Ndị ụkọchukwu: Billy Graham ruzuru ọrụ ya

Ndị Uka Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ihe gbasara otu ụzọ n'ụzọ iri e butela ezigbo ndọrọndọrọ na nso nso a

Ọ bụ eziokwu na itụ ụtụ otu ụzọ n'ịrị bụ emụme dị na akwụkwọ nsọ mana ụfọdụ ndị mmadụ ka ana sị ya bụ emume abuzịghị ihe ekwesir ị na-eme n'ụwa kita.

Ọtu onye bu yabụ isiokwu n'isi bụ onye mgbasa ozi n'igwe Radio bụ Daddy Freeze.

Freeze na-agwa ndị mmadụ naha enyezila ndị ụkọchukwu otu ụzọ n'ụzọ iri ha kama ha were ya nye ndị nọ na mkpa.

Ka ndọrọndọrọ a ka na-ga n'ihu, ụkọchikwu Latter Rain Assembly bụ Tunde Bakare ekwuola na ọ bụghị iwu ka mmadụ kwụọ otu ụzọ n'ụzọ iri.

Mana onye ụkọchukwu Anglịkan bụ Venerable Okey Ifionu si na ya bụ ndọrọndọrọ a nweghị isi n'ihi na ọdighị ihe ọ bụla mmadụ nyere Chukwu bụ n'efu.

Lee ihe ise okwuru maka isiokwu a:

  • Otu ụzọ n'ụzọ iri bụ Chukwu ka a na-enye ya
  • Akụ na ụba niile mmadụ nwere si n'aka Chukwu
  • A na-eweta ya bụ oke na ụlọụka maka ọtụtụ mkpa ndị na-enweghị ka ọ ra ha
  • Ya bụ emume dị n'akwụkwọ nsọ(Leviticus 27:30)

Onyeisi Ụka ọgbara ọhụrụ akpọrọ Bishop Humphrey Erumaka kwụkwara na ọ bụ onye hụrụ Christ n'anya ga-enyenwụ ya otu ụzọ n'iri.

Ọ sị n'agba ochie na ọ bụ iwu ma n'agba ọfụọ ọ bụ site n'ịhụnanya mmadụ nwere n'ebe Christ nọ.

Ked ihe ha ji echeta Billy Graham?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Billy gbasara ozi n'akụkụ iche iche n'ụwa

Venerable Okey Ifionu bụ ụkọchukwu na Anglịkan kwuru na Billy Graham bụ onye otu nke Christ eji amaatụ maka na ọ tọghatara mmadụ nde nde nye Christ.

O kwuru na mkpuru Graham kuru ga-adịgide rue mgbe ebie ebi.

O yọrọ ka ndị nke ṅomie ndụ na agwa Graham.

Bishop Humphrey Erumaka kwuru na ọnwụ Graham e wuteghị ya maka na onweghị ntupọ.

Ọ sịkwa na ọrụzuru ọrụ ya mgbe ọ dị ndụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara