Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Naịjirịa na-arịọ mba Amerịka ka ọ kagbuo mgbochi ọ wụkwasara ha n'ahụ

    Ndị njem n'Akanụ Ibiam

    Naịjirịa agwala mba Amerịka ka o kagbuo usoro ọhụrụ mba ahụ wepụtara maka etu ọ ga-esi na-anabata ndị Naijirịa na mba ha.

    Ọ bụ Fraide bụ ụbọchị nke 21 n'ọnwa Febụwarị ka atụmatụ a malitere.

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump gunyere Naịjirịa n'ime mba ise ndi ọzọ ga-eso n'ime mba ndị ọ chabịri ohere ha ga-eji bata mba Amerịka.

    Agbanyeghi na ọtụtụ mmadu na-agbarụ ihe maka atumatụ a, ndi ọru gọọmentị Amerịka si na ọ bụ maka mba ndị a dara atụmatụ eji enyocha ma kesa mpụtara nyocha ndi mmadụ butere mkpachi a fesara Naịjirịa na ndị ọzọ.

    Ọ bụ onyeisi Ministri na-ahụ maka obodo bụ Maazị Aregbesola rịọrọ arịrọ n'aha Naijirịa.

    Ọ sị: "Naịjirịa dị mkpa dịka ezigbote ọyi Amerịka nke mere okwesighi enwete ụdịrị mgbochi a."

  2. Unu asaala chi?

    Nnọọ nụ na njem nke taa bụ ụbọchi nke iri abụọ na otu nke ọnwa Febụwarị afọ 2020.

    Taata bụ nke n'ime ọnwa mbụ nke n'usoro ọgụgụ afọ ndị Igbo.