US ga-etinye iwu 'kachasị nke' imegide N Korea

Donald Trump Image copyright Reuters

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na US ga-etinye iwu kachasị nke imegide North Korea.

Iwu a ga-emetụta ihe karịrị ụgbọmmiri 50 na ụlọọrụ na-ahụ maka njem oke osimiri.

"Taa, a na m ekwuputa na anyị na-amalite iwu kachasị nke iji megide ọchịchị North Korea," ka Trump kwuru n'ime okwu ndepụta e wepụtara n'ọdịnihu.

North Korea nọ n'okpuru iwu mmegide si n'aka ndị mbaụwa na mba Amerịka, maka ihe gbasara usoro ngwaagha nuklia na nwale ogbunigwe mizaịl.

Trump kwuru: "Ngalaba na-ahụ maka ego ga-ebido ilebanye anya n'ịkwụsị isiego na mmanụ nke ndị ọchịchị na-eji akwado usoro ngwaagha nuklia ha na nkwado ndị agha ha maka ịmetụta ụgbọ 56, ụlọọrụ mbupu na ọrụ achụmnta ego nke na-enyere North Korea aka ịgbanahụ iwu ntaramahụhụ."

Ndị ngalaba na-ahụ maka ego depụtara otu onye n'ụlọọrụ 27, tụmadụ ụlọọrụ na-ahụ maka njem oke osimiri ndị dị na North Korea na China, nakwa Taiwan.

Ụgbọmmiri 16, ọkachasị ụlọọrụ na-ahụ maka njem oke osimiri nọ na North Korea, mana ise ka e debanyere aha na Hong Kong, abụọ na China, abụọ na Taiwan, otu na Panama na otu na Singapore.

US na-ewube ntaramahụhụ megide ọchịchị a kamgbe 2008 ma na mgbochi ọhụrụ nwere ike ịbịa n'elu nke a mara ọkwa ya n'ọnwa Nọvemba garaaga - gbasara usoro mbupu North Korea, nakwa ụlọọrụ ndị China na-eso Pyongyang azụ ahịa.

Isiokwu Ndị Emetụtara