Etu ị ga-esi egbochi ọkụ si n'ekwentị gị ịmerụ gị ahụ

Nwata nwaanyị Eshịa na-eleanya n'ihuenyo ekwentị Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ụlọọrụ China na-emepụta ekwentị ọkụ si na ya dị nke ukwuu

Ọtụtụ mmadụ na-emefu oge karịrị akarị n'elu ekwentị ha, mana nanị ole na ole ghọtara etu ha si arụ maọbụ ọdị mkpamkpa o nwere ike ịkpa n'ahụ ha.

Rute ugbua, ọ kpalitela ọtụtụ ajụjụ karịa ọsịsa. Mana ọkụ si n'ekwentị onwere ike itinye ahụike gị n'ọnọdụ gbagharịwa?

Ịpị ya oge ọbụla onwere ike ibutere gị ọkpụ? Onwere ihe ị nwere ike ime iji gbochie ikpughe onwe gị?

Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị ọka mmụta sayensị na-agbalị ịchọpụta ọsịsa ajụjụ ndịa, mana onwebeghị ihe doro anya ha bipụtarala.

Ihe anyị ma n'agbayeghị, bụ na ịkparịtaụka n'ekwentị na-ebute ihe bekee kpọrọ 'radiofrequency waves', nke bụ ọdịrị ihe ha kpọkwara "non-ionising radiation".

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ọkụ ekwentị a esighị ike ka "ionising radiation" a - nke bụ 'X ray', "ultraviolet" na "gamma radiation", nke nwere ike ịmerụ anyị ahụ na mkpụrụndụ site n'ịgbanwe DNA anyị - mana amatabeghị mkpamkpa ọ na-akpa n'ahụ mmadụ.

Enwere ọmụmaatụ ọtụtụ rediofrịkwensi gbara anyị gburugburu, ndị nke bekee kpọrọ "FM radio waves", "microwaves", okpomọkụ na ihe.

"Non-ionizing radiation" ahụ enweghị ọdịrị ikike iji ebute kansa site n'imebi DNA n'ime mkpụrụndụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Amatabeghị ihe izendụ na-esite n'ịpị ekwentị

Dịka webụsaịtị ndị American Cancer Society (ACS) si kwuo, enweghị ezigbo ihe kwesịrị ichegbu gị gbasara ma ekwentị "onwere ike ime ka ọkpụ nke ụbụrụ maọbụ ndị ọzọ dị n'isi na olu bawanye".

N'agbanyeghị na ikike si n'ekwentị apụta dị ntakịrị, ozughị ibulite okpomọkụ na ịjụ oyi nke dị n'ahụ, ndị ACS kwuru n'ododoghị anya ma ọ na-emerụ mmadụ ahụ ma dọkwaa aka na ntị sị kpachara anya ma wetuo aka etu i ga-esi ekpughe onwe gị maka ọkụ ekwentị.

Ekwentị kacha emepụta rediashọn na nke pekarịchara

Iji chọpụta ihe izendụ na-eme n'ahụike mmadụ, ndị ọkammụta sayensị bidoro ihe a na-akpọ bụ "Specific Absorption Rate" bụ SAR n'aha ịchafụ.

Nke a bụ ihe akpọrọ rediofrịkwensi nke nwere ike ịba mmadụ n'ime site n'ịpị ekwentị.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gbaa mbọ hụ na ịmetụghị poolu eji enweta ozi nke ekwentị gị

Ọkwa SAR dị n'ekwentị dị icheiche, maka na ndị na-emepụta ya kwesịrị ịkpọpụta ọkwa SAR dị na ngwaahịa ha.

Ozi ndị ahụ dị n'elu ịntanetị maọbụ n'elu akwụkwọ ntuziaka ekwentị ahụ, mana ọbụghị onye ọbụla na-achọ ya.

Ndị ụlọọrụ Federal Office for Radiation Protection dị na Germany mere nchọpụta nke gosiri na ekwentị ndị China dịka OnePlus, Huawei ya na Lumia 630 nke Nokia, so na ndị nke kacha emepụta rediashọn.

Etu esi egbochi ikpughe onwe gị n'ọkụ ekwentị a

Rediofrịkwensi kachasị ike na poolu eji enweta ozi, nke a na-etinye n'ime ekwentị ugbua.

Ụfọdụ ndị na-etinye ekwentị ha n'akụkụ isi ma ha chọọ ịza ya, mana poolu eji enweta ozi dị nso isi ekwentị, dịka ACS kwuru.

Lee ụzọ ndị ị ga-esi akwụsị rediashọn:

  • Wetuo oge ị na-egbu n'elu ịpị ekwentị.
  • Tinye ekwentị gị ka ọ n'ekwuputa maọbụ tinye ihe a na-akwụ na ntị ga-eme ka ịhapụ iwete ekwentị gị nso isi gị.
  • Oge ọbụla okwere gị ime, akwụla nso ebe poolu ekwentị nke bekee kpọrọ mast dị, maka n'ekwentị gị na-ahazi ike ya iji ruo netwọkụ dị mma.
  • Zụta ekwentị nwere ọbere SAR.

Isiokwu Ndị Emetụtara