China chọrọ idegharị iwu ga-eme ka onyeisiala chitee aka

Onyeisiala Xi Jinping Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Kamgbe 1990 ka China tinyere iwu ịkwụsị onyeisiala ịchị ọchịchị gafere afọ ise ugboro abụọ

Otu Communist bụ pati ọchịchị na mba China chọrọ igbanwe iwu obodo ga-eme ka onyeisiala ha bụ Xi Jinping, nwee ike chịkarịa afọ abụọ.

Nke a pụtara na Jinping ga-anọ n'ọkwa ọchịchị karịa afọ 2023 bụ oge ọ kwesịrị iritu.

Iwu mba China bụ na onyeisiala agaghị anọfe afọ ise, ugboro abụọ.

Jinping dị afọ 64, bụ nwa otu n'ime ndị bidoro otu Communist pati a. O ji nwayọ nawyọ n'arigo tupu ọ bụrụ onyeisiala n'afọ 2013.

Kamgbe ahụ, akụnaụba China na-eto ebe mpụ na nrụrụaka na-ada, mana ihe ha anaghị emeta ọfụma bụ ikwado ugwu ruru onye.

Dị ka ndị ntaakụkọ Xinhua kwuru, ndị otu pati ahụ kwuputara na chọrọ ịwepụ iwu kwuru sị "onyeisiala na osote onyeisiala nke ndị China agaghị achị ihe karịrị ugboro abụọ sotere ibe ya"

China ọ na-ejije Afrịka?

Ọ bụrụ na Jinping nweta ihe ọ chọrọ, ọ ga-adị ka ụfọdụ mba dị n'Afrịka ebe ndị isiala ha notegoro aka n'ọchịchị.

N'afọ 2017, ndị Uganda boro onyeisiala ha bụ Yoweri Museveni ebubo na ọ nyere ndị omeiwu aka azụ iji kwudosie ike ka a gbanwee iwu ga-eme ka ebulie afọ ole onyeisila kwesịrị ịdị ma ọ nọrọ n'ọchịchị.

N'aka ọzọ, onyeisiala ndị Rwanda bụ Paul Kagame, zọrọ ọkwa ọchịchị nke atọ ya n'afọ 2017, ka ndị omeiwu gbanwechara iwu ka ọ nabata ịzọ ọchịchị ya.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a