Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Chioma Obianinwa, Chris Sanctus Okereke na Uche Akolisa

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Post update

    Senetọ Orji Uzo Kalu ekelela onyeisiala Muhammadu Buhari maka mmeri meriri n'ụlọikpe ụbọchị Wenezde.

    N'ozi o wepụtara n'akara Twitter ya, Kalu kwuru na na "'Next level egwunyela."

    View more on twitter
  2. A kụrụ Atiku ukwu n'ala - Joe Igbokwe

    Joe Igbokwe

    Onye enyemaka pụrụiche maka ọwa mmiri na Legọs bụ Joe Igbokwe ekwuola na ọ bụ ihe a tụrụ anya mere.

    Ọ gwara BBC Igbo nke a n'ekwenti na otu ya bụ APC ma na o nweghi ebe ikpe ahụ na-aga na mbido ya.

    Maka mkpesa otu PDP sị na ha ga-eme, Igbokwe kwuru na ọ bụ igbu oge na mmefu ego

    "Ọ bara uru? o nweghi okwu dị n'ihe ahụ" ka o kwukwara.

  3. Mkpebi ụlọikpe bụ mmeri nye ndị tụnyere m- Buhari

    Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola na mmeri enyere ya n'ụlọikpe maka ntuliaka 2019 bụ 'mmeri' nye ndị pụtara n'igwe bịa tụnyere ya vootu.

    Buhari kwuru nke a site n'onu na-ekwuru ya bụ Garba Shehu bụ onye gbara ama n'akara Twitter ya.

    View more on twitter
  4. Mkpebi ụlọikpe a adabaghị ma ncha - PDP

    Otu PDP ekwuola na mkpebi ụlọikpe nke kwuru na Buhari meriri d "tụrụ ha n'anya."

    N'ozi ha wepụtara n'akara Twitter ha, PDP kwuru na ' " Ọ bụ ihe mgbagwoju anya na ụlọikpe kwadoro nkpọpụta onyeisiala Buhari dịka onye meriri na ntuliaka na'agbanyeghị ihe akaebe gosiri na emere ọtụtụ ihe megidere iwu."

    View more on twitter
    View more on twitter

    PDP gara n'ihu gwa ndị ihe ha na-amasị ha dere jụụ n'ihi na ha ga-agbagha ya bụ mkpebi rue Ụlọikpe Kachasị.

    View more on twitter
  5. Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka mkpebi ụlọikpe

    Femi Fani-Kayode

    Otu onye otu PDP a m a ama bụ Femi Fani-Kayode kwuru na o kwesịghị ịtụ onye ọbụla mkpebi ikpe dị n'etiti Atiku na Buhari.

    N'okwu ya "e jiri wuruwuru meririe na ntuliaka, merikwa n'ụlọikpe. Alaka gọọmenti nille dị ha n'aka."

    View more on twitter

    Ụmụ Naijiria ndị ọzọ na-ekwụkwa dịka Fani Kayode na mkpebi ahụ agbaghị ha gharịị.

    @chingyarmani1 kwuru na ọ bụ eze ama na a ga-echi.

    View more on twitter
  6. Buhari emeriela Atiku n'ụlọikpe

    View more on facebook

    Ụlọikpe akpụla akwụkwọ Atiku gbara Buhari n'ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka.

    Onye ọkaikpe Jọstịs Garba kwuru na akwụkwọ akaebe niile ndị gbara akwụkwọ wepụtara iji kwado ebubo ha boro dịka na atụụ vootu karịrị ndị tụrụ ya egosighị.

    Muhammadu Buhari
  7. 'Atiku na PDP egozighị n'ụzọ doro anya na wuruwuru karịrị'

    Atiku Abubakar

    Atiku na otu PDP boro ebubo na ntuliaka ahụ jubutara na wuruwuru; izụ vootu, vootu ịkarị ọnụọgụgụ ndị tụrụ ya, mgbagbu ndị bịara ịtụ vootu ọkachasị na steeti 11 gụnyere Kaduna, Kano, Katsina, Kebbi, Niger,Borno, Gombe, Zamfara,Jigawa nakwa, Yobe

    Mana ụlọikpe kpụpụrụ mkpesa ahụ ma kwụọ n'ebubo a bụ nnukwụ mpụ nke kwesịrị ka ndị wetara mkpesa a (Atiku na PDP) gosi n'ụzọ doro anya na o mere dịka ha siri boo n'ebubo.

  8. 'Igwe 'card reader' anọchiteghị 'voters register'

    Igwe 'card reader'

    Ụlọikpe kpebikwara na igwe “card reader' na akwụkwọ e ji adebanye aha ndị ga-atụ vootu(voters register) abụghị otu.

    Na mkpebi ha, ha kwuru na onye wetara ikpe n'ụlọikpe agaghị eji 'igwe card reader' dịka ihe akaebe ma enyochara ndị tụụ vootu ma n'enyochaghị maọbụ ndị turu vootu akarịrị ndị debanyere aha ha maka atụmvootu.

  9. Inec ejighi "server" wee gbakọọ mpụtara ntuliaka

    Ụlọikpe kwukwara na ihe akaebe ha hụrụ gosiri na onweghi mgbe Inec ji were "server" gbakọọ mpụtara ntuliaka.

    Ha kwuru sị "Ọdịghị mgbagha na mpụtara ntuliaka bụ aka ka e ji gbakọọ ya bido na steeti dị icheiche ruo na nke e mere n'Abuja."

    "Onweghi ihe ọbụla anyị hụrụ nke gosiri na e nyere Inec maọbụ ndị ọrụ ha ikike iji "server" wee ziga mpụtara ntuliaka."

    "Onweghịkwa ihe ọbụla gosiri na e nyere Inec ikike iji igwe "smart card reader" wee chịkọta maọbụ gbakọọ mpụtara ntuliaka."

    Nke meburu
  10. Buhari tozuru etozu iso zọọ ọchịchị

    Ụlọikpe kwuru na onweghị mgbe iwu ji kwuo na onye ga-apụta ndọrọndọrọ ga-etinyeriri asambodo ya.

    Ha kwuru na ọmụmu Buhari gara mgbe ọ bu onye agha karịrị asambodo sekọndịrị.

    Dịka ha si kọwaa, Atiku na ndị PDP ewetaghị ihe akaebe ọbụla gosiri na Buhari enweghi asambodo.

    Na nkwubi okwu, ụlọikpe kwuru na Buhari tozuru etozu ịzọ ọkwa onyeisiala.

    Onyeisiala Buhari
  11. Ali Modu Sheriff awuchie n'ọgbọ

    Ali Modu Sheriff bụbu gọvanọ Borno steeti bụzị onye APC ugbua anwụchiela na ọgbọ ikpe

  12. Ụlọikpe amalitela ikpebi ikpe

    Dịka ha gachara ezumike nwamgbenta, ụlọikpe amalitela ikpebi ikpe ugbua gbasara ntụliakaelu onyeisiala e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a.

  13. Buhari atughi asị maka asambodo ya - Ụlọikpe Mkpesa

    Ụlọikpe Mkpesi ekwuola na okwu asambodo Buhari abụghi ihe ga-egbochi ya ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019.

    Ha sị na arịrịọ Atiku na PDP rịọrọ ha adabaghị ma ncha makana Buhari atughị asi n'akwụkwọ onyere Inec.

    Asambodo Buhari
  14. Okwu na APC ji ego 'TraderMoni' zụta vootu abụghi okwu anyị ga-etinye ọnụ - Ụlọikpe ntuliaka

    Okwu na Livi Uzoukwu etozughị i sonye na ya bụ ikpe maka ọ gara akwụkwọ n'ofesi.

    Okwu na Osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo ji ego 'Trader moni' enye ndị mmadụ ngarị ka ha tụọra vootu. Ha kụchapụrụ nke a maka na ha sị na Osinbajo esoghị na ọnye akpọrọ ikpe.

    Ha kụchapụkwara okwụ na ndị ọrụ nchekwa sọ mee mpụ na ya bụ ntuliaka maka ha esokwaghị na ndị agbara akwụkwọ na mbụ.

    Osinbajo
  15. Ụlọikpe a gaala ezumike nwamgbenta

  16. Ebe a nọ ugbua

    Ụlọikpe na-egezị ụsa APC na ebubo e boro ha. Nke a ga-abụ okwu nke ịkpeazụ tupu e kpebie ikpe.

  17. Ebubo ndị ọzọ akụchapụrụ

    A nabatara ọsịsa Buharị ụfọdụ ma kụchapụkwa ebubo ndị eboro ya.

    Akụchapụkwara ebubo na ndị agha na ndị uweojii nwere aka na mpụ e mere na ya bụ ntuliaka ebe ọ bụ na ha esoghị na ndị a gbara akwụkwọ.

  18. Nchịkọta okwu ndị ọkaikpe

    Ụlọikpe kwenyere na ọtụtụ ihe Inec rịọrọ ya ma kụchapụ ọsịsa ndị PDP nyere gbasara ha ike nke mbụ rụọ na iri abụọ na isii na agba nke mbụ ikpe ahụ.

  19. Nke na-eme ugbua: Buhari na ndị gọọmentị ya na-eme nzukọ n'Abuja

    Onyeisiala Muhammadu Buhari, ndị Gọvanọ na ndị minista niile na-eme nzụkọ n'Abuja ugbua.

    View more on twitter
  20. Ụlọikpe si na ha anabataghi arịrịọ Atiku na PDP maka ndị ọru nchekwa

    Ụlọikpe ntuliaka sị na ọdabaghi ị si ha tinye ọnụ na-agwa ndị ọrụ nchekwa kpara na ntuliaka 2019 ezighiezi maka etinyeghi ha n'ikpe agbara maka ya.