Mba Amerịka agbachiela nke ụgboro abụọ n'afọ a

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Nke a bụ ugboro abụọ gọọmenti etiti Amerịka ga-agbachi

Gọọmentị etiti mba Amerịka akwụsịla ọrụ nke ugboro abụọ n'ime afọ a maka ụlọ omeiwu emechaghị ihe ha kwesiri ime.

Ndị Sịnetị na-agba mgba ekwenyeghị nke Rand Paul, onye otu Republican kwuru mana akwụkwọ ahụ gaferela rue ụlọ omeiwu nke ukwu maka nkwado site na ntuliaka

Ụlọọrụ ndị dabere n'elu ego gọọmentị etiti ga-akwụsị ọrụ ma o ruo etiti abali.

Ọ bụrụ n' ụlọ omeiwu nke ukwu mee ntuliaka a ọsịsa, bụgara ya onyeisi ala bụ Trump tupu ụtụtụ eruo na bee ha, enwereike i gbochi mmechi gọọmenti ahụ.

Ka akụkọ na-apụta amabeghị etu mgbachi a ga-esi metụta ụlọọrụ ndị gọọmentị, amabeghị ma ndị mmadụ a ga abịa ọrụ maọbụ nọrọ n'ụlọ.