Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Nchịkọta

  1. Nnabata Ohaneze
  2. Eduola Yemi Osinbajo iyi ọrụ
  3. Eduola Muhammadu Buhari iyi ọrụ
  4. Gọvanọ Umahi aṅụọla iyi ọrụ
  5. Gọvanọ Ugwuanyi anọla iyi ọrụ

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Chioma Obianinwa na Chimamaka Ihenacho

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Oge eruola mgbe anyị ga-awụ ka izaga

    Ka ọ dịnụ mgbe ọzọ

    Daalụ maka isonye anyị taata.

    Ọ bụ ebe a ka anyi ga-awụsa ọwa njem a.

    Chetakwanu na anyị ka ga na-ewetara unu nke pụrụiche n'ihu.

    Yagazie!

    Oge eruola mgbe anyị ga-awụ ka izaga
    Image caption: Oge eruola mgbe anyị ga-awụ ka izaga
  2. Lee etu Ifeanyi Okowa si ṅụọ iyi ọrụ na Delta steeti

    Gọvanọ Okowa ga-atụkwasị afọ anọ n'elu anọ ọ chịrịla.

    View more on twitter
  3. Ihe mere n'ọgbọ nnyefe ọchịchị nke Abịa steeti

    Ikechukwu Kalu

    Broadcast Journalist BBC News Igbo

    Otiegwu a ma dịka Ruffcoin mere ihe e ji mara ya, ebe otu nwoke kwụ n'elu bọọlụ ka a na-agụ abụ ala.

    Ị ga-emenwu ya?

    Otiegwu a ma dịka Ruffcoin Nwaaba
    Nwoke kwụ n'elu bọọlụ
  4. Yakubu Dogara, Bukola Saraki so bịa ebe Buhari nọ ṅụọ iyi ọrụ

    Buhari na ndi isi ụlọomeiwu
  5. Nkwa Buhari kwere n'afọ 2015

    Ụfọdụ ndị sị na ha ahụghị azụ nkwa a na ndị ọzọ.

    Buhari
  6. Ụmụnwaanyị Uburu dị n'Ebonyi steeti ji nkwa bịa n'ọgbọ

    Umu nwannyi Uburu
  7. Gọvanọ Ihedioha na-eme nyocha 'parade'

    Gọvanọ Ihedioha
  8. Ndị chịrị Naịjirịa kemgbe 1999

    Ndị chịrị Naịjirịa
  9. Eduola Emeka Ihedioha n'iyi ọrụ n'Owere

    Ihedioha ga-achị Imo steeti site taa ruo afọ 2023, mgbe a ga-eme ntuliaka ọzọ.

    Emeka Ihedioha
    Imo steeti
    Imo steeti
  10. Gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyichukwu Ugwuanyi na-ezi ndị steeti ya ozi mbụ

    Gọvanọ Ugwuanyi kwere ndị Enugwu nkwa na ya ga-ahụ na-emepere steeti ahụ site na-ịrụ ụzọ aghara aghara nakwa ihe ndị ọzọ ga-eme ka obodo mepee.

    Ọ sịkwa na ihe Bekee kpọrọ "Local Government Autonomy" na-amasị ya, nke mere ya ga-akwado ya bụ atụmatụ.

    Ihe ndi ọzọ pụtara na nkwa ya bụ ụlọ ikpe akpọrọ "Multi-Door Court" na Bekee, nke ọ sị ga-enye aka hu na ikpe gara ọsịsọ.

    Ọzọ bụ ihu na enyere ndi ntoroọbịa ikike iji baa uru.

    Gọvanọ Ugwuanyi
  11. Lee ndị chịrịla Naịjiria kemgbe ọchịchị onyekwuoucheya malitere n'afọ 1999

    Video content

    Video caption: Nigeria Elections 2019: Kedụ ihe i ji echeta OBJ, Yar'adua, GEJ na Buhari?
  12. Eduola Gọvanọ Umahi iyi ọrụ n'Ebonyi

    Gọvanọ Umahi na osote ya bụ Eric Kelechi Igwe na nwunye ha.

    Umahi
    Umahi
    Image caption: Nke a ga-eme ya ugboro abụọ Umahi na-aṅụ iyi ọrụ ịchị Ebonyi steeti
    Gov Umahi na osote ya bụ Eric Kelechi Igwe
    Umahi na nwunye ya
    Image caption: Nke a ga-eme ya ugboro abụọ Umahi ga-achị Ebonyi steeti
  13. N'Enugwu, ndị uweojii na-eme emume Bekee kpọrọ 'parade' iji kwanyere aka na-achị steeti ahụ ugwu.

    Parade enugwu
    Parade Enugwu
    parade
    Image caption: Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyị Ugwuanyi na-elele ndị Uweojii mere ya emume 'parade'
  14. Buhari o mere "inaugural speech" taa?

    Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ihe kpatara Onyeisiala Buhari ji ghara ikwu okwu nraranye a kpọrọ "inaugural speech" ka e duchara ya iyi ọrụ.

    View more on twitter

    Mana ọ bụ ihe o kwesịrị ime, ọkachasị etu a ọ na-abanye ọchịchị nke agba nke abụọ?

    @iam_iseoluwa_ kwuru na o nwereike iso n'ihe ọ ga-eme n'ụbọchị Juun 12.

    View more on twitter
  15. Ọkaikpe ukwu nke Ebonyi steeti bụ A.N. Nwankwo na-aga ebe ọ ga-edu Gọvanọ Umahi n'iyi ọrụ

    Ọkaikpe ukwu Ebonyi
  16. Ndị Eze nọ n'ọgbọ n'Ebonyi ebe a na-eche ka Gọvanọ Umahi bịa ṅụọ iyi

    Ndị Eze Ebonyi