Federer na Dimitrov ga asọmpi na ngwụcha Rotterdam Open

Roger Federer Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Federer na Grigor Dimitrov ga-asọmpị na Sụnde. Ugboro 60 ha sọọrọ mpị, Federer merichara ya

Onye bụ nke bụ na ụwa niile na egwuregwu Tennis bụ Roger Federer ga agba na mmechi asọmpị Tennis nke Rotterdam Open na Sụndị̄ ka oji 6-3, 7-6 (7/3) merie Andreas Seppi nke Italy.

Federer nwetere mmeri nke 14 ya na asọmpị 15 ya na Seppi gbara. Seppi bu onye nkw 81 na ụwa niile ma dikwa afọ 33.

Federer, onye ọchagba a si Swiss, ga ejekwu Grigor Dimitrov na ụbochị Sọnde maka onye kwesiri isoro ya [Dimitrov] sọmpị bụ David Goffin nara maka bọọlu merụru ya ahụ na anya.

Na okwu okwuru ka ọ gbachara, Federer si na agbanyeghị na ya arahụghị ụra ọfụma maka aṅụrị onwere maka ịbụ onye nkw mbu na Tennis nkw ụmụnwoke, na ike gwụu ya maka etu o siri kirie asọmpi nke Olympics na ụtụtụ ahụ, ọ ga adi njikere maka Sụnde.

"A dim mma taa, mana arụ nyịrụmụ obele mgbe anyị na akpịa bọọlụ a, mana ewetere m ike na mgbacha," Fereder kwụrụ.

Agbenyeghi na o meririela Dimitrov mgbe niile ha abụọ gbakọrọ (ha asọola mpị ụgboro iri isii), Federer si na ya anaghị elelị ya anya.

Federer si, "A ma ya ọfụma, ọ mere ọfụma na afọ gara aga, weta mmerị na London, nakwa Cincinnati. O meriri ndị ma afgba tennis ọfụma wee bido afọ na ike."

Isiokwu Ndị Emetụtara