Italy: Iwobi akọwala ihe o jiri nọrọ otu pati ya

Toni Iwobi Image copyright IwobiFacebook
Nkenke aha onyonyo Ịwọbi dị afọ 62 mana ọ gara mba Itali dịka nwaakwụkwọ

Sinetọ onye isi ojii mbụ a họpụtara na mba Itali bụ Toni Iwobi azarala ọnụ ya n'ihe kpatara o ji nọrọ n'otu pati ndị na-achụ ndị mbịambịa.

Ya bụ Iwobi bụ onye mbịambịa n'ala Itali si Naịjirịa mana oge ọ na-azọ ọkwa ọ nọ ugbua, akaraokwu ya bụ "Kwụsị mwakpo" nke na-atụ ndị mbịambịa aka.

Iwobi kwuru na agaghị emepe ụzọ nye mmadụ niile, na e kwesiri ịkwanyere oke ala ugwu.

N'okwu ya: "Esi m Naịjirịa, ama m etu ihe dị, pasentị iri ndị pụrụ ịga mba Itali na-agba ọsọ agha, ndị ọzọ abụghị ya."

Nhọpụta ya kpalitere ọtụtụ ajụjụ n'ọnụ ndị mmadụ etu onye mbịambịa ga-esi nọrọ n'otu pati na-achụ ndị mbịambịa.

Nke a bụ ka onye ọgba bọọlụ na mba Itali bụ Balotelli gara n'igwe okwu ọgbara ọhụrụ instagram ya chetara Iwobi na-agbanyeghi na-ahọpụtara ya, na ọ ka bụ onye isiojii.

Balotelli kwuru na ọ bụ ihe ihere ka ọ bụ.

Mana Iwobi site namkparịtaụka ya na ndị mgbasaozi dị n'Italy nwere, ọ zaraọnụ ya kwuo na ọ bụ iji kwanyere iwu oke ala ugwu ka o ji nọrọ na pati ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a