Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Chiagozie Nwonwu

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Video content

    Video caption: Uru dị n'akwụkwọ nri

    Otu okwu akpụ n'ọnụ n'oge nje covid-19 a bụ mkpụrụ ọgwụ vitamins, mana, ihe na-ejupụtakwa n'ime akwụkwọ nri di iche iche.

  2. Ahụla coronavirus n'ahụ mmadụ iri ọzọ

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC ekwuola na ha chọpụtala coronavirus na'ahụ mmadu isi na Legọs, abụọ na Abụja nakwa mmadụ abuọ na Edo steeti.

    Nke butere mgbakọ ndi ahụgoro nje a n'ahụ 224.

    N'ime ha, mmadụ ise anwụọla, dịka NCDC siri kwuo.

    View more on twitter
  3. Saụt Afrịka amalitela ime ndị mmadụ nyocha maka coronvirus n'okporo ụzọ

    Nyocha ndị mmadụ maka coronavirus na Saụt Afrịka
    Image caption: Nyocha ndị mmadụ maka coronavirus na Saụt Afrịka

    Mba Saụt Afrịka amalitela inyocha ndị mmadụ maka coronavirus n'okporoụzọ.

    Atụmatụ a bu etu mba ahụ chọrọ iji mara mmadu ole n'ezieya bu nje a ma n'ime obodo na ebe mepere emepe.

    Ndi ọrụ ahụike na-eme nyocha ụlọ na ụlọ.

    Mba Saụt Afrịka machiri ngagharị ruo ụbọchị 21, ma malite ime nyocha.

    Ndị ọrụ ga-eso me ya bu mmadụ puku iri ga-enyocha onye ọbụla nwere amụma coronavirus.

    Ọ bụ usoro ndi mba Saụt Koria chabie mbawanye nje a ka Saụt Afrịka na-eso.

    Ọ bụ mmadụ 1,585 ka Saụt Afrịka sị bu nje a na mba ha, mana Minsita na-ahụ maka Ahuike ha bụ Zweli Mkhize dọrọ aka na ntị na ọnụ ọgụgu ha na-ahu dị ka o pere mpe nwereike bụrụ "ọnọdụ jiin tupu oke mmiri ezoo".

  4. Coronavirus: Anwụchiela otu n'ime ndị gbara ọsọ n'Osun steeti

    Osun state

    Ndi uweojii n'Osun steeti sị na ha anwuchiela otu n'ime mmadu abụọ gbara ọzọ n'ebe a na-enye ndị ahụrụ coronavirus n'ahụ ha ọgwụgwọ.

    Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ Johnson Kokumo sị na onye bụ nwaany nọzi ebe o kwesiri ịnọ dịka ha na-achọ onye nke ọzọ.

  5. Gee akukọ ụwa anyị nke ụtụtụ a

    Video content

    Video caption: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
  6. Coronavirus: Ọnụ Ọgụgụ ndị ga-anwụ n’izuụka na-abịa ga aka njọ - Donald Trump

    Donald Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump agwala ndị Amerịka ka ha gbaa aji n’ume n’ihi na ọ na-atụanya na ọtụtụ mmadụ ga-anwụ n’aka ọrịa covid-19 n’izuụka na-abia.

    Trump kwuru etu a dịka mmadụ narị nde atọ butere ọrịa coronavirus na Amerịka nke mere ka mba a bụrụ ebe ọnụ ọgụgụ ndị bu ya bụ ọrịa kacha na mba ụwa niile.

    Dịka ọ dị ugbua, ọrịa a eriela ndụ mmadụ ihe dịka puku itoolu na ọma na mba Amerịka, ebe obodo Neụ Yọk bụ ebe ọkacha akpa ike.

    N’otu aka ahụ ka Trump na-ekwukwa ka ewetulata aka na mmachi ngagharị na mba Amerịka.

    Ọ kwukwara si “ ka anyị meepee ngagharị n’obodo anyị obere n’ihi ọ bụghị otú a ka anyị ga esi ebi n’ime ọnwa na-abia”.

    Ka ọ na-ekwu nke a ka mba Amerịka na-akpọlata ndị obodo ha rụrụ pukua iri atọ na asatọ na narị abụọ, iri itoolu na isii maka ọrịa coronavirus.

    Ọ bụ na mba iri asaa na asatọ ka ha si a kpọlata ha.

    Mba ndị a gụnyere Naijiria, Gana na mba Bene.

  7. Unu asaala chị?

    Ana m enye unu ekele pụrụiche dika anyị na-amalite njem nke ụtụtụ.

    Gbadokwa anya maka na coronavirus abụghị akụkọ ifo!

  8. Mmadụ ise ọzọ ebutela nje coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC kwuru na ha achopụtala nje covi-19 n'ahụ mmadụ ise ọzọ.

    Na nkọwa ha, mmadụ atọ nọ na steeti Baụchị ebe abụọ n'Abuja.

    Nke welitere mgbakọ ndị ahụrụ nje a n'ahụ ha 214.

    Mmadụ anọ anwụọla n'ime ndị a ebe mmadụ 25 enwetela onwe ha ma laa be ha.

    View more on twitter
  9. Coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ 60,000 n'ụwa ugbua

    Coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ 60,000 n'ụwa ugbua

    Ka ọ dị ugbua, ọrịa coronavirus agafeela ọnụọgụgụ puku 60 bụ ndị o gburula, dịka mmadụ 60,874 nwụrụla

    na mbaụwa, site na nchọpụta mahadum John Hopkins mere. Ha kwukwara na ihe karịrị mmadụ 1,139,000

    ebutekwala ya bụ ọrịa.

    Ndị ụlọọrụ ntaakụkọ AFP na onwe ha kwukwara na ọ bụ etu ihe si kwụrụ ugbua.

    Coronavirus
  10. Coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ 60,000 n'ụwa ugbua

    Coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ 60,000 n'ụwa ugbua

    Ka ọ dị ugbua, ọrịa coronavirus agafeela ọnụọgụgụ puku 60 bụ ndị o gburula, dịka mmadụ 60,874 nwụrụla

    na mbaụwa, site na nchọpụta mahadum John Hopkins mere. Ha kwukwara na ihe karịrị mmadụ 1,139,000

    ebutekwala ya bụ ọrịa.

    Ndị ụlọọrụ ntaakụkọ AFP na onwe ha kwukwara na ọ bụ etu ihe si kwụrụ ugbua.

  11. Sịnịgal ọ na-agba ndị mbụ n'ịchụ ọrịa coronavirus ọsọ ụkwụ erụala n'Afrịka?

    Sịnịgal ọ na-agba ndị mbụ n'ịchụ ọrịa coronavirus ọsọ ụkwụ erụala n'Afrịka?

    Dịka ndị mmadụ na-eti mkpu na-ekwu na ọ dị ka nnyocha maka ọrịa COVID-19 anaghị eru ebe na etu o kwesịrị iru nakwa na ọ na-egbu ọtụtụ oge ịmata mpụtara nnyocha, ndị mba Sịnịgal achọwala aka ha.

    Mba a na otu ụlọọrụ dị na mba Briten na-achọ ụzọ ha ga-esi rụpụta ihe nnyocha ọrịa a, nke dị mfe, na-agaghị egbu oge, nakwa nke dị ọnụala.

    Ka ọ dị ugbua, Sịnịgal bu iji ọgwụ chloroquine (e ji agwọ ịba) agwọ ndị bu ọrịa coronavirus n’isi na mpaghara Afrịka.

    Marakwa na ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) ekwuola na amabeghi ma ọgwụ chloroquine a ọ na-enyere aka ịgwọ ọria a.

    Sịnịgal
  12. 'Anyị agaghị ahapụ ozu coronavirus gburu ka ndị nwe ya lie ya'- Lai Mohammed

    Lai Mohammed

    Gọọmenti etiti ekwuola na ha agaghị ahapụrụ ndị nwe ozu coronavirus gburu ka ha buru ga lie maka na ya bụ nje ka nwere ike ife mmadụ.

    Minista mgbasa ozi, bụ Lai Mohammed gwara ndị nta akụkọ nke a n'ọgbakọ ọtawaike nke akpọrọ 'Task Force' nke onyeisiala maka covid-19.

  13. Ụnụ asaala chi?

    Otetere n'ụra kelee Olisa!

    Ka anyị gaa n'ihu wetere ụnụ ka o si aga gbasara ọrịa coronavirus.

  14. Tupu anyị esuo ya kpọm, ka anyị gosi unu ihe ndị NCDC na-ekwu ugbua

    Mmadụ abụọ anwụọla n'Edo maka coronavirus

    Achọpụtara mmadụ iri abụọ nwere coronavirus.

    Ọ pụtara na ndị niile nọ n'ụlọọgwụ ugbu bụ mmadụ 181.

    Ndị niile nweela coronavirus na Naịjirịa bụ 209, ndị pụrụ n'ụlọọgwụ 25, ndị niile coronavirus tara isi ha bụ mmadụ anọ. Ndị NCDC emeziela ndehie aka ha dehiere n'ọnụọgụ ndị bu ya bụ nje ụbọchị ahụ.

    Ha mere nke a ụbọchị Satọde 3-04-2020. Ha sịbu na ọnụọgụ bụbu 210, mechee chọpụta na ọ bụ 209. Lekwa akara Twitter ha kọwara nke ọma na Bekee.

    Chukwunaerme Obiejesi na Adline Okere na-asị unu achifuo!

    View more on twitter
  15. E mepeela ụlọọgwụ gbatagbata maka covid-19 na mba Briten

    Ụlọọgwụ gbatagbata mba UK

    Mba Briten agbapeela ụlọọgwụ gbatagbata ọhụrụ nke ha ji abalị itoolu rụọ na London.

    Ụlọọgwụ ahụ akpọro “Nightingale Hospital” nwere akwa ndina puku anọ, ga-enye aka na nleta ndị bu ọrịa Coronavirus na mba ahụ.

    Mmadụ 38,168 bụ orịa coronavirus na UK, ebe mmadụ 3,605 anwụọla.

    N'ihi nke a, onyeisiala mba Briten bụ Ezenwaanyi Elizabeth ga-agwa ọha obodo okwu n'ụbọchị Sọnde ma ọ kụọ elekere asatọ.

  16. Lee mba ndị COVID-19 echetabeghi

    N'ime mba 193 so n'otu 'United Nations', naanị 18 ka nje coronavirus ababeghi.

    A bịa n'Afrịka mba anọ enwetabeghi kama otu onye bu ọrịa a.

    Gụkwuo maka nke a ebe a.

  17. Akagbuola ọgụ Anthony Joshua na Kubrat Pulev

    Anthony Joshua na Kubrat Pulev
    Image caption: Anthony Joshua na Kubrat Pulev

    Akagbuola asọmpi ọkpọ kwesịrị ịdị n'etiti Anthony Joshua na Kubrat Pulev nke mba Belgium.

    Asọmpi a kwesịrị ịbụ n'ụbọchị 20 nke ọnwa Julaị afọ a n'ama egwuregwu ndị otu bọọlụ Tottenham Hotspur nke mba Ịngland.

    Ọ bụ maka ọrịa coronavirus ka e ji kagbuo asọmpi a.

    Amabeghi oge ọzọ ya bụ asọmpi ga abụ.

  18. 'Gọọmentị etiti ga-enye ndịọrụ ahụike 'life insurance'

    Boss Mustapha
    Image caption: Odeakwụkwọ Naịjirịa bụ Boss Mustapha

    Gọọmentị etiti na-agba mbọ inye ndịọrụ ahụike so agba mbọ igbochi mgbasa ọrịa coronavirus na Naịjirịa 'life insurance'.

    Nke a bụ iji mee ka obi sie ha ike n'ọrụ ha, ka ha ghara ịtụ egwu ihe ga-eme ha ma ha bute ya bụ ọrịa.

    Odeakwukwọ gọọmentị bụ Boss Mustapha kwuru nke a n'ọgbakọ mgbasa ozi e nwere n'Abuja n'ụbọchị Fraịde.

    Mustapha kwuru na gọọmentị ga-agba mbọ inye ndịọrụ ahụike so ebuso coronavirus agha ihe niile dị ha mkpa iji mee nke a.