Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Chimamaka Ihenacho, Chigozie Ohaka, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi na Adline Okere

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Ọtụtụ ụlọ gbara ọkụ na-adaruzi ala ugbua n'Ọchanja

    Ebere Ekeopara

    Ọkụ Ọchanja
    Ahịa Ọchanja
    Ahịa Ọchanja

    A na-asị na ala adịghị mma bụ uru ndị eze!

    Igwe si n'ahịa ọchanja
    Image caption: Ngwa lee ka ndị na-ego igwe "Condemned Iron" si na-egokọsị igwe gbara ọkụ n'ụlọahịa ndị mmadụ.
    Igwe dị n'ọchanja
    Image caption: Igwe e ji rụọ ụlọ rere ọkụ n'ahịa Ọchanja
  2. Lee ụfọdụ n'ime ndị ọkụ ọgbụgba kpụrụ isi ma kpụọ afụ ọnụ ha

    Ebere Ekeopara

    Chidimma Mezue
    Image caption: Oriakụ Chidimma Mezue: Ụlọobibi ya na ụlọahịa ya gbara ọkụ n'Ọchanja. Ka ọ dị ugbua ya na di ya enweghizị ebe ha na-arahụ nke ha ji enwe akwa ọbụla.
    Essy Moghalu
    Image caption: Essy Moghalu onye Ụga, na-akwa akwa arịrị na ụlọahịa nne ya gbara ọkụ n'Ochanja.

    Essy na-ekele Chukwu na ya na nne ya nwere ike gbapụ ọsọ oge ọkụ ahụ na-akpa ike ụbọchị Wenezde ahụ.

    O kwuru na ọ bụ n'otu ebe ahụ ka nna ya sị azụ ha n'ụlọakwụkwọ ma nyekwa ha nri.

    Hillary Aliozor
    Image caption: Hillary Aliozor: Ọkụ gbara ụlọahịa ya ma gbakwaa ebe ọ na-akwasa ngwaahịa ya.
  3. Onitsha Tanker Fire: Onitsha kwesịrị inwe ezigbo ndị ọrụ mmenyụ ọkụ - Obi Onitsha

    Obi Ọnịcha bụ Nnaemeka Achebe ekwuola na obi ya tiwara maka ihe ọkụ tanka a mere n'Ọnicha.

    Ọ bụ n'akwụkwọ ozi o depụtara ka o tiri ndị ọkụ a metutara aka n'obi ma kelee onyeisiala bụ Muhammadu Buhari, Gọvanọ Willie Obiano na ndị Eze odinala zitere ha ozi iti aka n'obi.

    O kwukwara na ọ na-echeta nke mere na Mee afọ 2015 ebe tanka bụ mmanụ ụgbọala dakwara ma gbuo ihe ruru mmadụ iri isii.

    Obi Ọnịcha kwuru na mgbe ọ na ezi ozi Ofala ka o kwuru maka etu Anambra steeti si di.

    Obi Ọnịcha
    Image caption: Obi Ọnịcha rụtụrụ aka etu izu ahia n'okporoụzo sị dị njọ ma etu unyi si agbaso Ọnịcha aka mgba.

    O kwuru maka etu azumahia na mmepe obodo si bụru ọdachi nye Ọnịcha.

    Ekele ya rukwara Gọvanọ Willie Obiano maka etu o siri gbatara ndị Ọnịcha ọsọ enyemaka.

    Kama o kwuru, kwusie ike na ezigbo ndị ọrụ mmenyụ ọkụ dị ezigbo mkpa n'obodo mepere emepe dịka Ọnịcha.

  4. Lee ihe ọkụ mere ihe ndị mmadụ n'Ọmọba dị n'Ọnịcha

    Ọkụ ọgbụgba n'Omagba: Mmadụ anwụghị mana ụzụ akwa na-atụ n'ihi na ụlọ na Ụgbọala agbaachaala ọkụ.

    Ebere Ekeopara

    Ọkụ mere ndị mmadụ ịwa!

    Nwoke ụgbọala ya rere ọkụ
    Image caption: Nwoke ụgbọala ya rere ọkụ
    Ụlọ rere ọkụ n'Ọmọba
    Image caption: Ụlọ rere ọkụ n'Ọmọba
    ọkụ gbara ebe a na-arụgharị ụgbọala
    Image caption: Ọkụ bara ebe a na-edozi ụgbọala gaa repịa ụgbọala ndị nọ ebe ahụ
    Ụgbọala nakwa ụlọ
    Image caption: Ọkụ a metụtara ma ụlọ ma ụgbọala
    Ụgbọala ndị ọkụ metụtara
  5. Ọkụ Ọchanja napụrụ otu nwoke ụlọahịa ya nke Ọmaba na-apụ ya ụlọobibi

    Nwoke a nwere ụlọahịa n'Ọchanja ma nwee ụlọobibi ya n'Ọmaba

    Akụkọ na-eru anyị site n'Ọmaba na-ekwu na ọkụ gbara n'Ọchanja gbara ụlọọahịa otu nwoke ebe nke gbara na n"ọmaba gbara ụlọobibi ya.

    Ọ bụ ndị agbataobi nwoke a gwara BBC Igbo ụdịrị ọdachi a metụtara nwoke a.

    Ụlọobibi ọkụ gbara n'Ọmaba
    Image caption: Ụlọobibi ọkụ gbara n'Ọmaba
  6. Anyị emepeela ọbaego maka ndị ọkụ metụtara - Gọọmentị Anambra

    Ha kpọrọ aha ọbaego 'Anambra State Victims Support Account'.

    Gọọmentị Anambra steeti sị na ha emepela ọbaego maka iji nyere ndị ọkụ ọgbụgba a metụtara.

    Ha rịọrọ ndị enyi, ndị agbataobi ka ha nyere ndị a aka etu ha nwereike.

    N'otu aka ahụ gọvanọ Obiano etinyela atụmatụ inye ndị ọrụ mgbanyụọkụ ikike ịkwụrụ nke onwe ha.

    Nke a ga-enwe isi ma ọ bụrụ na ndị ụlọomeiwu Anambra Steeti tinyeaka n'ime atụmatụ a.

    Ikike a ga-eme ka ndị ọrụ mgbanyụọkụ hazie ego ọbụla batara ha aka na-abụghị gọọmentị itinye aka na ya.

    Gọvanọ Obiano
    Image caption: Mgbe gọvanọ Willie Obiano gara ebe ọkụ gbara na Upper Iweka
  7. Maap ebe ndị ọkụ gbara n'Anambra

    Tanka abụọ gbara ọkụ n'Ọchanja na Ọmaba n'ime ụbọchị abụọ

    Ebe Tanka gbara ọkụ
    Image caption: Maap ebe ndị Tanka gbara ọkụ n'Ọnịcha Anambra Steeti
  8. Ụgbọala 22 gbara ọkụ n'Ọmaba

    Ọkụ a metụtara ụlọ asatọ n'abụghị ndị nke Upper Iweka na Ọchanja

    Ọnụ na-ekwuru ndị uwojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed sị na ọ bụ ụgbọala iri abụọ na abụọ ka ọkụ gbapịara n'ụlọ a na-arụ ụgbọala dị n'ime ụzọ Udi street Ọmaba.

    O kwuru na ọ bụ ụlọ asatọ ka ọkụ a metụtara.

    Otu n'ime ụgbọala ndị ometụtara
    Image caption: Ndị na-ekiri ụlọọrụ ụgbọala ọkụ
    Tanka malitere ọkụ a
    Image caption: Ndị na-ekiri ụlọọrụ ụgbọala ọkụ
    Ndị na-ekiri ụlọọrụ ụgbọala ọkụ
    Image caption: Ndị na-ekiri ụlọọrụ ụgbọala ọkụ
  9. Tanka ọzọ agbala ọkụ n'Ọmaba, Ọnịcha.

    Ndị uweojii sị na o nweghị onye nwụrụ

    Dịka a na-ekwu nke mere eme, ụgbọala Tanka ọzọ dara ma gbaa ọkụ n'okporoụzọ Ọmaba Phase 1 nke Ọnịcha na mgbede ụnyaahụ.

    Mana ndị uweojii site n'ọnụ onye na-ekwuru ha bụ Haruna Mohammed sị na o nweghi onye nwụrụ n'ọkụ a gbara. Mohammed kwuru na ha ebupụla ụgbọala Tanka a n'ụzọ ka ọ ghara ibute kpachi kpachi okporoụzọ.

    Ọkụ ọzọ gbara n'Ọmaba
  10. E kwesịrị ịchụ onyeisi ndị mmenbyụ ọkụ na mberede

    Gịnị na-afịọ BBC Igbo taa chakere anya n'ihe gbasara tanka dara n'Ọnịcha.

    View more on facebook
  11. Ndị gọọmenti ekwupụtabeghi ndị ihe mberede a metụtara

    Ndị gọọmenti ekeupụtabeghi mmadụ ole mberede mere n'Ọnịcha.

  12. Lee ihe ndị ọkụ a metụtara nwere ikwu

    Iwe na ọnụma jupụtara ndị Ọnịcha obi, ọ kachasị ndị ọkụ a gbara ụlọ ma ụlọahịa ha.

    Video content

    Video caption: Ndị ọkụ gbara ụlọ na ọdọahịa ha n'Ọnịcha
  13. Tanka nsi nyere aka menyụọ ọkụ

    Ụlọahịa ebe ọkụ ka na-ere n'Ọnitsha

    Ụlọahịa ebe ọkụ ka na-ere n'Ọnitsha
  14. Ụfọdụ ụlọahịa ndị mmadụ ka na-enwu ọkụ

    Ụfọdụ ụlọahịa ndị mmadụ ka na-enwu ọkụ ugbua.

    Ụlọahịa ndị mmadụ na-agba ọkụ
    Ụlọahịa ndị mmadụ na-agba ọkụ
  15. Chi ewerela ehihie jie

    Mkpu akwa na-ada n'elu n'ala.

    Ọtụtụ ngwaahịa ndị mmadụ lara n'iyi n'ọkụ ahụ.

    Ọtụtụ ndị nwụkwara na ya, dịka onye ntaakụkọ anyị nọ n'Ọnịcha ugbua si kwuo.

    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
    Ọkụ gbara n'Onicha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Onicha
  16. Okporoụzọ Upper Iweka ebe ndị mmadụ ka na-akwa arịrị

    Ọkụ gbara n'Ọnịcha
    Image caption: Ọkụ gbara n'Ọnịcha
  17. Gọvanọ Obiano eruola ebe ọkụ tanka gbara n'Onịcha

    Gọvanọ Obiano agala ebe ahụ ọkụ gbara n’Upper Iweka, Onịcha.

    Nnọọ nu, anyị na-ewetere unu etu ihe sị aga ebe ọkụ gbara n'Ọnịcha ụnyaahụ.Lee foto tanka ka o siri gbaa n'Ọnicha ụnyaahụ

    Ọ gwara ndị ihe ahụ metutara okwu nkasị obi.

    Ọ sịrị ha ndo maka ihe ọjọọ ahụ mere ha.

    Ọ rịọkwara ndị mmadụ ka ha nyere ibe ha aka n’oge dị otu a.

    Ọ rịọkwara ha ka ha ghara ịkpa aghara ma ruwe isi n’iwu obodo.

    Ọ kwekwara nkwa na gọọmentị ga-eti ndị ya bụ ihe metutere aka n’obi tupu agbaa ekeresimesi.

    Ọ kasiri ha obi na ha ga-agba ekeresimesi a n’ọṅụ.

    Ọ sị na ndị kọmitii ga-abịa ebe ahụ echi ịmata ndị ya bụ ihe metutere.

    Sị ha nyere ha aka.

    Obiano kwekwara nkwa na gọọmentị ga-elebara ọrụ mmgbanyụ okụ Steeti ahụ anya ma nye ha akụrụngwa ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha.

    Ọ kwuru na “anyị ga-ajụ ma gbochie ndị ọkanogori chọrọ iji ohere a zuo ihe ndị mmadụ”.

    Ọ rịọsiri ha ike ka ha ghara ịda mba.

    Gọvanọ Obianọ ka o na-ele ka ọkụ sị mmetụta ndị mmadụ
    Tanka gbara ọkụ n'Ọnịcha ụnyaahụ