Iceland nwere ike ịmachi ibe ụmụnwoke ugwu

Ibe ugwu ndi Jew Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Iceland ekwuola na ibi ubu na-emebi ihe rutere ụmụaka

Ndị Iceland na-akwado ibụrụ mba mbụ n'Europe ga-amachi ibe ụmụnwoke ugwu.

Ha na-eme nke a, ebe ụfọdụ mmadụ na-akọwa na ibi ugwu bụ ihe ndi Jew na ndị Alakọba jiri mee mkpa, ihe a bụ mgbe mbụ ndị Iceland ga-alụ ọgụ banyere ofufe.

Otu akwụkwọ dị n'ụlọ omeiwu ukwu na Iceland na-ekwu ka enwe iwu ga-eme ka ndị mmadu biri ugwu ga mkpọrọ afọ isii, okachasi ma ọbụrụ na ọbụghị maka ihe metụtara ahụike ka ha ji mee ya.

Ndị na-akatọọ atụmatụ ahụ kwuru n'okwu a nke buterela nsogbu n'etiti ndị isi okpukpere chị dị icheiche na Europe, na-aga n'iru na-akọwa na ọ ga-eme ka ndị Jew na ndị Alakọba taa afụfụ.

Otu n'ime atọ ụmụnwoke n'ụwa niile bịrị ugwu. Ọtụtụ n'ime ndị a mere nke a n'ihi okwukwe.

Ọtụtụ n'ime ndị Jew na Ndị Alakọba na-atụ ụjọ na okwu ibe ugwu nwere ike buru ihe a ga-eji kpụrụ ha n'ọnụ. Ha na-arụtụ aka n'uwe ha na aja eji anụmanụ achụ nwetara ha nsogbụ.

Ndị isi ndị Alakọba na ndị Jew anabataghị atụmatụ a. Ụkọchuchwu Reinhard Marx bụ onyeisi ndị Catholic na Europe kwuru na iwu ahụ a na-akwadọ i webata bụ mwakpo ebe okwukwe dị ịcheịche nọ

Gọọmenti ndị Iceland ekwuola na ibe ugwu ụmụnwoke na-emebi ikike ruru ha dịka ụmụaka, ha tinyere ya n'ọnọdụ ibi ugwu nke ụmụ nwaanyị nke ọtụtụ Europe gbochiri n'iwu ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara