Otu ụka Kraist: Israel na-emegide ụka Kraist

Holy Sepulchre in Jerusalem Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo E mechiela ụlọụka Holy Sepulchre dị na Jerusalem

Ndị ndu otu ụka Kraist gunyere; ndị ụka Katolik, Greek na nke Armenian kwekọtara imechị ụlọụka ahụ a kpọrọ, 'Church of the Holy Sepulchre' nke bụ ebe a kpodoro Jesụ Cristi n'obe n'ihi ihe ha kpọrọ, agha megide otu ụka Kraist.

Nke a mere ka ndị ọchịchị wepụtara iwu ọhụrụ nke kwuru na ụlọụka ga na-atụ ụtụ isi maka ewumewe ha nwere ya na iwu nke a na akwado ime n'ụlọ omeiwu nke ga-eme ka o sie ike ile ewumewu ndị ụka.

Dịka ụlọ ntaakụkọ Telegragh nke UK siri kwuo, na akwụkwọ ozi ndị ndu ụka Kraist atọ kachasị na Jerusalem wepụtara, ha kwuru na ụtụisi ọhụrụ ahụ bụ 'atụmatụ ọjọọ' megide ụka Kraist.

"Agwa ndị a megidere nkwekọrịta na iwu mba ụwa dịka o siri mmetụta ikike na elele dịrị ndị ụka Kraist nọ Ala nsọ Jerusalem na ndị ọchịchị obodo."

"Iji gosi iwe anyị, anyị ekpebiela imechi ụlọụka, 'Church of the Holy Sepulchre'.

"Ndị isi ụka nile nọ na Ala-Nso kwekọrịtara ma kwụsieike na ichekwa ikike dịrị anyị na ihe anyị nwere."

Onweghị ọsisa ndị ọchịchị nyere.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe karịrị ọkara nde mmadụ ( 500,000) bu ndị njem ndị otu Kraist na-aga Israel kwa afọ, ebe njem mkpagharị so otu ihe na-enye mba Israel ego ikwalite akụ na ụba.

Nke a bụ nke mbụ a na-emechi ụlọ ụka kemgbe 1990 oge emechiri ya iji gosi iwe megide ndị ndị Israel iwere ọnọdụ n'ụlọụka.

Onweghị onye ma mbge a ga emeghe ya bụ ụlọụka dịgoro otu puku afọ ọzọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara