AWC - Amas e chiela eze ekeremgba ugboro isii

African Wrestling Championship Image copyright Emeka Dannar
Nkenke aha onyonyo Amas a bụrụla ọkamgba mba Africa ụgboro isii

Daniel Amas nke Nigeria agbajiela onye otu ya onye Tunisia aka napụ ya ọlaedo e dowere ha na mgba nke 65kg freestyle ndị dimkpa.

Amas ji ọkpụ asaa asatara abụọ (7-2) merie ọkamgba Haithem Dakhlaoui nke Tunisia n'egwuruegwu mkpụrụ ụbọchị anọ nke ga a gwụ tata (11-02-18).

Amas sị na-ebe obi ya niile nọ ụgbụa bụ ị bụ ọkamgba nke Commonwealth na nke Olympics, ebe ọ bụ na ya emeriela nke mba Africa ugboro isii.

Na-ọnụ okwu ya, " a chọrọ m ị bụ ọkamgba nke olympic; a chọkwara m ị bụ ọkamgba nke Commonwealth. Obi di m ụtọ nke ukwuu".

Kedụ ka ihe sịr kwụr n'mgba ndị ọzọ?

Nwafọ Nigeria ọzọ bụ Ekerekeme Agiomor gosikwara onye otu ya nke South Africa bụ Fredylan Marais ịhe ọkụ ji nti oke eme mgbe o ji ọkpụ iri na otu charaacha were napụ ya ọlaedo e dowere ha na mba Africa n'ọgbọ 75kg.

Nke bụ mbụ Agiomor na-enweta akara ugo a nke mba Africa.

Ọ tere egwu pụrụ iche iji gosi obi aṅuri ya mgbe o meriri nwaamadị ahụ.

N'aka nke ọzọ, Ogbonna Emmanuel kuchara ọsịsọ tụpụ e nye ya meri na mgba nke 70kg nke ya na Amr Reda nke Egypt gbara.

Amr Reda Hussien nke Egypt chere na ya emeriela mgba ahụ mgbe ha nọ na 2-2 tụpụ onye nkuzi Ogbonna e tinyeghị ọnụ n'okwu. Nke mere ogbuoja jiri nye Ogbanna mmere nke abụọ ya na mgba nke mba Africa.

Image copyright Emeka Dennar
Nkenke aha onyonyo Nwantakịri ka Ogbonna jị gbalahụ ada na mgba 70kg ndị dimkpa

Ogbonna na-onwe ya kwetere na ya bụ mgba abughị egwu achị ụtaba na'aka agba.

" A nwara m oke m, e mere m ihe niile m nwere ike ịhụ na m nwetere mmerị nke abụọ na-esepụghị aka, otito diri Chineke. ọ dịghị mfe chacha"

Mgba nke kacha ụtọ n'abalị ụnyahụ bụ nke Melivin Bibo (86kg), nke ji ọkpụ iri asataghị otu (10-0) kụpụ onye otu ya nke South Africa mkpụru ọkwuru na anya were nwetere Nigeria ọlaedo nke anọ (4) n'ọgbọ freestyle ndị dimkpa.

Na-gbanyeghị, onye ji bụ akaraugo mba Africa ugboro atọ nakwa ọkamgba nke Commonwealth bụ Sinivie Boltic enweghị ike i meri onye otu ya nke Egypt bụ Khaled Mohamed Abdala na ọgbọ nke 125kg.

Ndị nwetere ọlaocha bụ Soso Tamarau (97kg), Ebikewenimo Welson (57kg) nakwa Robert Daufa (92kg).

Onye ọhụrụ bụ Victor (61kg) nwetere bronze.

Na-chịkọta okwu

Ọtu ọdị ụgbụa, tata bụ ụbọchị ikpe azu nke egwuruegwu a Nigeria ji ọlaedo anọ (4), ọlaọcha anọ (4) na otu bronze na-emeri mba ndị ọzọ.

South Africa gbara ndị nke abụọ ji ọlaedọ abụo (2), ọlaocha abụọ (2) na otu bronze (1).

Egwuruegwu mgba a ga abia n'isi njedebe taa bụ uka Orie 11/2/18 ma agbache mgbe nke dị agbọghọ Greco-Roman na Port Harcourt.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionịhe ịkwesịri ịma maka mgba nke Africa Wrestling Championship

Isiokwu Ndị Emetụtara