Trump na Kim a ga-ekwe n'aka nke udo?

Trump,Kim Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Nkwekọrịta ọhụrụ Trump na Kim ọ bụ enyi oke na nwamba?

Onyeisiala US bụ Donald Trump ekwetala na ya ga-aza Kim Jung-un nke North Korea oku maka ịkpe udo n'ime obodo abụọ ahụ.

Onweghị onye tụwara anya na mmadụ abụọ a nwere ike ịkpọ ma ọ bụ za oku onwe ha ma e lewe ka ha bụ nkapi siri pia ọnụ.

Ọ bụ otu onye ọnụ na-eru n'okwu gọọmentị ndị North Korea wegara Onyeisiala Trump akwụkwọ ozi a na Washington.

Dịka ozi ahụ siri kwuo, ọ sịrị na Kim Jung-un ekwetela na ya ga akwụsị ọsọ ahụ o ji agbakwuru ọgụ site na-ịlele ma ọ bụ rụọ ogbunigwe nke nuklia. Kim sịrị na ya "enweghị ike ịla azụ na ya bụ nkwa".

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Nke a bụ okwu gbara ọkpụrụkpụ maka ị chọ udo sirila n'ọnụ mmadụ abuo a puta kemgbe ha malitere ịma onwe ha aka na-ihu.

Na-aka ọzọ, ụfọdụ na-eche na ọ nweghị ihe ga apụta na nzụkọ a ahụ maka na ụdị nnkata a kwesisiri ị nwe ụbụbọ akọ na uche miriemi maka ị hazị ya. Ndị otu a kwetere na ya bụ ọrịa abụghị ụkwara akwụ na-egbo.

Trump na-onwe ya kwuru na ya bụ okụ akpọrọ ya "gosiri a gam n'ihu" mana sikwe ọnwụ na ya agaghị eweli mmapụ ahu mapụrụ obodo ahụ ruo mgbe ahuru isi ya bụ okwu.