Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Nke Chioma Obianinwa na Ikechukwu Kalu

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Ọkwa ọhụrụ ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ mara maka coronavirus

    Dave Umahi

    Ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ arịọla ndị Igbo bi na steeti dị iche iche na Naịjirịa ka ha rubeisi n’iwu ọbụla gọọmentị etiti na nke steeti ahụ nyere iji belata mfesa ọrịa coronavirus.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti wepụtara site n’ọgbakọ ha nwere n’Enugwu n’ụbọchị Sọnde.

    Ha chọrọ ka Nigeria Center for Disease Control (NCDC) welitekwuo aka n'ime nyocha maka coronavirus.

  2. Mmadụ 11 ọhụrụ butere coronavirus n'Ebonyi steeti

    Ncdc

    Mmadụ narị atọ na iri na atọ ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa dịka ụlọọrụ NCDC sị kwuo

    Nke bụ na ndị buterela ọrịa achụwala puku asatọ, dịka mmadụ puku abụọ narị abụọ na iri isii na atọ gbakerela, ebe narị abụọ na iri abụọ na isii anwụọla.

    Mmadụ iri na otu butere coronavirus n'Ebonyi steeti ọhụrụ a. Nke a ga-eme ya mmadụ iri atọ na atọ buterela ọrịa a na steeti ahụ.

    View more on twitter
  3. Ụnụ abọọla chi ndị ọma?

    Ekpere

    Otetere n'ụla kelee Olisa.

    Ya gazieire onye ukwu, na onye nta taa!

    Anyị amalitela ịkọ akụkọ pụrụiche nke taa gbasara coronavirus.

    Uche gị apụkwala n'ime ntụzịaka niile gbasara coronavirus makana ya bụ ọrịa ka nọkwa n'obodo.

  4. Ụmụibe, anụ gbanaa taa, echi bụ nta. Ka chi foo nụ!

    Rahụ nụ duu

    Ka chi na-eji
  5. Boris Johnson ekwuola na ya na-akwado Cummings n'ihe ọ mere

    Dịka ndị mmadụ na-eti mkpụ ka onye enyemaka Boris Johnson bụ Dominic Cummings kwụsị ọrụ ya dika ha sị na ọ dara iwu ehiwere maka mmachi coronavirus mgbe ya na ezinụlọ ya mere njem ka onyeisiala Briten bụ Boris Johnson kwuru na onye ọbụla bụ nne maọbụ nna ga-eme ihe mazi Cummings mere maka ezinụlọ ya.

    Ọ bụ mgbe ndị ntaakụkọ jụrụ Johnson ajụjụ maka nke a n'ọgbakọ ya na ha nwere ka ọ zara ha sị " Atụlịgọ m ebubo ndị a niile ma obi siri m ike na Cummings mere ihe niile n'usoro ma kpaa ezi agwa maka nchekwa coronavirus"

    Boris Johnson
  6. A na-eke onye enyemaka Boris Johnson nnukwu ọkpọ ugbua ka o rituo n’okwa

    Dominic Cummings

    Onye ụlọomeiwu “conservative” nke mba UK akpọọla oku ka onye enyemaka Boris Johnson rituo n’ọkwa ya.

    Steve Baker kwuru ka David Cummings rituo makana ọ gara njem mgbe mba ahụ a machịrị ngagharị maka covid 19 na Uk.

    Ka Baker kwuchara nke a n’ihe ngosi BBC, ndị otu ya dịka Simon Hoare nakwa Damian Collins tinyere ọnụ kwuo ka Cummings kwakọrọ lawa makana ọ chịpụtala ụkwụ gọọmenti mba Uk n’ezi.

    Gịnị ka Cummings kwuru maka ya bụ atụmmatụ?

    O kwuru na onweghị ihe ọjọ o mere nke o ji enwe iwu ọ dara.

    Gọọmenti mba Uk e kwuru gịnị?

    Ha kwuru na Cumming gara ebe dị nso na bee ha dopu onwe ha makana ya na nwunye ya chọrọ idowe nwa ha ebe ọ ga-anata nchekwa zuru oke.

  7. Gọvanọ Enugu steeti achụghachila ụgbọala ruru 100 na-achọ ibata steeti ya

    Ugwuanyi

    Aka na-achị Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi chụghachiri ụgboala ruru otu narị ka ọ gachara n'oke Enugu na Ebonyi i ji aka ya mara ma a na-ebi iwu machiri onye ọbụla ịbata steeti ọbụla ugbua maka igbochi mfesa coronavirus.

    Onye ndụmọdụ na mgbaza ozi gọvanọ Ugwuanyi bụ Louis Amoke depụtara na Ugwuanyi ji ụkwụ ya gakwụrụ ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọala ahụ ruru otu narị na iri ise , ma jụọ ha, ihe mere ha ji na-abata Enugu steeti n'oge a agbanyeghị iwu mmachị etinyere maka steeti na steeti.

    Ka gọvanọ Ugwuanyi chọpụtara ụgbọala ahụ nwere ndị na-ebughị ihe ndi dị mkpa, o chụghachiri ha azụ.

    Cheta na gọọmenti etiti ka machịrị mbata na ọpụpụ si na otu steeti fere ọzọ.

    Ugwuanyi
  8. Ndị ọgba bọolụ abụọ ebutela ọrịa Coronavirus

    Mmadụ abụọ si n’otu Premier Lig abụọ akpọpụtabeghi aha ha ebutela ọrịa Coronavirus.

    Nke a pụtara ihe dịka emechara nyocha n’ụbọchị Tusde, Tọzde nakwa Fraide n’izuụka gara aga.

    Enyocha ihe ruru mmadụ narị itoolu na iri itoolu na isii bụ ma ndị ọgba bọọlụ ma ndị ọrụ ndị ọzọ n'otu ahụ.

    Cheta na ọtụtụ otu bidoro ọzụzụ ha dịka a na-akwado ịmalite Premier Lig ọzọ.

  9. Akụkọ ụwa nke ụtụtụ taa

    Video content

    Video caption: Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla
  10. Mmadụ 265 ọzọ ebutela ọrịa Coronavirus na Naịjirịa

    N'ọnụọgụgụ nke ngalaba NCDC wepụtara, mmadụ 265 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

    Steeti ebe a kachasị chọpụta ndị mmadụ bụ na Legọs ebe a chọtara mmadụ 133 ọhụrụ bu ya.

    O gosikwara na achọtara mmadụ abụọ ọhụrụ na Enugwu nakwa Anambra bụ steeti ndị ọwụwa anyanwụ.

    View more on twitter
  11. Nnọọ nụ na peeji anyị taa

    O ruela ụbọchị ụzọ anyị ga-ewetara unu akụkọ dị mkpa metụtara coronavirus.

    Ọkwa unu ka na-akwọ aka echekwa onwe unu?

    Ngwa ka anyị bido!

  12. Ogbu opi na-ezi imi, ndị be anyị ka chi bọọ nụ

    Rahụnụ nke ọma

    Onye na-afụ ọja
  13. Gọọmentị Legọs ga-ebido itule iji ọgwụ ịba bụ Chloroquine agwọ coronavirus

    Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na Legọs steeti bụ Akin Abayomi ekwuola na gọọmentị ga-ebido itule iji ọgwụ ịba bụ Chloroquine maọbụ ọgwụ nọ ọnọdọ ka ya agwọ ọrịa coronavirus.

    Ha kwuru na ha ga-ebido iji ndị ọrụ ahụike na ndị ha na onye nwere coronavirus nwere mmekọ eme nyocha a.

    Ha kwukwara na ngalaba ahụike mba ụwa bụ WHO ga-eso ha n'agba nke abụọ maka nyocha a.

    Abayomi kwukwara na ha na atulekwa ma a ga-ebido idopụ ndị mmadụ iche n'ụlọ ha dịka ụfọdụ ndị bu ọrịa Covid-19 anaghị ekwe anọ n'ụlọ ọgwụ.

    Onye ọrụ ahụike na onye a na-eme nyocha
  14. Gere akụkọ ụwa nke mgbede taa n'ime otu nkeji

    Video content

    This content only works in the UK.

  15. Na Akpọtụ Ugbu AMmadụ 215 esi UK kpọlata apụtala na 'quarantine' dịka nyocha gosiri na onweghi onye n'ime ha butere coronavirus

    UK returnees

    Mmadụ 215 ndị Naịjirịa esi mba UK kpọlata apụtala n'ebe edowere ha n'ọnọdụ Bekee kpọrọ "quarantine".

    Otu onye n'ime ndị a aha ya bụ Muyiwa Lucas gwara BBC na nyocha emere ha gosiri na onweghi onye n'ime ha bu ọrịa coronavirus.

    Maazị Lucas gwara BBC na enyeere ha asambodo gosiri na ha ebughi ya bụ ọrịa.

    O kwu kwara na etu gọọmentị sị leta ha anya na-enye ya obi ụtọ.

    Lucas kwuru sị " Ebe gọọmentị dopụrụ anyị iche bụ n'ụlọ ndịna, ma ha lekọtara anyị anya nke ọma".

    O kwuru sị na otu ihe ọ ga-amasị ya ka gọọmentị tinye anya bụ etu gọọmentị si hazie njem ha. Ọ mara atụ were sị " Gọọmentị si anyị lawa n'ụtụtụ a dịka achọpụtara na anyị ebughị ọrịa coronavirus kama ha ewepụtaghị usoro maọbụ ụgbọ ga ebu anyị lawa".

    O kwuru sị na ha nwereike ịkwụ ụgwọ njem ha ma sị na gọọmentị kwesiri ị nyere ha aka hazie ya etu ọ ga adịrị ha mfe.

  16. Gịnị na-akpọtụ n'ehihie a? Lekwa ya ebe a

    Video content

    This content only works in the UK.

  17. Ṅụrịa nụ! coronavirus alaala - Paul Makonda

    Paul Makonda

    Otu onye ndọrndọrọ ọchịchị na mba Tanzania bụ Paul Makonda nọ na nsogbu ugbua dịka ọ gwara ndị mmadụ ha ṅụrịa ma nwee mmemme maka na coronavirus alaala n’agbanyeghi na onweghi ihe akaebe gosiri nke a.

    Akụkọ kwuru na ọ gwakwuru ndị mmadụ ụlọahịa ebe ha ga-aga ịzụta akwa ọhụrụ ha ga-eyi ga mmemme a.

    Mana okwu ya na-enye ọtụtụ ndị ala ahụ echiche n'obi n'ihi na onye ọbụla gara mmemme ahụ agaghị enye onwe ha ohere kwesiri iji gbochi mfesa ọrịa covid-19.

    Cheta na ọ gafeela otu onwa kemgbe gọọmentị mba ahụ wepụtara ndekọ ọbụla gbasara ọrịa ahụ na mba ha.

  18. Gọọmentị n'Abuja sị ka ndị Alakụba kpee ekpere na be ha dịka ha na-eme emume Sala

    FCTA

    Ndị ọrụ gọọmentị n'Abuja arịọla ndị Alakụba na mpaghara ahụ ka ha nọdụ na be ha kpee ekpere dịka ha na-achọ ime emume Sala maka coronavirus.

    N'ozi Anthony Ogunleye bụ aka na-ede akwụkwọ gọọmentị Abuja bụ nke Bekee kpọrọ Federal Capital Territory Administration (FCTA), sị na nke sonyere na atụ Eze Sokoko bụ Muhammad Sa'ad Abubakar III mara sị ka ndị mmadụ nọdụ n'ụlọ ha kpee ekpere.

    Ozi ahụ sịkwa: "Ọ bụ n'usoro ngalaba Onyeisiala hibere maka ibuso coronavirus agha bụ Presidential Task Force sị ka esoro ka anyị na eso, dịka ha sị ka ebe niile a na-aka ụka mechie."

    FCTA sịkwa na ha na ndị na-anọchite anya okpukperechi dị iche iche nwere nzukọ ịhụ na ha mere etu e siri kwuo.

    View more on twitter
  19. Ọgwụ Trump si bụ ejechaa ọgwụ maka ịgwọ coronavirus nwereike gbuo mmadụ - nchoputa

    Hydroxychloroquine

    Ọgwụ Onyeisiala Amerịka bụ Donlad Trump si bụ ejechaa agwụ banyere ịgwọ coronavirus nwereike na-eso egbu ndi o kwesiri ịgwọ.

    Nke a bụ ihe nyocha dị na akwụkwọ ndị ọkammụta ahuike akpọrọ Lancet chọpụtara.

    Nyocha sị na onyeghi uru ọbụla dị na-iji ọgwụ iba akpọrọ Hydroxychloroquine nwaa ịgwọ coronavirus.

    Maazị Trump sị na ya na aṅụ ya bu ọgwụ agbanyeghi na ndị ọkammụta ahụike sị na o nwereike bute obi mgbu.

    Trump ji n'ike na-akwado ọgwụ dịka ihe ga-arụ ọrụ n'ịgwọ coronavirus, n'agbanyeghi ihe ndi ọkammụta na-arụrụ ya ọrụ na-ekwu banyere ya.

    Hydroxychloroquine bụ ọgwụ ịba, na ọrịa a na-akpọ lupus nakwa arthritis mana onweghi nyocha ọbụla kwuru na o bụ ọgwụ ga-ere ma ejiri ya gwụọ coronavirus.

  20. Otu Chelsea ekwela ka N'Golo Kante kwụsị ọzụzụ n'ihi ọrịa Coronavirus

    N'Golo Kante

    Otu bọọlụ Chelsea ekpebiela ịnye ọgba bọọlụ ha bụ N’Golo Kante ikike ịhapụ ọzụzụ nke ha na-eme n’ihi ụjọ coronavirus na-atụ ya.

    Ha kwadoro ịme nke a n’agbanyeghị na Kante nwereike ịhapụ ọzụzụ kpam kpam rue na ngwụcha ọnwa bọọlụ nke a.