkọwara anyị na Inec adịla nkwadebe n'Enugwu, ma kwo na ọ bụ na nderi uchichi tata, oge ọ ga akụ ihe dịka elekere iri na abụọ ka ha ga ekesa 'Card reader' na 'result sheets.'

    Ọtụtụ ndị Inec nọkwa na-agụ akọrọngwa ahụ ọnụ tupu ha ekesaa ya.

    Ndị ọkwọụgbọala mkpata ego karịrị iri ise juputakwara ikesa akọrọngwa ntuliaka.

    Ọtụtụ nmadụ amalitela njem ịla obodo ha gaa tụọ vote ebe ụfọdụ kwajuru nri n'ụlọ ha maka echi. Lee ka ndị sara BBC ajụjụ siri kọwaa nkwado na njem ha.

    Ndị ọkwọụgbọala sọro ekesa akọrọngwa ntuliaka
  7. Inec Ebonyị adịla njikere maka echi

    Ndị ọrụ Inec na-ahazi akọrọngwaọrụ

    N'Ebonyi steeti, akọrọngwa niile aga eji mee ntuliaka ụbọchị Satode nọzi n'okpuruochichi goomenti niile dị n'Ebonyi steeti.

    Onye ọrụ ntuliaka bụ Elizabeth Nweze kwuru na ya na ndi oru ya na-ahazizi ya bu akọrọngwa ka ha ga-esi buga ha na woọdu 14 di na ya bu okpuruochichi goomenti.

    Ndị nnochiteanya pati ndorondoro ọchịchị

    Nweze gara n'ihu kwuo na akurungwa niile ahu ga-erute na wodu ha taa bụ Fraide.

    BBC Igbo huru ndi oru nchekwa, ndi nnochite anya pati ndorondoro nakwa ndi oru ndi ozo ka ha nọ na-ahazi ya bu akọrọngwa ntuliaka.

    Ndị ọrụ Inec
  8. N'Anambara, Ahịa Eke Ọka na-ekwo ekwo

    Ụmụnwaanyị ọka kwuru na ha na-azụ ahịa iji zụta ngwa nrị bụ ndị emefuru mgbe adọtịrị ntuliaka n'izuụka gara aga.

    Tomato
    Mba ji mba ji akpọsara n'ahịa
    Nwaanyị gara ahịa
  9. Nwaanyị na-ere fịọfịọ sị na ọ ga-atụ vootu echi.

    Otu nwaanyị na-ere fịọfịọ n'akụkụ ụlọọrụ Inec ekwuola na ya ga-apụta ịtụ vootu echi n'agbanyeghị na ọ bụ onye na-ebugharị nrị ọ na-ere.

    Nwaanyị na-ere fịọfịọ
  10. Eserese na-egosi etu pati dị icheiche siri kesa Naịjirịa

    Eserese na-egosi patị ndị nwe oke na Naịjirịa.
  11. N'Imo , ụfọdụ ndị mmadụ chọrọ ịma ma a gụnyere ha na ndị ọrụ ngo Inec

    Ndị chọrọ iso Inec rụọ ọrụ dịkwa ndị Bekee kpọrọ ad hoc staff nọ ụlọ ọrụ gọọmenti n'okpuru ọchịchị Mbaitoli ugbua.

    Ọtụtụ n'ime ha bịara ịma ma aha ha osokwa n'akwụkwọ ndụ Inec.

    Otu onye BBC gbara ajụjụ ọnụ sị na ya hụrụ aha ya ma dịkwa njikere ịrụ ya bụ ọrụ.

    Ndị na-achọ aha ha
    Aha ndị nwereike ị bụ ndịọrụ enyemaka Inec
    Ndị ọrụ enyemaka Inec

    Akọrọgnwa ntuliaka erutela ọkpuruọchịchị Mbaitolu mana ekweghị ebudata ya n'ụgbọ ndị ọdị n'ime ya.

    Isi ụlọọrụ ọkpuru Ọchịchị Mbaitolu
  12. Ndị mmadụ na-eme njem ị ga tụ vootu n'ebe ha denyere aha

    Ụgbọala njem
  13. INEC ewepụtala ọnụọgụgụ gbasara PVC na Naịjirịa

    Ọnụọgụgụ ndị nwere ikike ịme ntuliaka echi

    Ngalaba Inec ewepụtala ọnụọgụgụ na-egosi ndị denyere aha maka PVC nakwa ndị natara nke ha dịka a na-akwado ịme ntuliaka echi bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Febụwarị.

    Ọ bụ site n'akara Twitter ha ka Inec siri zipu ya bụ ozi.

    Ọnụọgụgụ nke Inec wepụtara
  14. Akọrọngwa INEC nke ntuliaka sineti

    Akọrọngwa ndị a na-aga Mbaitolu nke Imo steeti

    Ngwaọrụ Inec
  15. Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ha agaghị esonye na ntuliaka nke echi

    Lee ihe mere ha jiri nwe mkpebi a.

    Video content

    Video caption: Nigeria Election 2019: 'Agaghị m atụ vootu makana atụọla ya atụọ'
  16. Ndewo nu Igbo ndị ọma.

    Anyị amalitela akụkọ gbasara ntuliaka ka o si aga n'ala Igbo na ebe ndị ọzọ