Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Nchịkọta

  1. N'ọnwa Mee afọ 1967 ka ehibere mba akpọrọ Biafra
  2. A na-eche na ihe karịrị mmadụ nde nwụru na ya bụ agha
  3. Ọfọdụ ndị na-asị ka gọọmentị ehibe ụbọchị Mee 30 ka oge ncheta ndị a nwụrụ
  4. Otu na-achọ Biafra dịka Ipob na-asị ka ndị mmadụ ghara ịga ahịa maọbu ọrụ ụbọchi ahụ

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Chiagozie Nwonwu

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Aba gbara chako ka ha mere 'sit-at-home' nke ha

    Sọ ndị ọkwọ ụgbọala ka a hụrụ n'ụzọ. Ka ahịa niile, ụfọdụ ụlọakwụkwọ na ụlọakụ mechiri emechi.

    View more on facebook
  2. Onicha, Nnewi na Aba nụtara oku Ipob maka Mee 30

    Ka chi foro taata, ọtụtu ndị bi na Onicha, Nnewi nakwa Aba kwenyere ịnọdụ na be ha dịka otu Indigenous People of Biafra siri rịọ ha.

    Ahịa gbachichara n'obodo ndị a, dịka ụlọ akụkwọ nakwa ụlọ akụ siri gbachie.

    Head Bridge Onicha
    Image caption: Onicha mere ịnọdụ n'ụlọ ọfụma

    Mana, na obodo ndị ọzọ dịka Enugwu, Abakaliki, Owere na Umuahia ahịa na-azụ, umụ akwụkwọ gakwa akwụkwọ.

    Ụfọdụ ndị BBC gbara ajụjụ ọnụ na steeti ndị a kwuru na ha kwadoro icheta ndị nwụrụ n'agha Biafra mana ha pụtara ịchọ ihe ha na ezinaụlọ ha ga-eri.

    Ndị kwadokwere ihe a na-eme gwara BBC Igbo na atụmatụ 'sit-at-home' a ga-enyere ha nwete Biafra ọsịsọ.

    Douglas road Owerri
    Image caption: Ndi mmadụ pụtara na Douglas Road Owerri
  3. 'Head Bridge' Onicha

    Onicha Head Bridge
  4. Ahịa mechisiri n'Ogbunike, n'Onicha nakwa Nnewi n'ụbọchị Mee 30

    Onye ntaakụkọ BBC si gara Onicha ịhụ etu esi eme emume ụbọchị Mee 30.

    Ọ kwuru na ọtụtụ ahịa ọ gara gbachiri agbachi ka ndị mmadụ na-eme "sit at home" ndị Ipob.

    Ahịa Ogbunike, ahịa "Building Material" n'Onicha nakwa ahịa nile dị n'ụzọ Awka ruo "Head Bridge" gbachiri agbachi ka ndị mmadụ nọ n'ụlọ maka oku ndị Ipob kpọrọ.

    Ahịa Onicha
    Ahia Building material
    Ahịa Ogbunike
  5. Ihe ndị Imo na-ekwu maka ´Ụbọchị Ncheta Biafra'

    Video content

    Video caption: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka 'Ụbọchị Ncheta Biafra' n'Imo steeti
  6. N'Enugwu, ndi mmadụ pụtara ka ụbọchị ọ bụ Mọnde

    Lee etu taa si aga n'Enugwu.

    Video content

    Video caption: Etu 'Ugbochi Ncheta Biafra' si aga n'Enugwu
  7. Ihe ndị Ebonyi na-ekwu maka 'Ubochi Ncheta Biafra' nke 2019

    Video content

    Video caption: Ụbọchị Ncheta Biafra: Etu o si aga n'Abakaliki
  8. Ndị Naịjirịa ejibeghi ihe mere n'agha Biafra mụta ihe - Okey Ndibe

    Okey Ndibe sị na, "Agha abụghị ihe onye ọbụla hụrụ ihe mere n'afọ 1967 ruo 1970 ga-asị ka o mee ọzọ." O kwukwara ihe mere ogbaghara jiri ka dị n'ala Naịjirịa ruo taa.

    O nyere ndị ntorobịa ọdụmọdụ gbasara otu ha siri chọọ ka ha nwe nwereonwe nke ha - nsogbu ga-adị na ya na ihe ha kwesiri ime.

    Video content

    Video caption: Biafra: Okey Ndibe kọrọ ihe ọ hụrụ dị ka nwata nọ mgbe a nụrụ n'agha Biafra
  9. Ihe Nnamdi Kanu kwuru maka Biafra

    BBC Igbo na onyeisi otu na-achọ Biafra bụ Nnamdị Kanu nwere mkparịtaụka na mbido afọ a.

    Lee ụfọdụ ihe okwuru maka Biafra

    Video content

    Video caption: Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya
  10. Etu ọ dị n'Abia Tower, Umuahia n'ụtụtụ a

    Abia Tower
    Image caption: Abia Tower dị na ụzọ si Bende gawa Umuwaya n'Umuahia.
  11. Onicha so na-eme 'Sit at Home'!

    Onicha sonyere atumatụ ịnọdụ n'ụlọ nke ọfụma.

    Site "Head Bridge" ruo Mkpọ ahịa mgbachisiri agbachi, dịka ndị BBC gbara ajujụ ọnụ siri kwuo.

    Awada
    Image caption: Ụzọ Gius Eze dị nso n'ụzọ Owere n'Onicha tọgbọ chakoo
    Ụzọ Onicha-Owere
    Image caption: Ụzọ Onicha-Owere
    Ụzọ obodo Ukwu nọkwa chakoo
    Image caption: Ụzọ obodo Ukwu nọkwa chakoo
  12. Post update

    Onye ntaakuko BBC n'Owere na-akọwa na obodo na-ekwo ka ọnweghị ihe na-eme.

    Owere
    Image caption: Owere
    Owere
    Image caption: Owere
  13. Enugwu anaghị eme ndọdụ n'ụlọ maka Biafra

    Ogbete n'Enugwu
    Image caption: Ahia ogbete na-azụ
    Ahia Ogbete
    Image caption: Ahia Ogbete
  14. Ka a na-ekwu maka Biafra, lee ihe ịmaghị maka Ojukwu

    Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ otu onye Ndigbo agaghị echefu aha ya echefu, mana gịnị ka ịmaghị maka ya?

    N'ịcheta ndụ o biri n'ụwa, Elliot Uko, onye buru Ojukwu akpa ọtụtụ afọ tupu ọ nwụọ, kwuru na Ojukwu ejighị ịhụnanya Ndigbo nwere ebe ọ nọ kpaa ego dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ugbua na-eme.

    Lee ihe Maazị Uko gwara BBC Igbo:

    Video content

    Video caption: Ojukwu: Ihe Elliot Uko nwere ikwu maka onye ọ na-eburu akpa
  15. Ọ dịka Onicha kwenyere n'atụmatụ 'Sit At Home' Ipob kpọrọ

    N'ihe dabara n'akukọ BBC Igbo dere ụnyaahụ, foto na ozi soshal midi si Onicha na-egosi na ndị mmadụ kwenyere mee ịnọdụ n'ụlọ maka ncheta Biafra.

    Ndị BBC kpọrọ n'Onicha sị na ụzọ dị chakoo.

    Lee akuko anyị maka Onicha na Nnewi.

    View more on twitter