Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Uche Akolisa, Chioma Obianinwa, Jessica Nwankwo na Chiagozie Nwonwu

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Anyị na-awụsa ọwa ebe a!

    Ka o dịnụ mgbe ọzọ.

  2. Ndị mmadụ na-enwe aṅụrị n'ụlọ gọọmentị Kogi maka mmeri Yahaya Bello

    Ụlọ gọọmentị Kogi
    Kogi
  3. Ndị be anyị unu asaala chị?

    Anyị alaghachitela.

    Anyi ka na-etinyekwa anya na ntuliaka emere na Kogi nakwa Bayelsa

  4. Yahaya Bello atụrụla ugo na Kogi

    Dịka Inec siri kwuo Yahyah Bello nke APC ji vootu 406,222 merie Musa Wads nke PDP wetere 189,704 ji gba onye nke abụọ.

    Natasha Akpoti nke SDP nwetere vootu 9,482.

    Inec akpọọla aha Yahaya Bello dịka onye ga-achị Kogi ruo afọ anọ ga-abịa.

    Natasha Akpoti agbajọọla ya bụ ntuliaka ma si ka akagbuo ya dịka Musa Wada na-ekwukwa otu ihe a.

    Onye nnọchịte anya PDP n'ebe ngọkọ vootu ekweghị ibinye aka n'akwụkwọ eji gbakọ vootu enwetere na ntuliaka a.

    Yahaya Bello
  5. Post update

    Anyị ga-ahapụ ya ebe taa.

    Ma chetakwa na anyi ga-amalite n'ụtụtụ.

    Ka ọ dị nụ.

  6. Akụkọ Mere Ugbua - APC emeriela PDP n'okpuru ọchịchị 6 n'ime 8 dị na Bayelsa steeti

    Onye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati "All Peoples Congress" (APC) na Bayelsa Steeti bụ David Lyon ejirila vootu 331063 buru onyeisi na ntuliaka eji họpụta aka ga-achị steeti ahụ ruo afọ anọ n'abịa.

    Onye gbara nke abụọ bụ Diri Duoye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati "Peoples Democratic Party" (PDP) bụ onye nwetere vootu 114828.

    David Lyon
  7. Ngụkọ vootu na Kogi akwụsịla, a ga-amalitekwa echi

    Dịka a ngụkọ vootu si okpuru ọchịchị Lokoja na Ibaji adịbeghị, Inec sị na-aga emechi na Kogi.

    Mmalite ọzọ ga-abụ n'elekere itoolu nke ụtụtụ echi bụ Monde bụ ụbọchị iri asatọ nke ọnwa Nọvemba, 2019.

    Na ngụko nke pụtara, APC na-aga PDP ebe SDP na-agba nke atọ.

    PDP na SDP na-agbarụ ihu maka ọnọdị a dịka ndi zọrọọkwa n'okpuru na-ekwu ka akagbuo ya bụ ntuliaka maka nrụrụaka.

    Kogi
  8. A na-ezu ike n'ebe a na-agbakọ vootu na Bayelsa na Kogi

    Anyị ga-ewetere unu ka o si aga oge ha laghacitere.

  9. Post update

    APC emeriela n'okpuru ọchịchị Goodluck Jonathan si

    APC wetere ọnụọgụgụ 58,016 iji merie n'okpuru ọchịchi Ogbia bụ ebe onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan si.

    PDP nwetere 13,763.

    Onye nchịkọta vootu bụ Ọkammụta Victor Igbinedion sị na e nwere ebe ọgbaghara dị n'Ogbia nke mere eji kagbụo vootu.

    Goodluck Jonathan
  10. APC akụọla PDP akpụ na Nembe

    Na Nembe Inec si na ọ bụ etu a ka o si kwụrụ: APC: 83,041 PDP: 874

    Onye nchịkọta vootu bụ ọkammụta Joseph Osenekha si na enweghị nsogbu ọbụla si ebe pụta mana enwere pati wetere akwụkwọ mkpesa mana ọkpọghị aha pati a.

    Pati Accord sị na ntuliaka gara nke ọma na Nembe.

    Obodo ahụ bụ be Osote aka n'achị Bayelsa bụ Gboribiogha John Jonah.

    Egburu mmadụ abụọ na Nembe oge PDP gara ịchụ nta vootu tupu eme ntuliaka.

  11. Achọtala ndị Inec 'na-efu' na Kogi

    View more on twitter

    Mmadụ iri atọ na-arụrụ Inec ọrụ na Kogi a na-achọ achọ anaruola be ha.

    Onye mgbasa ozi onyeisi Inec bụ Rotimi Oyekanmi sị na ndị gara ọrụ n'okpuru ọchịchị Olamaboro gbara ọsọ mgbe ndị akpụ obi bịara chụsasịa ndị mmadụ ebe a na-eme ntuliaka.

    Akụrụmgwa ntuliaka na Kogi
  12. Lee ebe ị ga-ahụ nchịkọta vootu Bayelsa

    Nchịkọta vootu Bayelsa di ebe a.

    Bayelsa
  13. PDP meriri APC na Sagbama bụ ebe akagbụru vootu n'ụfọdụ ebe

    Akagbụrụ ebe anọ tụọ vootu 17 na Sagbama maka ihe pụtara na igwe eji agu vootu adabaghi n'ihe agụpụtara mgbe atụchara vootu.

    Etu Inec sị na ọnụọgụgụ siri kwuru bụ: APC: 7831 PDP: 60,339

    Bayelsa
  14. PDP na Natasha Akpoti agbajọla ọnụ ọgụ vootu Inec wepụtara na Kogi

    Ọnu na-ekwuru PDP bụ Kola Ologbondiyan si na pati ya anabataghị ọnụ ọgụgu Inec na-akpọpụta na Kogi ọkachasị ine si Okene pụta.

    PDP sị ka agbajọ ya bụ ọnụ ọgụgụ vootu.

    N'otu aka ahụ, Natasaha Akpoti bu onye zọrọ ọkwa gọvanọ n'okpuru patị SDP sị na ya chọrọ ka akagbuo vootu niile si Kogi pụta na ntuliaka a.

    Akpoti sị na ọ bụ maka nrụrụ aka na ọgbaghara mere ya jiri kpọọ okwu a di na akwụkwọ mgbasa ozi o wepụtara.

    Ntuliaka Kogi
  15. Smart Adeyemi na-aga Dino Melaye n'ọnụọgụgụ vootu n'okpuru ọchịchị ime obodo ha

    Smart Adeyemi nọ n'ihu Maazị Dino Melaye na ntuliaka emegharịrị iji hopụta onye ga-anọchịte anya Kogi West n'ụlọ omeiwu nke ukwu.

    Maazị Melaye katọrọ ya bụ ntuliaka maka ọ si na nrụrụaka na ogbubu mmadụ karịrị na ya.

    Dino Melaye
  16. Amalitebeghi ọnụ ọgụgụ ntuliaka na Bayelsa

    Ndị mmadụ wụsa na-eche ka Inec bido njem ịgụ vootu.

    Ebe a na-agụ ọnụ ọgụgụ vootu na Bayelsa
    Ebe a na-agụ ọnụ ọgụgụ vootu na Bayelsa
  17. Otu nwata akwụkwọ nwụrụ na ntuliaka Kogi

    Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na otu nwata akwụwkọ so rụọ ọrụ ntuliaka na Kogi nwụru mgbe ụgbọ mmiri ọ nọ n'ime ya kpuru n'ebe akpọrọ Odogwu.

  18. 'E gburu nwanne m' - Sinetọ Dino Dino Melaye

    Dino Melaye so zọọ ọkwa na ntuliaka a emere na Kogi steeti.

    O dere n'akara Twitter ya na nwa nwanne ya nwụrụ site na mgbọ egbe agbara ya na ntuliaka a.

    BBC Igbo chọpụtabeghị ma nke a ọ bụ eziokwu.

    View more on twitter
  19. Inec na-agụpụta ọnu ọgụgụ vootu na Kogi

    Lee etu o si kwụrụ

    Ọnụ ọgụgụ vootu na Kogi