China: E meela Xi Jinping onyeisiala ruo n'ọnwụ

Onyeisiala China Xi Jinping Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo China Xi Jinping nwere okike ka Chairman Mao

China emegharịala iwu ha iji nye onyeisiala ha bụ Xi Jinping ohere ka ọ nọdụ n'ọkwa dịka onyesiala ruo mgbe ọ nwụrụ.

Ndị na-anọ ka ndị ome iwu ukwu na China bụ ndị akpọrọ "National People's Congress" n'asụsụ Bekee megharịri iwu ha na nzụko ha mere.

Ndị "National People's Congress" na eme nzụkọ otu ugboro n'afọ.

Mmadụ atọ n'ime mmadụ 2,964 bụ ndị National People's Congress ebinyeghi aka n'akwụkwọ eji gbanwe iwu a, mana mmadụ abụọ binyere aka ekweghịekwe.

Kemgbe 1990, iwu China kwuru na ọ bụ naanị ugbo abụọ ka onyeisiala China ga-anọ n'ọkwa.

Mana maazi Xi, bụ onye kwesiburu ịrịtụ n'afọ 2023, akpọpụtala onye ga-anọchị ya mgbe pati na-achị China nwere nnọkọ n'ọktoba 2017.

Kama, o haziri ọnọdụ ya ka pati ya weliri ọkwa ya ka ọdịrị ka nke onye muụara pati ha bụ Chairman Mao.

N'akwụkwọ, ndị kongress a bụ ndị kachasị nwe ikike na China mana a na-eche na ọ ga eme ihe a si ya mee.

Xi ọ ga-achị ebighebi?

Nkọwa Stephen McDonell, onye ntaakụkọ BBC na China nọ na Beijing

O siri ike ịhụ Xi Jinping ị nọ ka onye a na-atụ aka n'anya chacha.

O wetere ikike udiri nke ahụgbeghị kemgbe oge Chairman Mao Zedong.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Mr Xi kuru aka mgbe emeghariri iwu a

Naanị afo ise gara aga oge Hu Jintao, ndị otu a na-akpọ "Politburo Standing COmmitte" na-achịkọ Beijing, ị ga-anụ ka a na-arụ maka ndị mmadụ nwere oghere ikwu uche ha.

A na-eche na Maazị Hu chọrọ inye ndị ndọrọndọrọ na pati ya aṅụrị ka osikwa di kwa afọ iri ọbụla, onye onyeisiala ozọ ga-akpọrọ ndi nke ya bịa were ọchịchị n'udo.

Mana site taa, ihe a niile alaala.

Iwu a emegharịrị ga enye Xi Jinping ohere inọdu ka onyeisiala karịa ugboro abụọ okwesiri ịnọ, maka ha agaghị enye onwe ha udi nsogbu a ma ya bụrụ na obughị ihe ọ choro ime.

A kpaghị nkata onye kwuo ụche ya tupu eme mgbanwe iwu a.

Nwayo nwayọ, Xi Jinping agbanwela etu esi achi mba ya, wee tinye onwe ya na etiti ihe niile.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a