Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Chimamaka Ihenacho na Uche Akolisa

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Gere akụkọ ị kwesịrị ịma n'otu nkeji

    Video content

    This content only works in the UK.

  2. Mba UK na-akwado mmeri Buhari

    Minista na-ahụ maka ihe banyere mpaghara Afịrịka na mba Brịten bụ Harriet Baldwin kelere Onyeisiala Buhari maka mmeri o nwetere na ntuliaka e mere na Naịjirịa n’ụbọchị Satọde gara aga.

    Baldwin kwuru na ọnụọgụgụ Inec wepụtara na ọ bụ ihe e nwetere na ya bụ ntuliaka, bụ nke dịka nke e nwetere n’atụmatụ Bekee kpọrọ “Parrallel Vote Tabulation”.

    Nke a pụtara na mba Briten na-akwado ọnụọgụgụ vootu a ma na-asị ndị Naịjirịa ka ha nabata ya makana ọ kwụ ọtọ.

    Ndị na-atụ vootu

    Mba Briten kwukwara na obi adịghi ha mma maka ndị isi ha lara na ntuliaka a, ma na-asị ndị nwe ha jide obi ha aka.

    N'agbanyeghi nke a, Mba Briten kwuru na uche ha dị n'okwu ọtụtụ mmadu na-ekwu na usoro e ji mee ya bụ ntuliaka adịghị etu ziri ezi.

    Ha sị ka ndị a jiri usoro udo chụba ewu a ha si gbapụru n’ọba.

  3. Ebee ka ndị APC Anambara gara n'ụdịrị ụbọchị a?

    Ụnyaahụ, BBC Igbo gara n'ulo pati APC nọ na Steeti Anambara, ịji mara ka ndị otu ya bụ Pati sịrị enwe ọṅụ maka mmeri Pati ha meriri na ntuliaka afọ 2019, ọ chọpụtara na ebe niile dị ka ebe a gbara ọsọ agha, enweghị ihe ụzụ maọbụ mmemme na-eme ebe ahụ.

    Ụlọ APC Anambara
  4. Unu asaala chi?

    Anyị na-asị unu nno n'ụtụtụ ụbọchi ikpeazụ nke ọnwa Febụwarị 2019.

  5. Atiku sị na ya anabataghị mmeri Buhari meriri ya

    N'okwu ọ gwara ndi ntaakuko taa, onye zọrọ ọchịchi n'okpuru PDP sị na nrụrụaka karịrị n'ime ntuliaka emere na Satọde gara aga.

    View more on facebook
  6. Peter Obi, Uche Secondus na ndi isi PDP ndi ọzọ awụchiela ebe Atiku ga-agwa ndị ntaakụkọ okwu

    Secondus
    Peter Obi
  7. Atiku ga-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'elekere anọ

    Site n'ozi Austin Akobundu bụ odeakwụkwọ ndị na-ahazi achụmntavootu Atiku Abubakar kesara, ọ ga-agwa ọha okwu taa.

    Ọ ga-ekwu okwu n'ihu ndị ntaakụkọ mbaụwa na Musa Yar'Adua Center dị n'Abuja n'elekere anọ nke taa.

    Atiku
  8. A mụọla Buhari ọzọ

    Nwunye otu nwoke aha ya bụ Ahmed Dasuki, mụrụ nwa n'ụtụtụ, ha gụrụ ya "Buhari" maka ọṅụ mmeri onyeisiala.

    Buhari a mụrụ ọhụrụ
  9. Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ Buhari

    Ndị dịka Ebuka Obi-Uchendu tinyere ọnụ n'okwu gbasara atụmatụ ọhụrụ Buhari ga-ewebata n'ọchịchị agba abụọ ya.

    Ebe ụfọdụ chọrọ ịma etu ọ ga-esi kpọpụta ndị mmaọ̄ụ n'ụbịam, ndị ọzọ chọrọ ka ọ chụpụ ụfọdụ ndị so ya rụọ ọrụ n'agba nke mbụ ya.

    View more on twitter

    Ebe ọ gbasara egwuregwu, ndị mmadụ chọrọ ka o bido n'oge tinye ya anya.

    View more on twitter
    View more on twitter
    View more on twitter
    View more on twitter
  10. Ndị n'ọchị, ndị n'akwa

    Kedụ ebe ị kwụ akwụ?

    Eserese Buhari na Atiku
  11. Muhammadu Buhari anatala asambodo ọchịchị ya

    Onyeisiala Muhammadu Buhari gara binyeaka n'akwụkwọ ikike ya.

    Ndị nọ n'ime ụlọ ahụ nọ na-eti "sai baba" ka o bilitere ịnara asambodo ya.

    Buhari

    Dịka iwu nnata asambodo a si kwuo, o kwuru okwu nnabata.

    O kelere Chineke maka ime ka ọ dị ndụ hụ ụbọchị a.

    O kwuru na ọnụụzọ gọọmentị ya ghere oghe, na ọ na-atụ anya iwulite mba Naịjirịa karịa ka ọ dị ugbua.

    O kelere ndị tụnyeere ya vootu nakwa ndị nyere aka hụ na achụmnta vootu ya gara sịrịrị werere.

  12. Yemi Osinbajo anatala asambodo ikike ya

    Yakubu Mahmood bu ụzọ nye osote onyeisiala Yemi Osinbajo asambodo nke ya ka o binye aka, tupu o nye onyeisiala Muhammadu Buhari nke ya.

    Ka Osinbajo bilitere ịnata nke ya, nwunye sochiri ya azụ, ebe ndị mmadụ malitere ịtụ ụzụ, ịgụ egwu nakwa ịkụ aka.

    OSINBAJO
  13. Buhari na-akwado ịnata asambodo ikike ọchịchị ya n'Abuja

    Sonye ebe a ka ị hụ usoro ya.

    Onyeisi ụlọorụ INEC bụ Yakubu Mahmood na-enye ha ya bụ asambodo.

    View more on facebook
  14. Etu ndị mmadụ si nabata mpụtara ntuliaka

    Chimezie Ucheagbo

    BBC Igbo, Lagos

    Ndị nọ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ na-ekwu etu ha si hụ mmeri Buhari.

    Chidi Nlemchi bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, batakwara na BBC Igbo ịkọwa otu ihe maọbụ abụọ gbasara mpụtara ntuliaka a.

    View more on facebook
  15. Agaara m akpọ Buhari ma ọ bụrụ na o meriri n'ụzọ ziri ezi - Atiku

    Atiku Abubakar zọrọ ọchịchị ọkwa onyeisiala n'okpuru PDP, ekwuola na ntuliaka a agaghị n'anya ọma.

    O kwuru na ọ bụ ya gbochiri ya ịkpọ Onyeisiala Muhammadu Buhari n'ekwentị, bunye ya ụkpa ekele maka mmeri o meriri.

    Atiku Abubakar

    N'ihi nke a, o kwuru na ọ nabataghị mpụtara ntuliaka a, na ọ ga-agba ha akwụkwọ n'ụlọikpe.

    View more on facebook
  16. Ndịisiala Ghana, Niger na Senegal na-ekele Buhari

    N'ozi Femi Adesina bụ ọnye ndụmọdụ pụrụiche nye onyeisiala Muhammadu Buhari zisara, o kwuru na oyeisiala Nana Koffi-Addo nke mba Ghana, Mahamadou issoufou nke mba Niger, na Macky Sall nke Senegal, bunyere Buhari ụkpa ekele maka mmeri ya.

    View more on facebook
  17. Onyeisiala mba Kenya ekeleela Buhari 'nwanne ya nwoke'

    Buhari na Kenyatta

    Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta, ebunyela Buhari ụkpa ekele maka ịzọta ọkwa onyeisiala ọzọ.

    Kenyatta kpọrọ ya “nwanne m nwoke”, kwuru sị na mmeri Buhari “gosiri ntụkwasịobi na okwukwe ndị Naịjiria nwere n’ikike ya ibugo Naịjirịa n’ogo ọganiihu”.

    Kenyatta kwuru na Naịjirịa na mba Kenya nwere ọtụtụ ihe dị mma jikọtara ha, na ọ na-atụ anya na ha ka ga-ejikọ aka ọnụ n’ịrụkọ ọrụ, nke ga-amịpụta ezi mkpụrụ nye mba abụọ a.

  18. Ihe Buhari kwuru n'okwu nnabata ya

    Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela ọnụ na mmeri o nwetara na ntuliaka 2019 nke ga-enye ya ohere ịbụ onyesiala ruo afọ 2023.

    Buhari

    O kelere Chukwu maka inye ya ndụ iji hụ ka pati ya bụ APC meriri na ntuliaka ahụ, ma gakwa n'ihu kelee ndị Naịjirịa tunyeere ya na ntuliaka ahụ.

    Buhari kpọpụtara aha Bola Tinubu, Adams Oshiomhole, Rotimi Amaechi na ndi ọzọ niile aka ha dị na mmeri ya.

    Ọ sị na n’agbanyeghi na e mere ntuliaka ọfụma na n'udo ụbọchị Satọde, ndị ọchọ okwu wụnyere aja na garị n’ụfọdụ steeti, ma kwuo na ndị nchekwa ga-anwụchị ndị aka ha dị na ya.

    Buhari sị na obi adịghị ya mma maka ndị ntuliaka a tara isi ha, nke mere na ndị nchekwa ga-etinye anya hụ na e chekwara vootu ndị mmadụ na ntuliaka na-abịa.

    O kelere ndị nchekwa maka ọrụ ha rụrụ, ma sị ndị nkwado ya ka ha ghara iji mmeri a mee ndị mmadụ akaja.

    Buhari gara n'ihu kwe nkwa na ọ ga-agbalị karịa etu o mere n'agba nke mbụ, n’ihe gbasara nchekwa, igbanwe ebe akụnaụba obodo si apụta, nakwa ibuso mpụ na nrụrụaka agha.

  19. Gere akụkọ gbasara mmeri Buhari nakwa ihe na-aga na mbaụwa n'ime otu nkeji

    Video content

    This content only works in the UK.

  20. Eunice Atuejide na-aba mba maka mmeri Buhari

    "Ọ na-atụ n'anya ma na-ewe m iwe, mana isi na-ebu m makana anyị mere ihe niile anyị kwesịrị iji merie ntuliaka ma zighachị nwoke ahụ (Buharị) Daura." - Eunice Atuejide, onye zọbụrụ ọchịchị n'okpuru National Interest Party.

    View more on facebook